Ezikiel
5 “Gịnwa bụ́ nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ mere agụba. Kpụọ isi gị na afụ ọnụ gị, jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe kee ntutu gị ụzọ atọ. 2 Ụbọchị ole ị ga-anọchibido obodo a zuo, ị ga-anọ n’ime ya gbaa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ntutu gị ahụ ọkụ.+ Ị ga-achịrịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ, na-egbu ya mma agha gbaa obodo a gburugburu.+ Ị ga-aghasasịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ikpeazụ ka ikuku buru ya. M ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+
3 “Chịrị ole na ole n’ime otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ fọrọnụ, jirikwa uwe gị fụchie ha. 4 Sikwa na nke ahụ fọrọnụ chịrị ụfọdụ chịba n’ọkụ ka ọkụ rechapụ ha. Ọkụ ga-esi na ha gazuo ebe niile n’Izrel.+
5 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ebe a bụ Jeruselem. Emeela m ka ọ dịrị n’etiti mba dị iche iche. Ala dị iche iche gbakwara ya gburugburu. 6 Ma, ndị bi na ya emeghị ihe ndị m kpebiri. Ha edebeghịkwa iwu m. Ha na-eme ihe ọjọọ karịa mba na ala ndị gbara ha gburugburu.+ Ha ajụla ihe ndị m kpebiri. Ha anaghịkwa edebe iwu m.’
7 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘Unu na-enye nsogbu karịa mba niile gbara unu gburugburu. Unu anaghị edebe iwu m. Unu anaghị eme ihe m chọrọ,* kama, unu na-eme ihe mba ndị gbara unu gburugburu chọrọ.+ 8 N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Jeruselem, m ga-emesi gị ike.+ M ga-atakwa gị ahụhụ. M ga-emekwa gị ihe ndị a n’ihu mba dị iche iche.+ 9 M ga-eme gị ihe m na-emetụbeghị ndị ọ bụla nakwa ihe m na-agaghị eme ihe yiri ya ọzọ. M ga-eme gị ihe a n’ihi arụ niile ị kpara.+
10 “‘“Ndị nna bi n’ime gị ga-eri ụmụ ha.+ Ụmụ ga-erikwa ndị nna ha. M ga-ata ndị bi n’ime gị ahụhụ, chụsasịakwa ndị gị niile fọrọnụ ebe niile.”’+
11 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-ajụ unu, ebe ọ bụ na unu ji arụsị unu niile na-asọ oyi na arụ niile unu kpara merụọ ụlọ nsọ m.+ Agaghị m emere unu ebere.* Agaghịkwa m enwere unu ọmịiko.+ 12 Ma ọrịa na-efe efe ma ụnwụ ga-ala otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime unu n’iyi. A ga-eji mma agha gbuo otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ gburugburu obodo a.+ M ga-achụsasị otu ụzọ n’ụzọ atọ fọrọnụ ebe niile. M ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+ 13 M mechaa ha ihe a iji gosi na iwe ji m, obi ga-ajụrụ m. Iwe m ga-adajụ, obi ga-adịkwa m mma.+ Ha ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe ndị a n’ihi na m chọrọ ka a na-efe naanị m.+
14 “‘Jeruselem, m ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị. Mba ndị gbara gị gburugburu na ndị niile na-agafe agafe ga-ejikwa gị na-abụ ndị ọzọ ọnụ.+ 15 Mgbe m ga-eji iwe na ọnụma kpee ndị bi na gị ikpe ma taa ha ezigbo ahụhụ, mba ndị gbara gị gburugburu ga na-achị ha ọchị, na-akwa ha emo.+ Ị ga-abụkwa ihe atụ e ji adọ ndị ọzọ aka ná ntị. Ihe m ga-eme gị ga-emekwa ka egwu jide mba ndị ahụ. Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a.
16 “‘M ga-eji ụnwụ sụọ ndị bi na gị akwụ ka à ga-asị na a gbara ha akụ́ nke ga-ebibi ha.+ M ga-eme ka ụnwụ ahụ sie ike nke na a gaghị enwe ebe a ga-esi na-enweta nri.*+ 17 M ga-eme ka ụnwụ na ajọ anụ ọhịa+ mee gị ihe. Ihe ndị a ga-emekwa ka ị gbara aka nwa. M ga-ejikwa ọrịa na-efe efe na mma agha mee gị ihe.+ Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a.’”