Abụ Ákwá
א [Alef]
4 Ọlaedo nke na-egbuke egbuke, nke bụ́ ezigbo ọlaedo, agbachuola.+
Nkume dị iche iche dị nsọ+ tọgbọgasị n’ebe niile ụzọ gbara mkpị.+
ב [Bet]
2 Ụmụ Zayọn, bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù, dịbu* ka ọlaedo a nụchara anụcha.
Ma ugbu a, e weere ha ka nnukwu ite ụrọ,
Ya bụ, ọrụ aka ọkpụite.
ג [Gimel]
3 Nkịta ọhịa na-enyedị ụmụ ha ara.
Ma, ndị m* aghọọla ndị obi tara mmiri+ ka enyí nnụnụ nọ n’ala ịkpa.+
ד [Dalet]
4 Ire nwa na-aṅụ ara araparala n’okpo ọnụ ya n’ihi akpịrị na-akpọ ya nkụ.
Ụmụntakịrị na-arịọ ka e nye ha nri,+ ma e nweghị onye na-enye ha.+
ה [Hee]
5 Agụụ emeela ka ndị na-eribu ezigbo nri tụbọọ* n’okporo ámá dị iche iche.+
Ndị na-eyi ákwà dị oké ọnụ kemgbe ha bụ ụmụaka+ na-edinazi n’ikpo ntụ.
ו [Wọọ]
6 Ahụhụ a na-ata ndị m* maka mmehie ha akarịala nke a tara ndị Sọdọm maka mmehie ha.+
E bibiri Sọdọm n’otu ntabi anya. E nweghịkwa onye nyeere ya aka.+
ז [Zayin]
7 Ndị Naziraịt+ nọ na Zayọn dịbu ọcha karịa snoo, na-achabu ọcha karịa mmiri ara ehi.
Ha na-achabu uhie uhie* karịa nkume kọral. Ha na-egbukebu egbuke dị ka nkume safaya.
ח [Het]
8 Ha na-ejizi oji karịa unyì.*
A naghị ama ndị ha bụ n’okporo ámá.
Ha ataala ahụ́, bụrụzie ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+ Ha dịzi ka osisi kpọrọ nkụ.
ט [Tet]
9 Ọ kaara ndị e ji mma agha gbuo mma karịa ndị ụnwụ gburu.+
N’ihi na ezigbo ike na-agwụ ndị ụnwụ ji aka maka na nri adịghịzi, ha eyie ndị e ji ube magbuo.
י [Yod]
10 Ụmụ nwaanyị ndị na-emetaburu mmadụ ebere na-esizi ụmụ ha esi.+
Ha ji ha mere nri* n’oge e bibiri ndị m.*+
כ [Kaf]
11 Jehova egosila na ezigbo iwe ji ya.
Iwe ya dị ka ọkụ na-ere ere.+
O sunyekwala Zayọn ọkụ nke na-erechapụ ntọala ya.+
ל [Lamed]
12 Ndị eze ụwa na ndị niile bi n’elu ala ekwetaghị
Na onye mmegide na onye iro ga-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+
מ [Mem]
13 Ihe a mere n’ihi ihe ndị amụma ya mehiere nakwa n’ihi ihe ndị nchụàjà ya mejọrọ,+
Bụ́ ndị na-egbu ndị ezi omume nọ na ya.+
נ [Nun]
14 Ha na-awagharị n’okporo ámá ka ndị kpuru ìsì.+
Ha ji ọbara merụọ onwe ha.+
Ọ bụ ya mere na e nweghị onye ga-anwa anwa metụ uwe ha aka.
ס [Samek]
15 Ndị mmadụ nọ na-eti mkpu, na-asị ha, “Ndị na-adịghị ọcha, pụọnụ! Pụọnụ! Pụọnụ! Unu emetụla anyị aka!”
Ndị amụma na ndị nchụàjà enweghịzi ebe ha ga-ebi. Ha na-awagharịzi awagharị.
Ndị obodo dị iche iche na-asị: “Ha agaghịzi ebi n’obodo anyị.+
פ [Pee]
Ọ gaghịzi na-ele ha anya ọma.
Ndị mmadụ agaghị na-asọpụrụ ndị nchụàjà.+ Ha agaghịkwa na-emere ndị agadi amara.”+
ע [Ayin]
17 Anyị atụkatala anya ka e nyere anyị aka, anya akpọọ anyị. E nweghị onye nyeere anyị aka.+
Mba anyị nọ na-atụsi anya ike ka ha nyere anyị aka azọpụtalighị anyị.+
צ [Sadee]
18 Ndị iro anyị nọ na-achụgharị anyị ka ha jide anyị,+ nke na anyị enweghịzi ike ịna-agagharị n’okporo ámá anyị.
Oge anyị ga-anwụ eruola. Ụbọchị anyị agwụla, n’ihi na oge ọnwụ anyị eruola.
ק [Kof]
19 Ndị na-achụ anyị na-efe ọsọ karịa ugo.+
Ha chụrụ anyị ọsọ n’elu ugwu, chechiekwa anyị n’ala ịkpa.
ר [Resh]
20 Ọ bụ ná nnukwu olulu ha ka ha jidere+ onye Jehova tere mmanụ,+ onye dị ka ume anyị na-eku.
Anyị kwukwara gbasara ya, sị: “Ọ bụ ya ga na-echebe anyị ná mba dị iche iche anyị bi.”
ש [Sin]
21 Ịdọm* nke dị n’ala Ọz, ṅụrịwa ọṅụ.+ Obi tọwakwa gị ụtọ.
Ma, a ga-enye gị iko na-egosi na a ga-ebibi gị.+ Mmanya ga na-egbu gị. Ị ga-agbakwa onwe gị ọtọ.+
ת [Tọọ]
22 Zayọn,* ahụhụ a na-ata gị maka mmehie gị agwụla.
E nweghị onye ga-adọrọ gị n’agha ọzọ.+
Ma Ịdọm,* Chineke ga-elebara mmehie gị anya.
Ọ ga-agba mmehie gị n’anwụ.+