Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 11
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Unu ahụla otú Jehova si dị ukwuu (1-7)

      • Otú Ala Nkwa ahụ dị (8-12)

      • Uru irube isi ga-abara ndị Izrel (13-17)

      • Ndị Izrel kwesịrị ime ka okwu Chineke bamie n’obi ha (18-25)

      • ‘Ngọzi na ọbụbụ ọnụ’ (26-32)

Diuterọnọmi 11:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 6:5; 10:12; Mk 12:30

Diuterọnọmi 11:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 8:5; Hib 12:6
  • +Ọp 13:3
  • +Di 5:24; 9:26

Diuterọnọmi 11:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:34

Diuterọnọmi 11:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “bibie ha ruo taa.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 14:23, 28; Hib 11:29

Diuterọnọmi 11:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ihe o mere.”

Diuterọnọmi 11:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 16:1, 32

Diuterọnọmi 11:9

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mkpụrụ.”

  • *

    Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:40; Ilu 3:1, 2
  • +Je 13:14, 15; 26:3; 28:13
  • +Ọp 3:8; Ezi 20:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/1/2007, p. 29

Diuterọnọmi 11:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “unu ejiri ụkwụ unu na-agba ya mmiri.” O nwere ike ịbụ na e nwere ihe a rụrụ arụ ọ na-abụ ha na-azọ ya ụkwụ, mmiri ana-agbapụta, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-egwu ọwa mmiri ndị mmiri na-esi asọba n’ubi.

Diuterọnọmi 11:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 1:7
  • +Di 8:7

Diuterọnọmi 11:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/1/2007, p. 29

Diuterọnọmi 11:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

  • *

    Na Hibru, “na-ejere ya ozi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:29; 6:5; 10:12; Mt 22:37

Diuterọnọmi 11:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:4; Di 8:7-9; 28:12; Jer 14:22

Diuterọnọmi 11:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 8:10

Diuterọnọmi 11:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “obi unu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 8:19; 29:18; Hib 3:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    6/2019, p. 3-4

Diuterọnọmi 11:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:15, 23; 1Ez 8:35, 36; 2Ih 7:13, 14
  • +Di 8:19

Diuterọnọmi 11:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

  • *

    Na Hibru, “n’agbata anya unu abụọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 7:1-3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Mmezu Mkpughe, p. 197

    Ụlọ Nche,

    6/1/1998, p. 20

    Obi Ụtọ Ezinụlọ, p. 70-71

Diuterọnọmi 11:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 6:6-9; Ilu 22:6; Efe 6:4

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    3/2023, p. 21-23

    Obi Ụtọ Ezinụlọ, p. 70-71

    Ụlọ Nche,

    5/1/1995, p. 10

Diuterọnọmi 11:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:40; Ilu 4:10
  • +Je 13:14, 15

Diuterọnọmi 11:22

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “raparakwa ya n’ahụ́.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 6:5; Lu 10:27
  • +Di 10:20; 13:4; Jos 22:5

Diuterọnọmi 11:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:28; Jos 3:10
  • +Di 7:1; 9:1, 5

Diuterọnọmi 11:24

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 14:9
  • +Je 15:18; Ọp 23:31

Diuterọnọmi 11:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 7:24; Jos 1:5
  • +Ọp 23:27; Jos 2:9, 10; 5:1

Diuterọnọmi 11:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 30:15

Diuterọnọmi 11:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:1, 2; Ọm 19:8, 11

Diuterọnọmi 11:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:15, 16; Aịz 1:20

Diuterọnọmi 11:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 27:12, 13; Jos 8:33, 34

