Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 24
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm (1-5)

      • E kwesịrị iji ndụ kpọrọ ihe (6-9)

      • Ichebara ndị ogbenye echiche (10-18)

      • Iwu e nyere gbasara iwere ihe fọrọ n’ubi (19-22)

Diuterọnọmi 24:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 5:31, 32; Mk 10:4, 11
  • +Mal 2:16; Mt 1:19; 19:3-8

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    ‘Onye Na-eso Ụzọ M’, p. 104-105

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    12/2018, p. 11

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    8/2016, p. 10-11

    Jizọs Bụ Ụzọ, p. 222

    Ụlọ Nche,

    9/1/2008, p. 25

    8/15/1993, p. 4-5

Diuterọnọmi 24:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 21:7

Diuterọnọmi 24:3

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ajụ ya.”

Diuterọnọmi 24:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 20:7; Ilu 5:18; Ek 9:9

Diuterọnọmi 24:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ịnapụ mmadụ ndụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 22:26, 27

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/1/2014, p. 7

    9/15/2004, p. 26

Diuterọnọmi 24:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 37:28; 40:15
  • +Ọp 21:16
  • +Di 19:18, 19; 21:20, 21

Diuterọnọmi 24:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Okwu Hibru a sụgharịrị “ekpenta” pụtara ọtụtụ ihe. Ọtụtụ ọrịa na-efe efe nke na-eme mmadụ n’akpụkpọ ahụ́ nwere ike iso na ya. Nje ụfọdụ na-atapara n’ákwà nakwa n’ụlọ nwekwara ike iso na ya.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 13:2, 15; Mk 1:44; Lu 17:14

Diuterọnọmi 24:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 12:10, 15

Diuterọnọmi 24:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 15:7, 8; Ilu 3:27

Diuterọnọmi 24:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Job 24:9, 10

Diuterọnọmi 24:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 22:26, 27

Diuterọnọmi 24:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 25:39, 43; Ilu 14:31

Diuterọnọmi 24:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 19:13; Jer 22:13; Mt 20:8
  • +Ilu 22:22, 23; Jes 5:4

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    1/2018, p. 32

Diuterọnọmi 24:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 25:3, 4
  • +Ezi 18:20

Diuterọnọmi 24:17

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 22:21, 22
  • +Ọp 22:26, 27

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    2/2019, p. 24-25

Diuterọnọmi 24:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 5:15

Diuterọnọmi 24:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

  • *

    Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 19:9; 23:22; Ru 2:16; Ọm 41:1
  • +Di 15:7, 10; Ilu 11:24; 19:17; Lu 6:38; 2Kọ 9:6; 1Jn 3:17

Diuterọnọmi 24:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 19:10; Di 26:13

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 24:1Mt 5:31, 32; Mk 10:4, 11
Diut. 24:1Mal 2:16; Mt 1:19; 19:3-8
Diut. 24:2Le 21:7
Diut. 24:5Di 20:7; Ilu 5:18; Ek 9:9
Diut. 24:6Ọp 22:26, 27
Diut. 24:7Je 37:28; 40:15
Diut. 24:7Ọp 21:16
Diut. 24:7Di 19:18, 19; 21:20, 21
Diut. 24:8Le 13:2, 15; Mk 1:44; Lu 17:14
Diut. 24:9Ọg 12:10, 15
Diut. 24:10Di 15:7, 8; Ilu 3:27
Diut. 24:12Job 24:9, 10
Diut. 24:13Ọp 22:26, 27
Diut. 24:14Le 25:39, 43; Ilu 14:31
Diut. 24:15Le 19:13; Jer 22:13; Mt 20:8
Diut. 24:15Ilu 22:22, 23; Jes 5:4
Diut. 24:162Ih 25:3, 4
Diut. 24:16Ezi 18:20
Diut. 24:17Ọp 22:21, 22
Diut. 24:17Ọp 22:26, 27
Diut. 24:18Di 5:15
Diut. 24:19Le 19:9; 23:22; Ru 2:16; Ọm 41:1
Diut. 24:19Di 15:7, 10; Ilu 11:24; 19:17; Lu 6:38; 2Kọ 9:6; 1Jn 3:17
Diut. 24:20Le 19:10; Di 26:13
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 24:1-22

Diuterọnọmi

24 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ma nwaanyị ahụ amasịghịzi ya maka na ọ chọpụtara na nwaanyị ahụ mere ihe na-eme ihere, nwoke ahụ ga-edere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm,+ were ya nye ya ma chụpụ ya n’ụlọ ya.+ 2 Mgbe o si n’ụlọ nwoke ahụ pụọ, o nwere ike ịga ka nwoke ọzọ lụrụ ya.+ 3 Ọ bụrụ na nwoke nke abụọ a akpọọ ya asị* ma deere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm, were ya nye ya ma chụpụ ya n’ụlọ ya, ma ọ bụ, ọ bụrụ na nwoke nke abụọ a lụrụ ya anwụọ, 4 a gaghị ekwe ka di mbụ ya, bụ́ onye chụpụrụ ya, kpọrọ ya ọzọ ka ọ bụrụ nwunye ya mgbe e merụcharala ya, n’ihi na ọ bụ arụ n’anya Jehova. Unu emela mmehie n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu.

