Joshụa
15 Ala ebo Juda ketara+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ malitere n’ókè ala Ịdọm,+ ya bụ, n’ala ịkpa Zin, ruo ebe Negeb* gwụrụ n’ebe ndịda. 2 N’ebe ndịda, ala ha malitere n’ọnụ mmiri Oké Osimiri Nnu.+ Ọnụ mmiri ahụ dị ebe e si aga n’ebe ndịda. 3 O si ebe ahụ ruo n’ebe ndịda n’ụzọ e si agbago Akrabim,+ garakwa ruo Zin, sikwa n’ebe ndịda ahụ ruo Kedesh-bania,+ na-agakwa ruo Hezrọn. O sikwa ebe ahụ ruo Ada, garakwa ruo Kaka. 4 O ruru Azmọn,+ ruokwa na Ndagwurugwu* Ijipt,+ ma kwụsị n’Oké Osimiri Mediterenian.* Ala a ka ha ketara n’ebe ndịda.
5 N’ebe ọwụwa anyanwụ, ala ha malitere n’Oké Osimiri Nnu ruo ná nsọtụ Osimiri Jọdan. N’ebe ugwu, ọ malitere n’ọnụ mmiri oké osimiri ahụ, ná nsọtụ Osimiri Jọdan,+ 6 gara ruo Bet-họgla,+ ruokwa n’ebe ugwu Bet-araba.+ O sikwa ebe ahụ gara ruo na nkume Bohan,+ nwa Ruben. 7 O ruru Diba, n’ebe Ndagwurugwu Ekọ,+ ruokwa ebe ugwu na Gilgal.+ Gilgal dị ebe e si agbago Adọmịm n’ebe ndịda ndagwurugwu. Ala ha gawakwara ruo na mmiri En-shimesh+ ma kwụsị na En-rogel.+ 8 Ọ gakwaara ruo na Ndagwurugwu Hinọm,+ garakwa ruo ná mkpọda obodo ndị Jebus+ nke dị n’ebe ndịda, ya bụ, Jeruselem.+ Ala ha rukwara n’ugwu dị n’agbata ebe ọdịda anyanwụ Ndagwurugwu Hinọm na ebe Ndagwurugwu Refeyim gwụrụ n’ebe ugwu. 9 O sikwa n’ugwu ahụ ruo n’isi mmiri Neftoa,+ ruokwa n’obodo ndị dị n’Ugwu Ifrọn. O rukwara Beala, ya bụ, Kiriat-jierim.+ 10 O sikwa n’ebe ọdịda anyanwụ Beala ruo n’Ugwu Sia, garakwa ruo ná mkpọda Ugwu Jierim n’ebe ugwu, ya bụ, Kesalọn. Ọ gakwaara ruo Bet-shimesh,+ ruokwa Timna.+ 11 O ruru ná mkpọda Ekrọn+ n’ebe ugwu, ruokwa Shikerọn, gara ruo n’Ugwu Beala, ruokwa Jabniel ma kwụsị n’oké osimiri.
12 N’ebe ọdịda anyanwụ, ala ha kwụsịrị n’Oké Osimiri Mediterenian*+ nakwa n’ala dị n’akụkụ ya. Ebe ndị a niile bụ ókè ala ụmụ Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
13 Jehova gwara Joshụa ka o nye Keleb+ nwa Jefune ala ná mpaghara ebe o nyere ụmụ Juda. Ya enye ya Kiriat-aba (Aba a bụ nna Anak), ya bụ, Hebrọn.+ 14 N’ihi ya, Keleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ n’ebe ahụ.+ Ha bụ, Shishaị, Ahaịman, na Talmaị.+ 15 O sikwa ebe ahụ gaa lụso ndị bi na Diba agha.+ (Ihe a na-akpọbu Diba bụ Kiriat-sifa.) 16 Keleb wee sị: “Onye ọ bụla nke lụsoro Kiriat-sifa agha ma weghara ya, m ga-akpọnye ya Aksa nwa m nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 17 Ọtniel+ nwa Kinaz,+ bụ́ nwanne Keleb, weghaara ya. N’ihi ya, Keleb kpọnyere ya Aksa nwa ya nwaanyị+ ka ọ bụrụ nwunye ya. 18 Mgbe Aksa na-ala ebe di ya, ọ gwara di ya ka ọ rịọta nna ya ala. Aksa wee si n’elu jakị ọ nọ rịtuo.* Keleb jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ?”+ 19 Ya asị: “Biko, nye m onyinye gosiri na ị gọziela m, n’ihi na ọ bụ otu ibé ala nke dị n’ebe ndịda* ka i nyere m. Biko, nyekwuo m Gọlọt-meyim.”* O wee nye ya Gọlọt Mgbago na Gọlọt Ndịda.
