Abụ Ọma
Abụ a na-abụ n’Ụbọchị Izu Ike. Abụ ọma.
2 Ọ dị mma ka a kọsaa ịhụnanya gị*+ n’ụtụtụ
Nakwa ka a kọsaa n’abalị na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
4 N’ihi na, Jehova, i meela ka m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe ndị ị na-eme.
M na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ihe ndị ị na-arụ.
5 Jehova, ọrụ gị dị nnọọ ebube.+
Ị ma ihe nke ukwuu.+
6 Mmadụ ọ bụla nke na-anaghị eche echiche enweghị ike ịmata ha.
E nweghịkwa onye nzuzu nwere ike ịghọta ihe a:+
7 Mgbe ndị ajọ omume na-eju ebe niile otú ahịhịa si epu ebe niile,
Ihe ana-agazikwara ndị niile na-eme ihe ọjọọ,
Ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.+
8 Ma ọ bụ gị, Jehova, kacha elu ruo mgbe ebighị ebi.
9 Jehova, lee ndị iro gị anya chịa ha ọchị mgbe a na-emeri ha.
Legodị otú a ga-esi laa ndị iro gị n’iyi.
A ga-achụsasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ.+
10 Ma ị ga-eme ka m sie ike* ka atụ́.
M ga-ete mmanụ ọhụrụ n’ahụ́.+
11 M ga na-ele ndị iro m anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
M ga-eji ntị m nụ na e meriela ndị ọjọọ na-alụso m ọgụ.
12 Ma onye ezi omume ga na-ama pokopoko ka nkwụ.
Ọ ga na-agba agba ka osisi sida dị na Lebanọn.+
13 Ha dị ka osisi a kụrụ n’ụlọ Jehova.
Ha ga na-eme nke ọma n’ogige ụlọ Chineke anyị.+
14 Ha megodị agadi,* ha ka ga na-eme nke ọma.+
Ahụ́ ka ga-esi ha ike, ha ga na-amakwa pokopoko.+
15 Ha ga na-akọsa na Jehova bụ onye ezi omume.
Ọ bụ ya bụ Oké Nkume m,+ ọ naghịkwa eme ihe ọjọọ.