Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ
16 Otú ahụ ka ha si bubata Igbe ezi Chineke ma dọsa ya n’ụlọikwuu ahụ Devid mara maka ya.+ Ha chụkwaara ezi Chineke àjà a na-esu ọkụ na àjà udo.+ 2 Mgbe Devid chụchara àjà a na-esu ọkụ+ na àjà udo,+ ọ gọziri ndị Izrel n’aha Jehova. 3 O nyekwara onye Izrel ọ bụla, ma nwoke ma nwaanyị, otu achịcha, otu keeki mkpụrụ osisi det, na otu keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ. 4 Ọ họpụtakwara ụfọdụ ndị Livaị ka ha na-eje ozi ebe ahụ a dọsara Igbe Jehova+ nakwa ka ha na-asọpụrụ* Jehova bụ́ Chineke Izrel, na-ekele ya ma na-eto ya. 5 Esaf+ bụ onyeisi ha. Zekaraya na-esote ya. Jeayel, Shemiramọt, Jehayel, Matitaya, Elayab, Benaya, Obed-ịdọm, na Jeayel+ na-akpọ ụbọ akwara na une.+ Esaf na-akụ ájà.+ 6 Benaya na Jahazayel bụ́ ndị nchụàjà na-afụkwa opi mgbe niile n’ihu igbe ọgbụgba ndụ ezi Chineke.
7 Ụbọchị ahụ bụ nke mbụ Devid rọrọ abụ e ji ekele Jehova. Ọ gwakwara Esaf+ na ụmụnne ya ka ha bụọ ya. Abụ ahụ bụ:
8 “Keleenụ Jehova.+ Kpọkuonụ aha ya.
Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+
9 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto.+
Chebaranụ ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ echiche.*+
10 Jirinụ aha nsọ ya na-eme ọnụ.+
Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+
11 Chọọnụ Jehova,+ rịọkwanụ ya ka o nye unu ike.
Na-arịọnụ ya mgbe niile ka o meere unu amara.+
12 Chetanụ ihe ndị dị ebube o mere,+
Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ nakwa ikpe ndị o kpere,
13 Unu ụmụ* Izrel bụ́ ndị ohu ya,+
Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+
14 Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+
Ọ na-ekpe ụwa niile ikpe.+
15 Na-echetanụ ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Na-echetanụ nkwa o kwere* ruo otu puku ọgbọ.+
16 Ọ bụ ya na Ebreham gbara ndụ ahụ.+
Ọ ṅụkwaara Aịzik iyi.+
17 Ọ ṅụrụ iyi ahụ iji mee ka obi sie Jekọb ike+
Nakwa ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka ya na Izrel gbara.
19 Ha dị ole na ole mgbe ahụ.
N’eziokwu, ha ehighị nne, ha bụkwa ndị mbịarambịa.+
22 Ọ sịrị, ‘Unu akpala ndị m tere mmanụ aka.
Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.’+
23 Ndị niile bi n’ụwa, bụkuonụ Jehova abụ.
Kwa ụbọchị, na-akọnụ otú o si azọpụta ndị mmadụ.+
24 Kọọrọnụ mba dị iche iche na ọ dị ebube.
Kọọkwaranụ mmadụ niile ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ.
25 N’ihi na Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya.
E kwesịrị ịna-atụ egwu ya karịa chi ọ bụla ọzọ.+
26 Chi ọzọ niile ndị mmadụ na-efe abaghị uru.+
Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.+
27 Ebube na ịma mma gbara ya gburugburu.+
Ike na ọṅụ dịkwa n’ebe o bi.+
28 Ezinụlọ dị iche iche, toonụ Jehova.
Toonụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa ike.+
29 Toonụ aha Jehova dị ebube.+
Jirinụ onyinye bịa ebe ọ nọ.+
Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.*+
30 Ndị niile bi n’ụwa, maanụ jijiji n’ihu ya.
E kesiri ụwa* ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ.*+
31 Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị.+
Kọsaanụ ná mba dị iche iche, sị: ‘Jehova abụrụla Eze.’+
32 Ka oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya mee mkpọtụ.
Ka ọhịa na ihe niile dị n’ime ya ṅụrịa ọṅụ.
34 Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.+
35 Sịkwanụ, ‘Chineke, onye nzọpụta anyị, biko, zọpụta anyị,+
Sikwa ná mba dị iche iche kpọkọta anyị ma napụta anyị n’aka ha,
Ka anyị wee too aha nsọ gị,+
Jirikwa ọṅụ na-eto gị.+
36 Ka a na-eto Jehova bụ́ Chineke Izrel
Ruo mgbe ebighị ebi.’”*
Mmadụ niile sịkwara, “Amen!”* Ha tokwara Jehova.
37 Devid hapụziri Esaf+ na ndị Livaị ndị ọzọ ka ha na-eje ozi mgbe niile n’ebe ahụ a dọsara igbe ọgbụgba ndụ Jehova.+ Ha na-ejekwa ozi ọ bụla e kwesịrị ije kwa ụbọchị.+ 38 Ọ hapụkwara Obed-ịdọm na ụmụnne ya iri isii na asatọ, nakwa Obed-ịdọm nwa Jedutọn, na Hosa ka ha na-eche ọnụ ụzọ ámá nche. 39 Ọ hapụkwara Zedọk+ bụ́ onye nchụàjà na ndị nchụàjà ibe ya ka ha nọrọ n’ụlọikwuu Jehova dị n’ebe dị elu na Gibiọn+ 40 na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ, ma n’ụtụtụ ma ná mgbede. Ha na-emekwa ihe niile e dere n’Iwu Jehova otú ọ gwara ndị Izrel ka ha na-eme.+ 41 Ndị ọzọ so ha bụ Himan, Jedutọn,+ na ndị ọzọ a họọrọ ka ha na-ekele Jehova,+ n’ihi na “ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ 42 Himan+ na Jedutọn so ha ka ha nwee ike ịna-afụ opi, na-akụkwa ájà na ihe ndị ọzọ e ji eto ezi Chineke. Ọ bụkwa ụmụ Jedutọn+ na-eche ọnụ ụzọ ámá nche. 43 Mgbe ha mechara, onye ọ bụla lara n’ụlọ ya. Devid lakwara ka ọ gọzie ndị ezinụlọ ya.