-
Aịzaya 17:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Geenụ ntị! Ọtụtụ ndị na-agba aghara.
Ha na-agba aghara ka ebe oké osimiri na-amali elu.
Mba dị iche iche na-emekwa mkpọtụ.
Ha na-eme mkpọtụ ka ebili mmiri.
13 Mba dị iche iche ga-eme mkpọtụ ka ebili mmiri.
Chineke ga-abara ha mba, ha agbaga ebe dị anya.
A ga-achụkwa ha ọsọ otú ifufe si ebupụ mkpo ọka dị n’ugwu
Nakwa otú oké ifufe si eme ka ahịhịa ogwu na-agba gburugburu.
-
-
Aịzaya 57:20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 “Ma ndị ajọ omume yiri oké osimiri nke na-amali elu, nke na-enweghị ike ịdajụ,
Nke mmiri ya na-abọlitekwa apịtị na ahịhịa ndị dị na ya.
-