-
1 Ndị Kọrịnt 7:31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 Ka ndị na-erite uru n’ụwa a dịrịkwa ka ndị na-anaghị eritecha uru niile dị na ya, n’ihi na ihe ndị na-eme n’ụwa a na-agbanwe agbanwe.
-
-
Taịtọs 2:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 N’ihi na e meela ka amara Chineke pụta ìhè, nke na-eme ka a zọpụta ụdị mmadụ niile.+ 12 Amara a na-akụziri anyị ka anyị ghara ịna-akpa àgwà na-adịghị Chineke mma, gharakwa ikwe ka ihe ọjọọ ndị dị n’ụwa na-agụ anyị agụụ.+ Ọ na-akụzikwara anyị ka anyị na-ebi ndụ otú gosiri na anyị na-ele ihe anya otú dị mma, na-eme ezi omume ma na-efe Chineke otú ọ chọrọ n’oge a.*+
-