63 Ị gụpụtachaara ha ihe dị n’akwụkwọ a, kegide ya na nkume, tụbakwa ya n’etiti Osimiri Yufretis. 64 Kwuzie, sị, ‘Otú a ka Babịlọn ga-esi mie ala. Ọ gaghịkwa apụta ọzọ+ n’ihi ọdachi Chineke ga-eme ka ọ dakwasị ya. Ike ga-agwụkwa ndị bi na ya.’”+
Ebe a ka ihe Jeremaya kwuru gwụrụ.