Emọs
2 “Jehova kwuru, sị:
‘“N’ihi isi ndị Moab nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha gbara ọkpụkpụ eze Ịdọm ọkụ, ya aghọọ ntụ.
2 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Moab.
Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Kiriọt.+
Moab ga-anwụkwa n’oge ọgba aghara,
Mgbe a na-eti mkpu agha, na-afụkwa opi.+
3 M ga-ewepụ onye na-achị* ya.
M ga-egbu ya na ndị niile o mere ndị isi.”*+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’
4 Jehova kwukwara, sị:
‘N’ihi isi ndị Juda nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha jụrụ iwu Jehova
Nakwa n’ihi na ha esoghị ntụziaka ya.+
Ma ihe mere ka ha kpafuo bụ ụgha e ji mara ndị nna nna ha.+
5 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Juda.
Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile dị na Jeruselem.’+
6 Jehova kwuru, sị:
‘N’ihi isi ndị Izrel nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha rere onye ezi omume iji nweta ọlaọcha,
Reekwa ogbenye iji nweta akpụkpọ ụkwụ.+
7 Ha na-azọgide isi ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ájá.+
Ha anaghị emeso ndị dị umeala n’obi otú ha kwesịrị isi emeso ha.+
Nna na nwa ya na-akwaso otu nwa agbọghọ iko,
Na-emebi aha nsọ m.
8 Ha na-anara mmadụ uwe n’ibé ma ha binye onye ahụ ego,+ yirikwa ya gbatịa onwe ha n’akụkụ ebe ịchụàjà ọ bụla.+
Mmanya ha natara ndị ha riri iwu ka ha na-aṅụ n’ụlọ chi ha.’
9 ‘Ma, ọ bụ m kpochapụrụ ndị Amọraịt n’ihu ha,+
Ndị toro ogologo ka osisi sida, ndị sikwara ike ka osisi ook.
M bibiri mkpụrụ ha ndị dị n’elu ha nakwa mgbọrọgwụ ha ndị dị n’ime ala.+
Emekwara m ka unu gaa ije afọ iri anọ n’ala ịkpa,+
Ka unu wee weghara ala ndị Amọraịt.
11 M họpụtara ụfọdụ n’ime ụmụ unu ka ha bụrụ ndị amụma,+
Họpụtakwa ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa unu ka ha bụrụ ndị Naziraịt.+
Ndị Izrel, ọ̀ bụ ụgha?’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.
12 ‘Ma unu nọ na-enye ndị Naziraịt mmanya ka ha ṅụọ.+
Unu nyekwara ndị amụma iwu, sị: “Unu ebula amụma.”+
13 N’ihi ya, m ga-egwepịa unu n’ala unu
Otú ụgbọala e bujuru ọka si egwepịa ihe dị n’okpuru ya.
14 Onye na-awụ ajọ ọsọ agaghị enwe ebe ọ ga-agbaga.+
Ike agaghị adị onye siri ike.
O nweghịkwa onye agha ga-azọli onwe ya ndụ.*
15 Onye na-agba ụta agaghị eguzoli.
Onye na-awụ ajọ ọsọ agaghị enwe ike ịgbalaga.
Onye na-agba ịnyịnya agaghị azọli onwe ya ndụ.*