Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 29
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ndụ Chineke na ndị Izrel gbara na Moab (1-13)

      • A dọrọ ndị Izrel aka ná ntị ka ha ghara inupụ isi (14-29)

        • Ihe ndị e zoro ezo na ndị nke e mere ka a mata (29)

Diuterọnọmi 29:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 24:8

Diuterọnọmi 29:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:4; Jos 24:5

Diuterọnọmi 29:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:34; Neh 9:10

Diuterọnọmi 29:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 11:8

Diuterọnọmi 29:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 1:3; 8:2
  • +Di 8:4; Neh 9:21; Mt 6:31

Diuterọnọmi 29:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 21:26
  • +Ọg 21:33
  • +Ọm 135:10, 11

Diuterọnọmi 29:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:33; Di 3:12, 13

Diuterọnọmi 29:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:6; 8:18; Jos 1:7, 8; 1Ez 2:3; Ọm 103:17, 18; Lu 11:28

Diuterọnọmi 29:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 8:2
  • +Ọp 12:38

Diuterọnọmi 29:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 1:3; 29:1

Diuterọnọmi 29:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:5; Di 7:6; 28:9
  • +Ọp 6:7; 29:45
  • +Je 17:1, 7; 22:16, 17
  • +Je 26:3
  • +Je 28:13

Diuterọnọmi 29:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 2:4

Diuterọnọmi 29:17

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 25:1, 2

Diuterọnọmi 29:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 11:16; Hib 3:12
  • +Hib 12:15

Diuterọnọmi 29:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ka e bibie ma onye na-aṅụju mmiri afọ ma onye akpịrị na-akpọ nkụ.”

Diuterọnọmi 29:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 24:19
  • +Di 27:26; 28:15

Diuterọnọmi 29:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 19:24; Jud 7
  • +Je 10:19; 14:2

Diuterọnọmi 29:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 9:8, 9; 2Ih 7:21, 22; Jer 22:8, 9

Diuterọnọmi 29:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 19:10
  • +Jer 31:32

Diuterọnọmi 29:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 2:12

Diuterọnọmi 29:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:16; Di 27:26

Diuterọnọmi 29:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:45, 63; 1Ez 14:15; 2Ez 17:18; Lu 21:24
  • +Ezr 9:7; Da 9:7

Diuterọnọmi 29:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 11:33
  • +Ọm 78:5; Ek 12:13

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 29:1Ọp 24:8
Diut. 29:2Ọp 19:4; Jos 24:5
Diut. 29:3Di 4:34; Neh 9:10
Diut. 29:4Ro 11:8
Diut. 29:5Di 1:3; 8:2
Diut. 29:5Di 8:4; Neh 9:21; Mt 6:31
Diut. 29:7Ọg 21:26
Diut. 29:7Ọg 21:33
Diut. 29:7Ọm 135:10, 11
Diut. 29:8Ọg 32:33; Di 3:12, 13
Diut. 29:9Di 4:6; 8:18; Jos 1:7, 8; 1Ez 2:3; Ọm 103:17, 18; Lu 11:28
Diut. 29:11Neh 8:2
Diut. 29:11Ọp 12:38
Diut. 29:12Di 1:3; 29:1
Diut. 29:13Ọp 19:5; Di 7:6; 28:9
Diut. 29:13Ọp 6:7; 29:45
Diut. 29:13Je 17:1, 7; 22:16, 17
Diut. 29:13Je 26:3
Diut. 29:13Je 28:13
Diut. 29:16Di 2:4
Diut. 29:17Ọg 25:1, 2
Diut. 29:18Di 11:16; Hib 3:12
Diut. 29:18Hib 12:15
Diut. 29:20Jos 24:19
Diut. 29:20Di 27:26; 28:15
Diut. 29:23Je 19:24; Jud 7
Diut. 29:23Je 10:19; 14:2
Diut. 29:241Ez 9:8, 9; 2Ih 7:21, 22; Jer 22:8, 9
Diut. 29:251Ez 19:10
Diut. 29:25Jer 31:32
Diut. 29:26Ikp 2:12
Diut. 29:27Le 26:16; Di 27:26
Diut. 29:28Di 28:45, 63; 1Ez 14:15; 2Ez 17:18; Lu 21:24
Diut. 29:28Ezr 9:7; Da 9:7
Diut. 29:29Ro 11:33
Diut. 29:29Ọm 78:5; Ek 12:13
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 29:1-29

Diuterọnọmi

29 Ihe ndị a bụ okwu Jehova nyere Mosis n’iwu ka ọ gwa ndị Izrel mgbe ya na ha gbara ndụ na Moab, ma e wepụ ọgbụgba ndụ ya na ha gbara na Horeb.+

2 Mosis wee kpọkọta ndị Izrel niile, sị ha: “Unu ahụla ihe niile Jehova mere Fero n’Ijipt, ya na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ala ya niile n’ihu unu,+ 3 nnukwu ahụhụ a tara ha unu ji anya unu hụ, nnukwu ihe àmà na ọrụ ebube ndị ahụ.+ 4 Ma ruo taa, Jehova enyebeghị unu obi unu ga-eji na-aghọta ihe na anya unu ga-eji na-ahụ ụzọ na ntị unu ga-eji na-anụ ihe.+ 5 ‘N’ime afọ iri anọ m nọ na-edu unu n’ala ịkpa,+ uwe unu yi n’ahụ́ akaghị nká, akpụkpọ ụkwụ unu yi n’ụkwụ akaghịkwa nká.+ 6 Unu erighị achịcha, unu aṅụghịkwa mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya, ka unu wee mara na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’ 7 Unu mechara rute ebe a. Saịhọn eze Heshbọn+ na Ọg eze Beshan+ pụtakwara ka ha lụso anyị agha, ma anyị meriri ha.+ 8 Mgbe e mechara, anyị weghaara ala ha ma nye ya ụmụ Ruben, ụmụ Gad, na ọkara ebo ụmụ Manase ka ọ bụrụ ala ha ketara.+ 9 N’ihi ya, na-emenụ ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ a, na-erubekwanụ isi na ha, ka ihe niile unu na-eme wee gaa nke ọma.+

