Ọpụpụ
1 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke Izrel mụrụ, ya bụ, ndị so ya* bịa n’Ijipt, onye ọ bụla n’ime ha kpọ ezinụlọ ya bịa:+ 2 Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda;+ 3 Ịsaka, Zebulọn, na Benjamin; 4 Dan na Naftalaị; Gad na Asha.+ 5 Ndị* niile a mụụrụ Jekọb dị mmadụ* iri asaa. Ma Josef nọ anọ n’Ijipt.+ 6 Josef mechara nwụọ,+ ụmụnne ya niile na ọgbọ ahụ niile nwụkwara. 7 Ndị Izrel wee na-amụ ụmụ, malitekwa ịdị ọtụtụ. Ha nọkwa na-amụba n’ike n’ike ma na-esikwu nnọọ ike, nke mere na ha juru ebe niile n’ala ahụ.+
8 Ka oge na-aga, eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt. 9 O wee gwa ndị obodo ya, sị: “Lee, ndị Izrel ka anyị dị ọtụtụ, ha dịkwa ike karịa anyị.+ 10 Ka anyị gosi ha na anyị ma ihe. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga na-amụba. Ọ bụrụkwa na agha adaa, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha ma si n’obodo a laa.”
11 Ha họpụtaziri ndị isi ga na-amanye ha ịrụ ọrụ ike ma na-emegbu ha.+ Ha manyekwara ha ịrụrụ Fero obodo ndị a ga na-akwakọba ihe na ha, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+ 12 Ma ọ na-abụ ha na-emegbukwu ha, ha ana-amụbakwu ma na-agbasakwu n’ebe niile, nke mere na oké ụjọ jidere ha n’ihi ndị Izrel.+ 13 N’ihi ya, ndị Ijipt ji ndị Izrel mere ndị ohu, na-echikwa ha ọnụ n’ala.+ 14 Ha ji ọrụ ike ha na-amanye ha ịrụ mee ka ndụ kwụsị ịtọ ha ụtọ, na-amanye ha ịgwọ ájá ụrọ na ịkpụ brik, meekwa ka ha na-arụ ụdị ọrụ ike dị iche iche n’ubi. N’eziokwu, ha na-echi ha ọnụ n’ala ma na-eme ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.+
15 Mgbe e mechara, eze Ijipt gwara ụmụ nwaanyị Hibru na-aghọ́ nwa okwu. Aha ha bụ Shifra na Pua. 16 Ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-enyere ụmụ nwaanyị Hibru aka ịmụ nwa,+ leruonụ anya mgbe nwa ha na-apụta,* ọ bụrụ nwa nwoke, gbuonụ ya. Ma, ọ bụrụ nwa nwaanyị, hapụnụ ya ndụ.” 17 Ma, ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa na-atụ egwu ezi Chineke. Ha emeghị ihe eze Ijipt gwara ha. Kama, ha na-ahapụ ụmụ nwoke ndụ.+ 18 Ka oge na-aga, eze Ijipt kpọrọ ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa, sị ha: “Gịnị mere unu ji ahapụ ụmụ nwoke ndụ?” 19 Ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa gwara Fero, sị: “Ụmụ nwaanyị Hibru adịghị ka ụmụ nwaanyị Ijipt. Ha gbasiri ike. Ha na-amụcha nwa tupu nwaanyị na-aghọ́ nwa abịakwute ha.”
20 Chineke wee meere ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa ihe ọma. Ndị Izrel nọkwa na-amụba ma na-esikwu nnọọ ike. 21 Chineke mechara mee ka ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa nwee ezinụlọ nke ha n’ihi na ha na-atụ egwu ya. 22 N’ikpeazụ, Fero nyere ndị obodo ya niile iwu, sị: “Tụbanụ nwa nwoke ọ bụla ndị Hibru mụrụ ọhụrụ n’osimiri Naịl, ma hapụnụ nwa nwaanyị ọ bụla ndụ.”+