Ilu
26 Otú ahụ snoo na-ekwesịghị ịda n’oge okpomọkụ, nakwa otú ahụ mmiri na-ekwesịghị izo n’oge a na-ewe ihe ubi,
Ka a na-ekwesịghị ịkwanyere onye nzuzu ùgwù.+
2 A naghị abụ mmadụ ọnụ ma ọ bụrụ na e nweghị ezigbo ihe kpatara ya,*
Otú ahụ nnụnụ na elekentịọba na-anaghị efeli ma ọ bụrụ na e nweghị ihe kpatara ya.
3 E mere apịpịa maka ịnyịnya, mee ihe e ji achịkwa anụ maka jakị,+
Ma e mere ụtarị maka azụ ndị nzuzu.+
6 Onye na-enyefe onye nzuzu ihe n’aka
Dị ka onye na-egbupụ onwe ya ụkwụ ma na-emerụ onwe ya ahụ́.
7 Otú ahụ onye na-ete ụkwụ na-enweghị ike ịga ije nke ọma
Ka onye nzuzu na-enweghị ike ịtụ ezigbo ilu.+
9 Ilu onye nzuzu na-atụ
Dị ka ahịhịa ogwu onye aṅụrụma ji n’aka.
10 Onye na-ego onye nzuzu ma ọ bụkwanụ ndị na-agafe agafe ọrụ
Dị ka onye na-agba ụta nke ji ụta ya na-agba ihe ọ bụla ọ hụrụ.*
12 Ụfọdụ ndị chere na ha ma ihe.+
Ma ọ dị mfe inyere onye nzuzu aka karịa inyere ụdị ndị ahụ aka.
13 Onye umengwụ na-asị: “Ọdụm nọ n’ụzọ!
Ọdụm nọ n’ámá obodo!”+
16 Onye umengwụ na-eche na ya ma ihe
Karịa mmadụ asaa ndị na-aza ihe bara uru.
17 Ọ bụrụ na mmadụ na-agafe agafe wee malite iwe oké iwe maka esemokwu na-agbasaghị ya,
O yiri onye jidesiri nkịta aka ná ntị ike.+
18 Onye ara na-agbapụ akụ́ ụta na-ere ọkụ nakwa akụ́ nke na-atụgbu mmadụ.
19 Ọ bụ otú ahụ ka onye ghọrọ onye agbata obi ya aghụghọ, ma sị ya na ọ bụ egwuregwu, dị.+
20 Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ.
Ọ bụrụkwa na e nweghị onye na-ekwutọ mmadụ, esemokwu na-akwụsị.+
21 Otú ahụ icheku ọkụ na-eme ka ọkụ na-eke, nkụ ana-emekwa ka ọkụ na-enwu,
Ka onye okwu na ụka na-eme ka esemokwu malite.+
22 Okwu onye na-ekwutọ mmadụ dị ka nri na-atọ ụtọ.
A na-elo ya ngwa ngwa, ya abanye n’afọ.+
24 Onye kpọrọ ndị ọzọ asị na-ekwu okwu ọma iji mee ka a ghara ịmata ihe dị ya n’obi,
Ma ihe juru ya obi bụ aghụghọ ọ ga-aghọ.
25 N’agbanyeghị na ọ na-ekwu okwu ọma, atụkwasịla ya obi,
N’ihi na ihe asaa jọgburu onwe ha dị ya n’obi.*
26 N’agbanyeghị na o ji aghụghọ na-eme ka a ghara ịma na ọ kpọrọ ndị ọzọ asị,
A ga-eme ka ndị mmadụ mata ihe ọjọọ ọ na-eme.
27 Onye na-egwu olulu ga-adaba na ya.
Onye na-akwapụ nkume, nkume ahụ ga-alaghachi dakwasị ya.+