-
1 Pita 1:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Ndị amụma, ndị buru amụma banyere amara Chineke meere unu, jụsiri ajụjụ ike gbasara nzọpụta a, chọsiekwa ike ịmata gbasara ya.+ 11 Chineke ji mmụọ nsọ gwa ha na Kraịst ga-ata ahụhụ+ nakwa na ọ ga-emecha dịrị ebube. Ọ bụ ya mere ha ji na-agba mbọ ka ha chọpụta ihe ga-eme Kraịst na mgbe ihe ahụ ga-eme ya.+
-