5 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị ọhụrụ, ọ gaghị eso ndị agha gaa agha. A gaghịkwa ekenye ya ọrụ ọ bụla ọzọ. A gaghị ekenye ya ọrụ ọ bụla ruo otu afọ. Ọ ga-anọ n’ụlọ na-eme nwunye ya obi ụtọ.+

6 “E nweghị onye kwesịrị iburu nkume onye o binyere ego ji egwe nri ma ọ bụ aka nkume o ji egwe nri ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego o binyere ya,+ n’ihi na ime otú ahụ dị ka ịnara mmadụ ihe o ji akpa afọ ya* ka ọ bụrụ ihe ibé.

7 “Ọ bụrụ na a hụ na mmadụ tọọrọ nwanne ya bụ́ onye Izrel, taa ya ahụhụ ma ree ya,+ onye ahụ tọọrọ mmadụ ga-anwụ.+ Unu ga-ewepụ ihe ọjọọ n’obodo unu.+

8 “Ọ bụrụ na ọrịa ekpenta* arịawa mmadụ, lezienụ anya ka unu mee ihe niile ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ga-agwa unu.+ Lezienụ anya ka unu mee kpọmkwem ihe m nyere ha n’iwu. 9 Chetanụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu mere Miriam n’ụzọ, mgbe unu si n’Ijipt na-apụta.+

10 “Ọ bụrụ na ị gbazinye onye agbata obi gị ụdị ihe ọ bụla,+ abanyela n’ụlọ ya ka ị nara ya ihe ibé ọ chọrọ inye gị. 11 Ị ga-eguzo n’èzí, onye ahụ ị gbazinyere ihe ewetara gị ihe ibé ọ chọrọ inye gị n’èzí. 12 Ọ bụrụ na onye ahụ bụ ogbenye, ka uwe o nyere gị ka ọ bụrụ ihe ibé ghara ịdị gị n’aka ruo echi ya.+ 13 Hụ na ị chịghachiiri ya uwe ahụ ozugbo anyanwụ dara, bụ́ nke o nyere gị ka ọ bụrụ ihe ibé. Ọ ga-eji uwe ya hie ụra,+ ọ ga-agọzikwa gị. Jehova bụ́ Chineke gị ga-ewere ya na i meela ezi omume.

14 “Erigbula onye ọrụ e goro ego ihe siiri ike, nke dakwara ogbenye, ma ọ̀ bụ nwanne gị ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa nke bi n’ala unu, n’otu n’ime obodo unu.+ 15 I kwesịrị ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya n’ụbọchị ọ rụụrụ gị ọrụ,+ tupu anyanwụ adaa, n’ihi na ọ dara ogbenye, ọ bụkwa ụgwọ ọrụ ya bụ ihe o chekwubere. Ọ bụrụ na ị kwụghị ya ụgwọ ọrụ ya, ọ ga-ebesara Jehova ákwá n’ihi gị, ikpe mmehie ga-amakwa gị.+

16 “A gaghị egbu ndị nna n’ihi ihe ụmụ ha mere, a gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi ihe nna ha mere.+ Ọ bụ naanị mmehie mmadụ mere ga-eme ka e gbuo ya.+

17 “Ekpela ikpe na-ezighị ezi mgbe ị na-ekpe ikpe onye mbịarambịa ma ọ bụ ikpe nwa na-enweghị nna.*+ Achịrịkwala uwe nwaanyị di ya nwụrụ ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego i binyere ya.+ 18 Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt, ma Jehova bụ́ Chineke gị gbapụtara gị n’ebe ahụ.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu ka i mee ihe a.

19 “Ọ bụrụ na ị gaa wee ihe ubi ndị dị n’ubi gị, gị echefuo ùkwù ọka* n’ubi, agaghachila ka i buru ya. A ga-ahapụrụ ya onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* nakwa nwaanyị di ya nwụrụ,+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe niile ị na-eme.+

20 “Ọ bụrụ na ị ghọọ mkpụrụ osisi oliv gị, agaghachila ka ị ghọrọ ndị fọrọ n’alaka ya. Ndị fọrọnụ ga-abụ maka onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, nakwa nwaanyị di ya nwụrụ.+

21 “Ọ bụrụ na ị ghọọ mkpụrụ vaịn n’ubi vaịn gị, agaghachila ka ị ghọrọ ndị fọrọ afọ. A ga-ahapụ ha maka onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, nakwa nwaanyị di ya nwụrụ. 22 Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt. Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu ka i mee ihe a.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya