Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ
23 Mgbe Devid mere agadi, ya afọkwa obere oge ka ọ nwụọ, o mere Solomọn nwa ya eze Izrel.+ 2 Ọ kpọkọtakwara ndị isi ndị Izrel niile, ndị nchụàjà,+ na ndị Livaị.+ 3 A gụkwara ndị Livaị ọnụ malite ná ndị gbara afọ iri atọ gbagowe.+ Ụmụ nwoke niile dị puku iri atọ na puku asatọ (38,000). 4 Puku iri abụọ na puku anọ (24,000) n’ime ha na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova, puku isii (6,000) bụkwa ndị isi na ndị ikpe.+ 5 Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá dị puku mmadụ anọ (4,000).+ E nwekwara puku mmadụ anọ (4,000) ndị na-eji ngwá egwú eto+ Jehova. Ngwá egwú ha bụ ndị ahụ Devid kwuru banyere ha, sị, “Emere m ha ka e jiri ha na-eto Chineke.”
6 Devid wee hazie* ụmụ Livaị n’ìgwè n’ìgwè,+ ya bụ, Geshọn, Kohat, na Meraraị.+ 7 Ụmụ Geshọn bụ Ledan na Shimiaị. 8 Ụmụ Ledan bụ Jehayel, bụ́ onyeisi, Zitam, na Joel.+ Ha dị atọ. 9 Ụmụ Shimiaị bụ Shelomọt, Heziel, na Heran. Ha dị atọ. Ọ bụ ha bụ ndị isi ezinụlọ Ledan. 10 Ụmụ Shimiaị bụ Jehat, Zaịna,* Jiọsh, na Beraya. Mmadụ anọ a bụ ụmụ Shimiaị. 11 Jehat bụ onyeisi ha, Zaịza abụrụ onye nke abụọ. Ma, ebe ọ bụ na Jiọsh na Beraya amụghị ọtụtụ ụmụ, a gụkọtara ha abụọ ka otu ọnụmara. Ha na-arụkwa otu ọrụ.
12 Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha,+ Hebrọn na Ọziel.+ Ha dị anọ. 13 Ụmụ Amram bụ Erọn+ na Mosis.+ Ma, e doro Erọn na ụmụ ya ndị nwoke iche+ ka ha na-edo Ebe Kacha Nsọ nsọ. Ọ bụkwa ha ga na-achụrụ Jehova àjà, na-ejere ya ozi, na-agọzikwa ndị mmadụ n’aha ya mgbe niile.+ 14 Ma a na-agụnye ụmụ Mosis bụ́ onye nke ezi Chineke n’ebo Livaị. 15 Ụmụ Mosis bụ Geshọm+ na Eliiza.+ 16 N’ụmụ Geshọm, Shebuel+ bụ onyeisi. 17 N’ụmụ Eliiza, Rehabaya+ bụ onyeisi. Eliiza amụghị ụmụ ọzọ, ma ụmụ Rehabaya dị nnọọ ọtụtụ. 18 N’ụmụ Izha,+ Shelomit+ bụ onyeisi. 19 N’ụmụ Hebrọn, Jeraya bụ onyeisi. Amaraya bụ onye nke abụọ. Jahazayel bụ onye nke atọ. Jekamiam+ bụ onye nke anọ. 20 N’ụmụ Ọziel,+ Maịka bụ onyeisi, Ịs-shaya abụrụ onye nke abụọ.
21 Ụmụ Meraraị bụ Malaị na Mushaị.+ Ụmụ Malaị bụ Elieza na Kish. 22 Elieza nwụrụ n’amụtaghị nwoke ọ bụla. Naanị ụmụ nwaanyị ka ọ mụrụ. Ụmụ Kish bụ́ ndị ikwu* ha wee lụrụ ha. 23 Ụmụ Mushaị bụ Malaị, Ịda, na Jeremọt. Ha dị atọ.
24 Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Livaị ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara, ha na ndị isi ha. A gụrụ ndị Livaị ọnụ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, deekwa aha ha ka ọ bụrụ ha ga na-eje ozi a na-eje n’ụlọ Jehova. 25 Devid sịrị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel emeela ka ndị ya zuru ike.+ Ọ ga-ebikwa na Jeruselem ruo mgbe ebighị ebi.+ 26 Ndị Livaị agaghịkwa na-ebugharị ụlọikwuu ahụ ma ọ bụ arịa ndị dị na ya e ji ejere Chineke ozi.”+ 27 A gụrụ ndị Livaị ọnụ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe. Ihe a so n’ihe ikpeazụ Devid kwuru ka e mee. 28 Ọrụ ha bụ inyere ụmụ Erọn aka+ n’ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova, ma n’ogige ya+ ma n’ebe a na-anọ eri ihe ma n’ido ihe ọ bụla dị nsọ ọcha, nakwa n’ọrụ ọ bụla gbasara ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke. 29 Ha na-enyekwara ha aka na-ahụ maka achịcha a na-enye Chineke,+ ntụ ọka e gwere nke ọma maka ịchụ àjà ọka, achịcha na-ekoghị eko dị fere fere,+ keeki e mere n’ite dị mbadamba, na ntụ ọka a gwọrọ agwọ.+ Ha na-enyekwa aka atụ̀ ihe niile a na-atụ atụ̀ iji mata ole ha dị na otú ha hà. 30 Ha na-anọkwa ebe ahụ n’ụtụtụ ọ bụla+ nakwa ná mgbede ọ bụla na-ekele Jehova, na-etokwa ya.+ 31 Ha na-enyekwa aka mgbe ọ bụla a na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’Ụbọchị Izu Ike,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ nakwa n’oge ememme dị iche iche.+ Ha na-enye aka mgbe niile a na-achụrụ Jehova àjà a otú iwu kwuru ka e si na-eme ya. 32 Ha na-arụkwa ọrụ n’ụlọikwuu nzute nakwa n’ebe nsọ. Ha na-enyekwara ụmụ Erọn, bụ́ ụmụnne ha, aka n’ozi a na-eje n’ụlọ Jehova.