6 Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ya.+7 Ọ ga-enye ndị tachiri obi na-arụ ọrụ dị mma ndụ ebighị ebi, ya bụ, ndị na-achọ ebube na nsọpụrụ na ahụ́ na-agaghị ere ure.+
10 Ụjọ atụla unu maka ahụhụ unu na-aga ịta.+ Ekwensu ga na-eme ka a tụọ ụfọdụ n’ime unu mkpọrọ ka o wee nwaa unu ruo n’isi, kpagbuokwa unu ruo ụbọchị iri. Kwụsienụ ike n’ebe m nọ ruo mgbe unu nwụrụ, m ga-enyekwa unu okpueze bụ́ ndụ.+