Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ
3 Solomọn mechara bido ịrụ ụlọ Jehova+ na Jeruselem n’Ugwu Moraya.+ N’ebe ahụ ka Jehova pụtara n’ihu Devid nna ya.+ Devid nọkwa ebe ahụ, n’ebe Ọnan+ onye Jebus na-azọcha ọka, kwadebe maka ụlọ nsọ a ga-arụ. 2 Solomọn bidoro ịrụ ya n’abalị abụọ n’ọnwa nke abụọ, n’afọ nke anọ n’ọchịchị ya. 3 E jiri ihe e jibu atụ̀ ihe tụọ ntọala ụlọ ezi Chineke Solomọn tọrọ, ọ dị kubit* iri isii n’ogologo, dịrịkwa kubit iri abụọ n’obosara.+ 4 Ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị kubit iri abụọ n’obosara. Ogo ya dị kubit iri abụọ.* Ihe ahụ na ụlọ ahụ hà n’obosara. Solomọn jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa+ machie ime ya. 5 O ji osisi junipa kụchie Ebe Kacha Nsọ, werezie ezigbo ọlaedo+ machie ya. O sekwara ọtụtụ nkwụ+ na ụdọ ígwè+ n’ahụ́ ya iji chọọ ya mma. 6 O jikwa ọmarịcha nkume dị oké ọnụ*+ machie ụlọ ahụ. Ọlaedo+ o jikwa machie ya si Paveim. 7 O jikwa ọlaedo machie+ ụlọ ahụ, ọnụ ụzọ ya, ahụ́ ya, ibo ya, na ogologo osisi ndị e ji kụọ elu ya. Ọ tụkwara ọtụtụ cherob n’ahụ́ ụlọ ahụ.+
8 Ọ rụkwara Ebe Kacha Nsọ.+ Ogologo ya na obosara ụlọ ahụ hà. Ogologo ya dị kubit iri abụọ, obosara ya dịkwa kubit iri abụọ. O jikwa ezigbo ọlaedo+ dị narị talent* isii (600) machie ya. 9 Ọlaedo e ji kpụọ ntu e ji rụọ ọrụ n’ụlọ ahụ dị shekel* iri ise. Solomọn jikwa ọlaedo machie ọnụ ụlọ ndị dị n’elu ya.
10 Ọ kpụkwara cherob abụọ n’Ebe Kacha Nsọ, jirikwa ọlaedo machie ha.+ 11 Nku cherob ndị ahụ+ dị kubit iri abụọ n’ogologo. Otu nku cherob nke mbụ dị kubit ise, na-emetụkwa n’ahụ́ ụlọ ahụ. Nku ya nke ọzọ dịkwa kubit ise, na-emetụ nku cherob nke abụọ. 12 Otu nku cherob nke abụọ dị kubit ise, na-emetụkwa akụkụ nke ọzọ n’ahụ́ ụlọ ahụ. Nku ya nke ọzọ dịkwa kubit ise, na-emetụ nku cherob nke mbụ. 13 Nku cherob ndị a gbasara agbasa. Ha niile dịkwa kubit iri abụọ. Cherob ndị ahụ guzo ọtọ, cheekwa ihu n’Ebe Nsọ.
14 O jikwa ọmarịcha ákwà, eri na-acha anụnụ anụnụ, na nke na-acha uhie uhie,* nakwa nke na-acha pọpụl mee ákwà mgbochi ya.+ Ọ kpanyekwara cherob na ya.+
15 Ọ rụkwara ogidi abụọ+ n’ihu ụlọ ahụ. Ha dị kubit iri atọ na ise n’ogologo. Ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi nke ọ bụla dị kubit ise.+ 16 Ọ rụkwara ụdọ ígwè nke yiri ihe olu ma konye ha n’elu ogidi ndị ahụ. Ọ kpụkwara otu narị (100) ihe yiri mkpụrụ pomigranet ma ganye ha n’ụdọ ígwè ndị ahụ. 17 O gwunyere ogidi ndị ahụ n’ihu ụlọ nsọ ahụ. Otu dị n’aka nri,* nke ọzọ adịrị n’aka ekpe.* Ọ kpọrọ nke dị n’aka nri Jekin,* kpọọ nke dị n’aka ekpe Boaz.*