3 Unu ekwela ka onye ọ bụla duhie* unu n’ihi na tupu ụbọchị ahụ abịa, a ga-enwe ndị ga-akwụsị ife Chineke fewe chi ọzọ,+ e kpugheekwa onye mmebi iwu ahụ,+ bụ́ nwa mbibi.+
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’Izrel otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ga-abụkwa ndị nkụzi ụgha.+ Ha ga-eji nwayọọ malite òtù dị iche iche ga-eme ka unu kwụsị inwe okwukwe. Ha ga-agọnahụkwa onye gbapụtara ha.*+ A ga-ebibikwa ha ngwa ngwa n’ihi ihe a ha ga-eme.