8 Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ dịbu adị, ma ọ dịghịzi, ma ọ ga-esikwa n’abis gbagote,+ a ga-ebibikwa ya. Mgbe ndị bi n’ụwa, ndị a na-edeghị aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ,+ malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa, ga-ahụ otú anụ ọhịa ahụ si bụrụ nke dịbu adị, ma ọ dịghịzi, ma bụrụ nke ga-adị, ọ ga-eju ha anya.