Samuel nke Mbụ
18 Ozugbo+ Devid gwachara Sọl okwu, Jonatan bịara hụ Devid n’anya ka onwe* ya, ha abụọ abụrụ ezigbo enyi.+ 2 Malite n’ụbọchị ahụ, Sọl kpọọrọ Devid ka ọ na-ejere ya ozi. O kweghịkwa ka ọ laghachi n’ụlọ nna ya.+ 3 Ebe ọ bụkwa na Jonatan hụrụ Devid n’anya ka onwe* ya,+ ha abụọ gbara ndụ.+ 4 Jonatan yipụkwara uwe na-enweghị aka o yi, chịnye ya Devid. Ọ chịnyekwara ya uwe agha ya, nyekwa ya mma agha ya, ụta ya, na ájị̀* ya. 5 Devid malitekwara ịna-aga agha. Ọ na-akpakwa ike*+ ebe ọ bụla Sọl zigara ya. N’ihi ya, Sọl họpụtara ya ka ọ bụrụ otu n’ime ndị ọchịagha ya.+ Ihe a masịkwara ndị Izrel niile na ndị na-ejere Sọl ozi.
6 Ọ na-abụ Devid na ndị agha ndị ọzọ gbuchaa ndị Filistia lọta, ụmụ nwaanyị esi n’obodo niile dị n’Izrel pụta, gụrụ egwú,+ kụrụ obere ịgbà,+ kpọrọ une, ṅụrụ ọṅụ, gbarakwa egwú gaa izute Eze Sọl. 7 Ihe a ka ụmụ nwaanyị ndị a na-enwe aṅụrị na-agụ n’egwú:
“Sọl egbuola puku kwuru puku,
Devid egbuokwala iri puku kwuru iri puku.”+
8 Mgbe Sọl nụrụ egwú a,+ ọ dịghị ya mma. O wekwara ezigbo iwe, na-agwa onwe ya, sị: “Ha na-eto Devid na-asị na o gburu iri puku kwuru iri puku, ma na-eto m na-asị na m gburu puku kwuru puku. Naanị ihe fọziri bụ ime ya eze.”+ 9 Malite ụbọchị ahụ gawa, Sọl lewere Devid anya ọjọọ.
10 N’echi ya, Chineke kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara izu Sọl ike,*+ ya ebido na-emegheri emegheri* n’ime ụlọ, ka Devid nọ na-akpọ ụbọ+ otú ọ na-eme n’oge ndị ọzọ. Sọl jikwa ube n’aka.+ 11 Ọ tụkwara ube ahụ,+ na-agwa onwe ya, sị: “M ga-atụgide Devid n’ahụ́ ájá!” Ọ tụrụ ya ube ahụ ugboro abụọ, ma Devid zechara ha ma si ebe ọ nọ gbapụ. 12 Sọl wee malite ịtụ Devid egwu n’ihi na Jehova nọnyeere Devid+ ma hapụ yanwa.+ 13 N’ihi ya, Sọl chụpụrụ ya ka ya na ya ghara ịna-anọ ma họpụta ya ka ọ bụrụ ọchịagha otu puku (1,000) ndị agha. Devid na-edukwa ndị agha a aga agha.*+ 14 Ihe niile Devid na-eme nọkwa na-aga nke ọma.*+ Jehova nọnyekwaara ya.+ 15 Mgbe Sọl hụrụ na ihe na-agaziri Devid, ọ tụwara ya egwu. 16 Ma, ndị Juda na ndị Izrel ndị ọzọ hụrụ Devid n’anya, n’ihi na ọ na-edu ha aga agha.
17 Sọl mechara sị Devid: “Ị̀ hụla ada m bụ́ Mirab?+ M ga-akpọnye gị ya ka ị lụwa.+ Ma, na-akata obi na-ejere m ozi otú i si eme, na-alụkwara Jehova agha.”+ Ma Sọl gwara onwe ya, sị: ‘Achọghị m igbu ya n’onwe m. Kama, ka ọ bụrụ ndị Filistia ga-egbu ya.’+ 18 Ma, Devid sịrị Sọl: “Ònye ka m bụ, ole ndị ka ndị ikwu m na ezinụlọ nna m bụkwa n’Izrel, nke na m ga-abụ ọgọ eze?”+ 19 Ma, tupu oge eruo ka a kpọnye Devid Mirab, bụ́ ada Sọl, a kpọnyela ya Edriel onye Mehola* ka ọ lụwa.+
20 Ma, Maịkal,+ nwa Sọl, hụrụ Devid n’anya. A gwakwara ya Sọl, ya adị ya mma. 21 Sọl wee sị: “M ga-ekenye ya nwa m nwaanyị ka ọnyà m jide ya, ka aka ndị Filistia kpara ya.”+ Sọl gwaziri Devid ọzọ, sị: “Mụ na gị ga-agọ ọgọ taa.” 22 Sọl gwakwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “Gwanụ Devid na nzuzo, sị, ‘Ihe gị dị eze mma, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị n’anya. Kweta ka gị na eze gọọ ọgọ.’” 23 Mgbe ndị na-ejere Sọl ozi gwara Devid ihe a, ọ gwara ha, sị: “Ùnu chere na mụ na eze ịgọ ọgọ bụ obere ihe, ebe m bụ ogbenye, abụghịkwa m onye a ma ama?”+ 24 Ndị na-ejere Sọl ozi wee gwa ya ihe Devid kwuru.
25 Sọl asị ha: “Gwanụ Devid sị, ‘Eze achọghị ka i nye ya ego isi nwaanyị.+ Naanị ihe ọ chọrọ bụ otu narị (100) apị́+ ndị Filistia, ka eze si otú ahụ megwara ndị iro ya ihe ha mere ya.’” Ma nkata Sọl nọ na-akpa bụ ka ndị Filistia gbuo Devid. 26 Ndị na-ejere ya ozi wee gwa Devid ihe ndị a, ya adị ya mma ka ya na eze gọọ ọgọ.+ Tupu oge e nyere Devid eruo, 27 ya na ndị agha ya gara gbuo narị ụmụ nwoke ndị Filistia abụọ (200). Devid wetakwaara eze apị́ ha niile, ka ya na eze gọọ ọgọ. N’ihi ya, Sọl kpọnyere ya Maịkal nwa ya nwaanyị ka ọ lụwa.+ 28 Sọl wee mata na Jehova nọnyeere Devid+ nakwa na Maịkal, nwa ya nwaanyị, hụrụ Devid n’anya.+ 29 Ihe a mere ka Sọl na-atụkwu Devid egwu. Sọl wekwaara Devid ka onye iro ya ruo mgbe ọ nwụrụ.+
30 Ndị isi ndị Filistia na-apụtakwa ịlụ agha, ma mgbe ọ bụla ha pụtara ịlụ agha, Devid na-akpa ike* karịa ndị agha Sọl ndị ọzọ.+ Aha ya na-edekwa ude.+