30 Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị bụ aha gị?” Ya asị: “Ìgwè,” n’ihi na ọtụtụ mmụọ ọjọọ abanyela n’ime ya. 31 Ha nọkwa na-arịọsi ya ike ka ọ ghara ịgwa ha ka ha baa n’abis.*+
4 N’eziokwu, Chineke tara ndị mmụọ ozi mehierenụ ahụhụ,+ tụba ha n’ime Tatarọs,*+ keekwa ha agbụ* ka ha nọrọ n’ebe gbara oké ọchịchịrị ruo mgbe ọ ga-eme ha ihe o kpebiri ime ha.+
20Ahụkwara m otu mmụọ ozi ka o si n’eluigwe na-agbadata. O ji mkpịsị ugodi nke abis*+ na nnukwu agbụ ígwè n’aka. 2 O jidekwara dragọn ahụ,+ bụ́ agwọ mbụ ahụ,+ onye a na-akpọ Ekwensu+ na Setan,+ kee ya agbụ otu puku (1,000) afọ.