20 Ihe a bụ ala e kenyere ebo Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
21 Obodo ndị dị na nsọtụ ebo Juda, n’ebe dị nso n’ókè ha na Ịdọm,+ n’ebe ndịda, bụ Kabzil, Ịda, Jegọ, 22 Kaịna, Dimona, Adeda, 23 Kidesh, Hezọ, Itnan, 24 Zif, Tilem, Bielọt, 25 Hezọ-hadata, na Kiriọt-hezrọn, ya bụ, Hezọ. 26 Obodo ndị ọzọ bụ Emam, Shima, Moleda,+ 27 Heza-gada, Heshmọn, Bet-pelet,+ 28 Heza-shual, Bia-shiba,+ Biziotaya, 29 Beala, Ayịm, Izem, 30 Eltolad, Kisil, Họma,+ 31 Ziklag,+ Madmana, Sansana, 32 Lebeọt, Shilhim, Eyin, na Rimọn.+ Ha dị obodo iri abụọ na itoolu, ha na ógbè ha niile.
33 Obodo ndị dị na Shefila*+ bụ: Eshtaọl, Zora,+ Ashna, 34 Zanoa, En-ganim, Tapua, Ịnam, 35 Jamọt, Adọlam,+ Soko, Azika,+ 36 Shearem,+ Aditem, Gedira na Gederọtem.* Ha dị obodo iri na anọ, ha na ógbè ha niile.
37 Obodo ndị ọzọ bụ Zinan, Hadasha, Migdal-gad, 38 Daịlien, Mizpe, Jọktiel, 39 Lekish,+ Bọzkat, Eglọn, 40 Kabọn, Lamam, Kitlish, 41 Gedirọt, Bet-degọn, Neama, na Makida.+ Ha dị obodo iri na isii, ha na ógbè ha niile.
42 Obodo ndị ọzọ bụ Libna,+ Ịta, Eshan,+ 43 Ịfta, Ashna, Nizib, 44 Kaịla, Akzib, na Marisha. Ha dị obodo itoolu, ha na ógbè ha niile.
45 Obodo ndị ọzọ bụ Ekrọn na ime obodo ndị dị ya nso,* nakwa ógbè ya niile. 46 Obodo ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ Ekrọn bụ obodo niile dị n’akụkụ Ashdọd na ógbè ha niile.
47 Obodo ọzọ bụ Ashdọd+ na ime obodo ndị dị ya nso* nakwa ógbè ya niile. Ọzọ bụ Gaza+ na ime obodo ndị dị ya nso nakwa ógbè ya niile, ruokwa Ndagwurugwu Ijipt, na Oké Osimiri Mediterenian* na obodo dị ya n’akụkụ.+
48 Obodo ndị dị n’ebe bụ́ ugwu ugwu bụ Shemia, Jatia,+ Soko, 49 Dana, Kiriat-sana, ya bụ, Diba. 50 Obodo ndị ọzọ bụ Enab, Eshtemo,+ Enim, 51 Goshen,+ Holọn, na Gaịlo.+ Ha dị obodo iri na otu, ha na ógbè ha niile.
52 Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Ishan, 53 Jenim, Bet-tapua, Afika, 54 Họmta, Kiriat-aba, ya bụ, Hebrọn,+ nakwa Zayọ. Ha dị obodo itoolu, ha na ógbè ha niile.
55 Obodo ndị ọzọ bụ Meyọn,+ Kamel, Zif,+ Jọta, 56 Jezril, Jọkdiam, Zanoa, 57 Keyin, Gibia, na Timna.+ Ha dị obodo iri, ha na ógbè ha niile.
58 Obodo ndị ọzọ bụ Halhọl, Bet-zọọ, Gidọ, 59 Mearat, Bet-enọt, na Eltekọn. Ha dị obodo isii, ha na ógbè ha niile.
60 Obodo ndị ọzọ bụ Kiriat-bel, ya bụ, Kiriat-jierim,+ nakwa Raba. Ha dị obodo abụọ, ha na ógbè ha niile.
61 Obodo ndị dị n’ala ịkpa bụ Bet-araba,+ Midin, Sikeka, 62 Nibshan, Obodo Nnu, na En-gedi.+ Ha dị obodo isii, ha na ógbè ha niile.
63 Ma, ndị Juda achụpụlighị+ ndị Jebus+ bi na Jeruselem.+ Ndị Jebus na ndị Juda bizi na Jeruselem ruo taa.