Matiu 18:33 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 33 Ọ̀ bụ na gịnwa ekwesịghị imere ohu ibe gị ebere, otú ahụ m meere gị?’+ Jọn 15:12 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 12 Ihe m nyere unu n’iwu bụ ka unu hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya.+ Ndị Rom 13:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla, ma e wepụ ịhụ ibe unu n’anya;+ n’ihi na onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya emezuola ihe iwu kwuru.+ 1 Jọn 3:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Anyị si otú a mata ihe bụ́ ịhụnanya, n’ihi na onye ahụ nyere ndụ* ya n’ihi anyị,+ anyị kwesịkwara inye ndụ* anyị n’ihi ụmụnna anyị.+
8 Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla, ma e wepụ ịhụ ibe unu n’anya;+ n’ihi na onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya emezuola ihe iwu kwuru.+
16 Anyị si otú a mata ihe bụ́ ịhụnanya, n’ihi na onye ahụ nyere ndụ* ya n’ihi anyị,+ anyị kwesịkwara inye ndụ* anyị n’ihi ụmụnna anyị.+