Emọs
9 Ahụrụ m Jehova+ ka ọ nọ n’elu ebe ịchụàjà, sị: “Tie ihe n’isi ogidi ji ụlọ, ụlọ ahụ ga-amakwa jijiji. Kụpụ isi ogidi ahụ, m ga-ejikwa mma agha gbuo onye fọdụrụ n’ime ha. O nweghị onye n’ime ha ga-agbapụ. O nweghịkwa onye chọrọ ịgbapụ ga-agbalaga.+
Ọ bụrụkwa na ha agaa eluigwe,
M ga-esi ebe ahụ chụda ha.
Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri ka m ghara ịhụ ha,
M ga-agwa agwọ ka ọ taa ha n’ebe ahụ.
M ga-eme ka anya m dị n’ebe ha nọ iji mee ha ihe ọjọọ, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+
Ọ ga-etokwa ka Osimiri Naịl,
Talatakwa ka Osimiri Naịl dị n’Ijipt.+
Onye na-arụ ụzọ e si aga n’eluigwe,
Na-arụkwa ihe o ji ekpuchi ụwa,
Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta,
Ka ọ wụsa ya n’elu ala.’+
7 ‘Ndị Izrel, ọ̀ bụ na unu adịghị ka ụmụ Kush n’anya m?’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
‘Ọ̀ bụ na esighị m n’Ijipt kpọpụta Izrel,+
Si na Krit kpọpụta ndị Filistia,+ sikwa na Kia kpọpụta Siria?’+
8 ‘Anya Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ele alaeze na-eme mmehie.
Ọ ga-ekpochapụkwa ya n’elu ala.+
Ma, ọ gaghị ekpochapụ ndị si n’ezinụlọ Jekọb kpamkpam.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
9 ‘N’ihi na m na-enye iwu
Ka a chụsasịa ndị Izrel ná mba niile,+
Si otú ahụ yọgharịa ha otú mmadụ si ayọgharị myọ,
Ma, otu obere okwute agaghị ada n’ala.
10 A ga-eji mma agha gbuo ndị m niile na-eme mmehie,
Ndị na-asị: “Ọdachi agaghị abịaru anyị nso ma ọ bụ rute anyị.”’
M ga-arụzi ebe ndị e bibiri ebibi na ya.
M ga-arụghachi ha ka ha dịrị otú ha dị ọtụtụ afọ gara aga,+
12 Ka ndị m weghara ihe fọdụrụ n’Ịdọm,+
Wegharakwa mba niile na-aza aha m.’ Ọ bụ Jehova, onye na-eme ihe a, kwuru ya.
13 Jehova kwukwara, sị, ‘Oge na-abịa
Mgbe ọ ga-abụ, tupu e wechaa ihe niile dị n’ubi, oge e ji akọ ihe ga-eru.
Tupu a zọchaa mkpụrụ vaịn niile, oge e ji agha mkpụrụ ga-eru.+
Mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu ukwu na-atapụta.+
Ugwu nta niile ga na-agbapụtakwa mmanya.*+
14 M ga-akpọlata ndị m Izrel a dọọrọ n’agha.+
Ha ga-arụzikwa obodo ndị tọgbọ chakoo ma biri n’ime ha.+
15 ‘M ga-akụ ha n’ala ha dị ka mkpụrụ.
A gaghị efopụkwa ha ọzọ
N’ala ha nke m nyere ha.’+ Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu kwuru ihe a.”