Hosia
2 “Sịnụ ụmụnne unu ndị nwoke, ‘Unu bụ ndị m.’*+
Sịkwanụ ụmụnne unu ndị nwaanyị, ‘Unu bụ ndị nwaanyị e meere ebere.’*+
O kwesịrị ịkwụsị ịgba akwụna.*
O kwesịkwara ịkwụsị ịkwa iko.
3 Ma ọ́ bụghị ya, m ga-agba ya ọtọ, mee ka ọ dịrị otú ọ dị n’ụbọchị a mụrụ ya,
Meekwa ka ọ dị ka ala ịkpa.
M ga-eme ka ọ dị ka ala mmiri na-adịghị,
Meekwa ka agụụ mmiri gụgbuo ya.
5 N’ihi na nne ha na-agba akwụna.*+
Onye buru afọ ime ha akpaala àgwà na-eme ihere,+ n’ihi na ọ sịrị,
‘M ga-agakwuru ndị mụ na ha na-eme enyi,+
Ndị na-enye m nri, mmiri,
Ákwà e ji ajị anụ mee, ákwà linin, mmanụ na mmanya.’
6 N’ihi ya, m ga-eji ogwu gbaa ụzọ ya ogige.
M ga-ejikwa nkume rụchibido ya mgbidi,
Ka ọ ghara ịchọta ụzọ ya.
7 Ọ ga-achụwa ndị ya na ha na-eme enyi, ma ọ gaghị achụkwute ha.+
Ọ ga-achọ ha, ma ọ gaghị achọta ha.
8 Ọ mataghị na ọ bụ m nyere ya nri+ na mmanya ọhụrụ na mmanụ,
Nakwa na ọ bụ m mere ka o nwee ọtụtụ ọlaọcha
Na ọlaedo, bụ́ ndị ha ji na-efe Bel.+
9 N’ihi ya, m ga-agbanwe otú m si eme, nara ya nri m na-enye ya n’oge ya,
Narakwa ya mmanya ọhụrụ m n’oge ya.+
M ga-anarakwa ya ákwà m e ji ajị anụ mee na ákwà linin m o ji kpuchie ọtọ ya.
10 Ugbu a, m ga-ekpughe ihe o ji bụrụ nwaanyị n’ihu ndị ya na ha na-eme enyi.
O nweghịkwa onye ga-anapụta ya n’aka m.+
11 M ga-eme ka ọ kwụsị ịṅụrị ọṅụ.
M ga-emekwa ka ememme ya,+ ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ ya, ụbọchị izu ike ya, na oge ememme ya niile kwụsị.
12 M ga-ebibi osisi vaịn ya na osisi fig ya, bụ́ ndị o kwuru gbasara ha, sị:
‘Ihe ndị a ka ndị mụ na ha na-eme enyi ji kwụọ m ụgwọ.’
M ga-emekwa ka ha dị ka oké ọhịa.
Anụ ọhịa ga-erichapụkwa ha.
13 M ga-eme ka ọ zaa ajụjụ maka ụbọchị niile ọ nọ na-achụrụ Bel àjà,+
Mgbe o ji ọla ntị ya na ihe ndị o ji achọ mma na-achọ onwe ya mma, chụrụkwa ndị ya na ha na-eme enyi na-aga.
Ma, ọ bụ m ka o chefuru.+ Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova na-ekwu ihe a.
14 N’ihi ya, m ga-eme ka o kweta.
M ga-eduru ya gaa n’ala ịkpa.
M ga-agwa ya okwu ga-eru ya n’obi.
15 M ga-enyeghachi ya ubi vaịn ya malite mgbe ahụ gawa.+
M ga-enyekwa ya Ndagwurugwu Ekọ+ ka ọ bụrụ ọnụ ụzọ ámá olileanya.
Ọ ga-aza òkù ebe ahụ dị ka ọ zara n’oge ọ bụ agbọghọ,
Dịkwa ka ọ zara n’ụbọchị o si n’Ijipt pụta.+
17 M gaghịkwa ekwe ka ọ na-akpọ aha arụsị niile bụ́ Bel.+
A gaghịzi echeta aha ha.+
M ga-ewepụ ụta na mma agha na agha n’ala ha.+
Meekwa ka obi ruo ha ala ma ha dinara ala.+
19 M ga-ekwe nkwa ịlụ gị ruo mgbe ebighị ebi.
20 M ga-ekwe nkwa ịlụ gị, m gaghịkwa agharịpụ gị.
Ị ga-amakwa Jehova.+
21 N’ụbọchị ahụ, mụnwa bụ́ Jehova ga-aza òkù,
M ga-aza eluigwe òkù.
Eluigwe ga-azakwa ala òkù.+
23 M ga-agha ya n’ala dị ka mkpụrụ maka onwe m.+
Ha ga-asịkwa: ‘Ị bụ Chineke anyị.’”+