Job
3 Ọ̀ ga-arịọ gị arịrịọ ọtụtụ ugboro,
Ka ọ̀ ga-eji nwayọọ gwa gị okwu?
4 Ọ̀ ga-ekwe ka gị na ya gbaa ndụ
Ka i jiri ya mere ohu ná ndụ gị niile?
5 Ị̀ ga-egwusa ya egwu otú e si egwusa nnụnụ
Ma ọ bụ kenye ya eriri ka ụmụaka gị ndị nwaanyị jiri ya gwurie egwu?
6 Ndị ahịa hà ga na-ekwe ya ọnụ?
Hà ga-ekere ya ndị na-azụ ahịa?
8 Tụkwasị ya aka gị.
Ị ga-echetazi ọgụ gị na ya lụrụ, ị gaghịkwa anwa anwa tụkwasị ya aka ọzọ.
9 Olileanya ọ bụla mmadụ nwere na ọ ga-emeri ya bụ n’efu.
Anya nkịtị ị hụrụ ya ga-eme ka egwu jide gị.*
10 E nweghị onye ga-anwa anwa kpasuo ya.
Ònyezi nwere ike iguzo n’ihu m?+
11 È nwere onye bu ụzọ nye m ihe ọ bụla nke mere m ga-eji kwụghachi ya ihe o nyere m?+
Ihe niile dị n’ụwa* bụ nke m.+
12 M ga-ekwukwa banyere ụkwụ ya na aka ya,
Banyere otú o si sie ike nakwa otú ahụ́ ya si dị egwu.
13 Ònye gbatụrụla ya akpụkpọ?
Ònye ga-abanyeli ya n’ọnụ ma o meghee agba ya?
14 Ònye ga-amanyeli ya ka o meghee ọnụ* ya?
Ezé ya niile na-emenye ụjọ.
15 Azụ ya niile bụ akpịrịkpa akpịrịkpa*
Ndị rapagidesiri ike n’ibe ha.
16 Nke ọ bụla rapagidesiri ike n’ibe ya
Nke na ikuku enweghị ike isi n’etiti ha gafere.
17 Ha tapaara n’ahụ́ ibe ha.
Ha nyakọtara ọnụ, e nweghịkwa ike ikewa ha.
18 Ìhè na-enwupụta ma o zee ume,
Anya ya na-enwukwa ka ìhè na-enwu ma chi bọwa.
19 Ihe yiri àmụ̀mà na-esi ya n’ọnụ apụta.
Ikerike ọkụ na-esi ya n’ọnụ apụta.
20 Anwụrụ ọkụ na-esi n’oghere imi ya apụta
Otú anwụrụ ọkụ si esi n’ekwú a wụnyere ahịhịa amị apụta.
21 Ume ọ na-ekupụta na-eme ka icheku ọkụ nwuru ọkụ,
Ire ọkụ na-esikwa ya n’ọnụ apụta.
22 Olu ya siri ezigbo ike.
Ezigbo ụjọ na-ejide onye ọ bụla zutere ya.
23 Akpụkpọ ahụ́ ya fụkọtara afụkọta.
Ha siri ezigbo ike ka à ga-asị na e ji ígwè kpụọ ha nke na ha enweghị ike ikpekapụ ekpekapụ.
24 Obi ya siri ike ka nkume.
N’eziokwu, o siri ike ka nnukwu nkume e ji egwe nri.
25 O bilie ọtọ, ụjọ na-ejidedị ndị dike.
Mkpọtụ ọ na-eme n’ime mmiri na-eyi egwu.
27 Ọ na-ewere ígwè ka okporo ahịhịa ọka,
Were ọla kọpa ka osisi rere ure.
28 Akụ́ anaghị eme ka ọ gbaa ọsọ.
E jiri èbè* gbaa ya nkume, ọ na-adị ya ka à tụrụ ya ahịhịa ọka.
29 Ọ na-ewere okpiri ka ahịhịa ọka,
Mkpọtụ árọ̀ na-eme na-atọkwa ya ọchị.
30 Okpuru afọ ya dị ka mpekere ite ụrọ ndị ọnụ ha pịrị apị.
Ọ na-agbasa onwe ya n’apịtị ka ihe e ji azọcha ọka.+
31 Ọ na-eme ka ala ala osimiri na-agbọ agbọ ka mmiri e sinyere n’ite.
Ọ na-eme ka oké osimiri na-agbọ ụfụfụ ka ite mmanụ otite e sinyere n’ọkụ.
32 Ọ na-eme ka mmiri na-agbọ ụfụfụ mgbe ọ na-egwugharị na mmiri.
Mmadụ ga-eche na oké osimiri gbara isi awọ́.
33 E nweghị ihe yiri ya n’ụwa.
E kere ya ka ọ ghara ịna-atụ ihe ọ bụla ụjọ.
34 Ọ na-ele anụ ọ bụla dị mpako anya n’atụghị egwu.
Ọ bụ eze anụ ọhịa niile siri ike.”