2 Ndị seraf guzo gburugburu ya. Seraf nke ọ bụla nwere nku isii. Nke ọ bụla na-eji nku abụọ ekpuchi ihu ya, na-eji abụọ ekpuchi ụkwụ ya, na-ejikwa abụọ efegharị.
3 Ha jikwa olu dara ụda na-agwa ibe ha, sị:
“Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị.+
Ụwa niile na-egosi ebube ya.”