10 “Taa, unu niile guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, ya bụ, ndị isi ebo unu dị iche iche, ndị okenye unu, ndị isi unu, nwoke ọ bụla n’Izrel, 11 ụmụ unu, ndị nwunye unu,+ ndị mbịarambịa+ bụ́ ndị bi n’ebe unu mara ụlọikwuu, malite n’onye na-akpatara unu nkụ ruo n’onye na-esetara unu mmiri. 12 Unu nọ ebe a ka unu ṅụọ iyi na unu na Jehova bụ́ Chineke unu na-agba ndụ, bụ́ ndụ unu na Jehova bụ́ Chineke unu na-agba taa,+ 13 ka o wee mee ka unu bụrụ ndị ya taa+ nakwa ka ọ bụrụ Chineke unu,+ otú o kwere unu ná nkwa nakwa otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà, bụ́ Ebreham,+ Aịzik,+ na Jekọb,+ n’iyi.

14 “Ọ bụghị naanị mụ na unu na-agba ndụ a ma na-aṅụ iyi a, 15 kama ọ bụ anyị na ndị anyị na ha guzo n’ebe a taa n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị nakwa ndị na-esoghị anyị nọrọ n’ebe a taa. 16 (N’ihi na unu ma nke ọma otú anyị si bie n’Ijipt nakwa otú anyị si si ná mba dị iche iche gafere mgbe anyị na-apụta.+ 17 Unu nọkwa na-ahụ chi ha dị iche iche rụrụ arụ na arụsị ha ndị na-asọ oyi,*+ ndị ha ji osisi na nkume nakwa ọlaọcha na ọlaedo mee.) 18 Kpacharanụ anya taa ka a ghara inwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ezinụlọ ma ọ bụ ebo ọ bụla n’obodo unu nke ga-ekwe ka obi ya si n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ pụọ, ya agaa fee chi dị iche iche mba ndị ahụ na-efe.+ Onye ahụ ga-adị ka mgbọrọgwụ nke na-amịpụta mkpụrụ osisi na-egbu mmadụ nakwa ahịhịa na-elu ilu.+

19 “Ma ọ bụrụ na mmadụ anụ ihe e kwuru n’iyi a a ṅụrụ, ya etuo ọnụ ma kwuo n’obi ya, sị, ‘E nweghị ihe ga-eme m n’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị m n’obi ka m ga na-eme,’ nke ga-eme ka e bibie onye ọ bụla* nọ ya nso, 20 Jehova agaghị agbaghara ya.+ Kama, Jehova ga-ewesa onye ahụ iwe dị ọkụ. A ga-abụkwa ya ọnụ niile e dere n’akwụkwọ a.+ Jehova ga-ehichapụ aha ya n’ụwa.* 21 Jehova ga-esi n’ebo niile e nwere n’Izrel kpọpụta onye ahụ iche ka nsogbu bịara ya, bụ́ nsogbu niile e kwuru okwu ha n’ọgbụgba ndụ ahụ e dere n’akwụkwọ Iwu a.

22 “Mgbe ọgbọ ndị ga-esote unu, ya bụ, ụmụ unu nakwa onye mba ọzọ nke ga-esi n’ala dị anya bịa, ga-ahụ ahụhụ ala ahụ na-ata, nsogbu niile Jehova ga-eweta n’ala ahụ, 23 ya bụ, sọlfọ na nnu na ọkụ, nke ga-eme ka a ghara ịkọ ihe n’ala ahụ niile, ka ihe ghara ipu na ya, ahịhịa ndụ agharakwa ipu na ya, otú ọ dị mgbe e bibiri Sọdọm na Gọmọra,+ Adma na Zeboyim,+ bụ́ obodo ndị Jehova ji iwe na ọnụma ya bibie, 24 ha na mba niile ga-asị, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a ihe a?+ Gịnị kpatara nnukwu iwe a?’ 25 A ga-aza ha, sị, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ ndụ ha na Jehova, bụ́ Chineke ndị nna nna ha, gbara,+ nke ya na ha gbara mgbe ọ kpọpụtara ha n’Ijipt.+ 26 Ha wee gaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala, chi dị iche iche ha na-amaghị, ndị ọ na-achọghịkwa ka ha fee.+ 27 Jehova wee wesa ala a iwe dị ọkụ, mee ka ihe ọjọọ niile e dere n’akwụkwọ a mezuo na ya.+ 28 N’ihi ya, Jehova ji oké iwe na ọnụma chụpụ ha+ n’ala ha ma chụga ha n’ala ọzọ, bụ́ ebe ha nọ taa.’+

29 “Jehova bụ́ Chineke anyị ma ihe niile e zoro ezo.+ Ma ọ na-eme ka anyị na ụmụ niile anyị ga-amụta mara ihe ndị ọ chọrọ ka anyị mara, ka anyị wee na-eme ihe niile e kwuru n’Iwu a.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya