Zekaraya
14 “Lee, ụbọchị na-abịa, bụ́ ụbọchị Jehova, mgbe a ga-anọ n’ime gị* kesaa ihe gị ndị a kwakọọrọ n’agha. 2 M ga-akpọkọta mba niile ka ha lụso Jeruselem agha. A ga-eweghara obodo a, kwakọrọ ihe dị n’ụlọ ndị dị na ya, dinaakwa ụmụ nwaanyị ya n’ike. A ga-adọrọ ọkara ndị bi n’obodo a n’agha, ma a ga-ahapụ ndị fọrọ afọ ka ha nọrọ n’obodo a.
3 “Jehova ga-aga lụso mba ndị ahụ agha+ otú o si alụ agha n’ụbọchị agha.+ 4 N’ụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo n’elu Ugwu Oliv+ nke chere Jeruselem ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ugwu Oliv ga-agbawakwa abụọ, malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ,* mee ka e nwee nnukwu ndagwurugwu. Otu ọkara ugwu ahụ ga-aga n’ebe ugwu, ọkara nke ọzọ agaa n’ebe ndịda. 5 Unu ga-agbaga na ndagwurugwu nke ugwu m n’ihi na ndagwurugwu nke ugwu ahụ ga-eru n’Ezel. Unu ga-agba ọsọ otú unu gbara n’ihi ala ọma jijiji mere n’ụbọchị Eze Ọzaya nke Juda.+ Jehova bụ́ Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ niile.+
6 “N’ụbọchị ahụ, ìhè nke na-enwu gbaa agaghị adị.+ Ihe dị iche iche ga-akpụkọ akpụkọ.* 7 Ọ ga-abụ ụbọchị pụrụ iche nke a ma na ọ bụ ụbọchị Jehova.+ Ọ gaghị abụ ehihie, ọ gaghịkwa abụ abalị. Ìhè ga-adịkwa ná mgbede. 8 N’ụbọchị ahụ, mmiri na-enye ndụ+ ga-esi na Jeruselem na-asọpụta.+ Otu ọkara mmiri ahụ ga na-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ,*+ ọkara nke ọzọ ana-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.*+ Ọ ga-eme n’oge okpomọkụ nakwa n’oge oyi. 9 Jehova ga-abụkwa Eze ụwa niile.+ N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-abụ otu,+ ọ ga-enwekwa otu aha.+
10 “Ala a niile ga-adị ka Araba,+ malite na Giba+ ruo Rimọn+ nke dị n’ebe ndịda Jeruselem. Ọ* ga-ebili dịrị n’ebe ọ dịbu.+ Ndị mmadụ ga-ebikwa na ya, malite n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin+ ruo n’ebe Ọnụ Ụzọ Ámá Mbụ dị, ruokwa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Mgbidi Sụkọtara Isi, malitekwa n’Ụlọ Nche Hananel+ ruo n’ebe a na-azọchapụtara eze mmanya. 11 Ndị mmadụ ga-ebi na ya. A gakwaghị abụ ya ọnụ ka e wee bibie ya.+ Obi ga-erukwa ndị ga-ebi na Jeruselem ala.+
12 “Ihe a bụkwa ọrịa ọjọọ Jehova ga-eme ka ndị niile na-alụso Jeruselem agha rịa:+ Anụ ahụ́ ha ga-erekapụsị ka ha guzo ọtọ, anya ha ga-erekapụsị n’oghere anya ha, ire ha ga-erekapụsịkwa n’ime ọnụ ha.
13 “N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-eme ka ha niile nọrọ n’ọgba aghara. Onye nke ọ bụla ga-ejide ibe ya n’aka, lụso ibe ya ọgụ.+ 14 Juda ga-eso lụọ agha na Jeruselem. A ga-achịkọta akụ̀ mba niile gbara ha gburugburu, ya bụ, ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha na uwe.+
15 “A ga-eme ka ịnyịnya, nnukwu jakị,* kamel, obere jakị, na anụmanụ niile nọ n’ebe ndị ahụ mara ụlọikwuu rịa ụdị ọrịa ọjọọ ahụ.
16 “Onye ọ bụla fọrọ n’ime mba niile ndị na-alụso Jeruselem agha ga na-agbago kwa afọ+ ka ọ kpọọrọ Eze, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ isiala,* nakwa ka o mee Ememme Ụlọ Ndò.+ 17 Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ezinụlọ niile dị n’ụwa agbagoghị Jeruselem ịkpọrọ Eze, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, isiala, mmiri agaghị ezoro ya.+ 18 Ọ bụrụ na ezinụlọ Ijipt abịaghị, ọ bụrụkwa na ha abataghị, mmiri agaghị ezoro ha. Kama, Jehova ga-eme ka Ijipt rịa ọrịa ọjọọ ahụ ọ ga-eme ka mba ndị na-abịaghị mee Ememme Ụlọ Ndò rịa. 19 Ọ bụ ya bụ ahụhụ a ga-ata Ijipt na mba niile na-abịaghị mee Ememme Ụlọ Ndò. A ga-ata ha ahụhụ a maka na ọbịbịa ha na-abịaghị bụ mmehie.
20 “N’ụbọchị ahụ, a ga-ede ‘Jehova bụ Onye Dị Nsọ’+ ná mgbịrịgba ịnyịnya dị iche iche nya n’olu. Ite ndị e ji esi nri*+ n’ụlọ Jehova ga-adị ka efere+ ndị dị n’ihu ebe ịchụàjà. 21 Ite ọ bụla e ji esi nri* na Jeruselem nakwa na Juda ga-abụ ihe dị nsọ, bụrụkwa nke Jehova nke ụsụụ ndị agha. Ndị niile na-achụ àjà ga-abata were ụfọdụ n’ime ha sie ihe. N’ụbọchị ahụ, a gakwaghị enwe onye Kenan* n’ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha.”+