Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 25
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ọnụ ụtarị ole e nwere ike ịpịa mmadụ (1-3)

      • Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka (4)

      • Mmadụ ikuchi nwunye nwanne ya nwoke (5-10)

      • A gaghị anwụchi nwoke na-alụ ọgụ n’ihe o ji bụrụ nwoke (11, 12)

      • Ezigbo ihe e ji atụ̀ ihe (13-16)

      • Ndị Izrel kwesịrị ibibi ndị Amalek (17-19)

Diuterọnọmi 25:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 16:18; 17:8, 9; 19:16, 17
  • +Ọp 23:6; 2Ih 19:6; Ilu 17:15; 31:9

Diuterọnọmi 25:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 10:13; 20:30; 26:3; Lu 12:48; Hib 2:2

Diuterọnọmi 25:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Kọ 11:24

Diuterọnọmi 25:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 12:10; 1Kọ 9:9; 1Ti 5:18

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    5/1/2012, p. 30

Diuterọnọmi 25:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 38:7, 8; Ru 4:5; Mk 12:19

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, p. 1884

Diuterọnọmi 25:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 38:9; Ru 4:10, 17
  • +Ọg 27:1, 4

Diuterọnọmi 25:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ru 4:7

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/15/2004, p. 26

Diuterọnọmi 25:12

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Anya unu.”

Diuterọnọmi 25:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 11:1; 20:10; Maị 6:11

Diuterọnọmi 25:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ụdị efa abụọ.” Gụọ B14.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 19:36

Diuterọnọmi 25:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:40

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    8/2022, p. 27

Diuterọnọmi 25:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 19:35

Diuterọnọmi 25:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 17:8; Ọg 24:20

Diuterọnọmi 25:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 22:4
  • +Ọp 17:14; 1Sa 14:47, 48; 15:1-3; 1Ih 4:42, 43

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ṅomie, p. 144

    Ụlọ Nche,

    1/1/2012, p. 29

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 25:1Di 16:18; 17:8, 9; 19:16, 17
Diut. 25:1Ọp 23:6; 2Ih 19:6; Ilu 17:15; 31:9
Diut. 25:2Ilu 10:13; 20:30; 26:3; Lu 12:48; Hib 2:2
Diut. 25:32Kọ 11:24
Diut. 25:4Ilu 12:10; 1Kọ 9:9; 1Ti 5:18
Diut. 25:5Je 38:7, 8; Ru 4:5; Mk 12:19
Diut. 25:6Je 38:9; Ru 4:10, 17
Diut. 25:6Ọg 27:1, 4
Diut. 25:9Ru 4:7
Diut. 25:13Ilu 11:1; 20:10; Maị 6:11
Diut. 25:14Le 19:36
Diut. 25:15Di 4:40
Diut. 25:16Le 19:35
Diut. 25:17Ọp 17:8; Ọg 24:20
Diut. 25:19Jos 22:4
Diut. 25:19Ọp 17:14; 1Sa 14:47, 48; 15:1-3; 1Ih 4:42, 43
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 25:1-19

Diuterọnọmi

25 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esee okwu, ha nwere ike ịgakwuru ndị ikpe.+ Ndị ikpe ga-ekpere ha ikpe ma kpebie onye nke aka ya dị ọcha na onye nke mere ihe na-adịghị mma.+ 2 Ọ bụrụ na e kwesịrị ịpịa onye nke mere ihe na-adịghị mma ihe,+ onyeikpe ga-eme ka o dinara ala, a ga-anọkwa n’ihu onyeikpe ahụ pịa ya ihe. Ihe a ga-eji mara ọnụ ụtarị ole a ga-apịa ya bụ otú ihe o mere dịruru njọ. 3 E nwere ike ịpịaru ya ọnụ ụtarị iri anọ,+ ma ọ gaghị akarị iri anọ. Ọ bụrụ na a pịa ya karịa ole a, a ga-emenye nwanne gị ihere n’ihu unu.

4 “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.*+

5 “Ọ bụrụ na ụmụnne bikọtara ọnụ, otu n’ime ha anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ agaghị alụ nwoke si n’ezinụlọ ọzọ. Nwanne di ya ga-agakwuru ya, kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya ma kuchie ya.+ 6 Nwa nwoke mbụ nwaanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ,+ ka aha ya ghara ifu n’Izrel.+

7 “Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ achọghị ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwunye nwanne ya ahụ ga-agakwuru ndị okenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ma sị, ‘Nwanne di m jụrụ ime ka aha nwanne ya nwoke ghara ifu n’Izrel. O kweghị ekuchi m.’ 8 Ndị okenye obodo ha ga-akpọ nwoke ahụ gwa ya okwu. Ọ bụrụ na o sie ọnwụ, sị, ‘Achọghị m ịlụ ya,’ 9 nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ ga-abịakwute ya n’ihu ndị okenye ahụ, yipụ ya otu akpụkpọ ụkwụ ya,+ gbụọ ya asọ mmiri n’ihu ma sị, ‘Ọ bụ ihe a ka a ga-eme nwoke na-ekweghị eme ka ámá nwanne ya nwoke ghara ichi.’ 10 Ihe a ga-ejizi mara ezinụlọ ya n’Izrel bụ ‘Ezinụlọ onye e yipụrụ akpụkpọ ụkwụ ya.’

11 “Ọ bụrụ na ụmụ nwoke abụọ na-alụ ọgụ, nwunye otu n’ime ha abịa ịnapụta di ya n’aka onye na-eti ya ihe, nwaanyị ahụ wee matịa aka jide nwoke ahụ n’ihe o ji bụrụ nwoke, 12 unu ga-egbupụ nwaanyị ahụ aka. Unu* emerela ya ebere.

13 “Enwela ụdị nkume abụọ e ji atụ̀ ihe n’akpa gị,+ nke ukwu na nke nta. 14 Enwela ụdị efere abụọ e ji atụ̀ ihe*+ n’ụlọ gị, nke ukwu na nke nta. 15 Ị ga-enwe ezigbo ihe e ji atụ̀ ihe nke zuru ezu, nweekwa ezigbo efere e ji atụ̀ ihe nke zuru ezu, ka i wee dịtee ndụ aka n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.+ 16 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kpọrọ onye ọ bụla na-aghọ aghụghọ, nke na-eme ihe ndị a, asị.+

17 “Chetanụ ihe ndị Amalek mere unu n’ụzọ mgbe unu si n’Ijipt na-apụta,+ 18 otú ha si zute unu n’ụzọ ma lụso ndị niile nọ n’azụ azụ na-anaghị agasi ike agha, mgbe ike gwụrụ unu. Ha atụghị egwu Chineke. 19 Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu mere ka unu zuoro ndị iro unu niile gbara unu gburugburu ike n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,+ unu ga-ekpochapụ ndị Amalek ka a ghara ịnụkwa aha ha n’ụwa.*+ Unu echefula.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya