26 Onye meriri n’agha, debekwa iwu m ruo ọgwụgwụ, m ga-enye ya ikike ịchị mba niile.+ 27 Ikike m ga-enye ya bụ ụdị ikike Nna m nyere m. Ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè+ taa ndị mmadụ ahụhụ. Ọ ga-ebibi ha, ha adịrị ka arịa e ji ụrọ kpụọ, nke a kụriri akụri.