Diuterọnọmi 11:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 12:6

Diuterọnọmi 11:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 1:11

Diuterọnọmi 11:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 5:32; 12:32

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 11:1Di 6:5; 10:12; Mk 12:30
Diut. 11:2Di 8:5; Hib 12:6
Diut. 11:2Ọp 13:3
Diut. 11:2Di 5:24; 9:26
Diut. 11:3Di 4:34
Diut. 11:4Ọp 14:23, 28; Hib 11:29
Diut. 11:6Ọg 16:1, 32
Diut. 11:9Di 4:40; Ilu 3:1, 2
Diut. 11:9Je 13:14, 15; 26:3; 28:13
Diut. 11:9Ọp 3:8; Ezi 20:6
Diut. 11:11Di 1:7
Diut. 11:11Di 8:7
Diut. 11:13Di 4:29; 6:5; 10:12; Mt 22:37
Diut. 11:14Le 26:4; Di 8:7-9; 28:12; Jer 14:22
Diut. 11:15Di 8:10
Diut. 11:16Di 8:19; 29:18; Hib 3:12
Diut. 11:17Di 28:15, 23; 1Ez 8:35, 36; 2Ih 7:13, 14
Diut. 11:17Di 8:19
Diut. 11:18Ilu 7:1-3
Diut. 11:19Di 6:6-9; Ilu 22:6; Efe 6:4
Diut. 11:21Di 4:40; Ilu 4:10
Diut. 11:21Je 13:14, 15
Diut. 11:22Di 6:5; Lu 10:27
Diut. 11:22Di 10:20; 13:4; Jos 22:5
Diut. 11:23Ọp 23:28; Jos 3:10
Diut. 11:23Di 7:1; 9:1, 5
Diut. 11:24Jos 14:9
Diut. 11:24Je 15:18; Ọp 23:31
Diut. 11:25Di 7:24; Jos 1:5
Diut. 11:25Ọp 23:27; Jos 2:9, 10; 5:1
Diut. 11:26Di 30:15
Diut. 11:27Di 28:1, 2; Ọm 19:8, 11
Diut. 11:28Le 26:15, 16; Aịz 1:20
Diut. 11:29Di 27:12, 13; Jos 8:33, 34
Diut. 11:30Je 12:6
Diut. 11:31Jos 1:11
Diut. 11:32Di 5:32; 12:32
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 11:1-32

Diuterọnọmi

11 “Hụnụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-emenụ ihe ndị unu kwesịrị imere ya, na-edebenụ iwu ya, na-emekwanụ ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme mgbe niile. 2 O doro unu anya taa na ọ bụ ununwa ka m na-agwa, ọ bụghị ụmụ unu ndị na-amaghị otú Jehova bụ́ Chineke unu si adọ mmadụ aka ná ntị,+ ndị na-ahụbeghịkwa aka ya siri ike,+ ike ya,+ na otú o si dị ebube. 3 Ha ahụghị ihe àmà ya na ihe ndị o mere Fero eze Ijipt nakwa ala Ijipt ya niile+ 4 ma ọ bụ ihe o mere ndị agha Ijipt nakwa ịnyịnya Fero na ụgbọ ịnyịnya agha ya ndị mmiri Oké Osimiri Uhie riri mgbe ha na-achụ unu ọsọ, Jehova wee bibie ha kpamkpam.*+ 5 Ha ahụghị ihe o meere* unu n’ala ịkpa ruo mgbe unu bịarutere ebe a 6 ma ọ bụ ihe o mere Detan na Abaịram bụ́ ụmụ Elayab nwa Ruben, mgbe ala meghere loo ha na ezinụlọ ha na ụlọikwuu ha nakwa ihe niile dị ndụ ha na ha nọ, n’ihu ndị Izrel niile.+ 7 Unu ejirila anya unu hụ oké ihe niile Jehova mere.

8 “Debenụ iwu niile m na-enye unu taa, ka unu wee dị ike ma banye n’ala ahụ weghara ya, 9 nakwa ka unu wee bitee aka+ n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà na ụmụ* ha,+ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+

10 “Ala ahụ unu na-aga iweghara adịghị ka ala Ijipt unu si pụta, bụ́ ebe ọ na-abụ unu ghaa mkpụrụ, unu ana-arụgbu onwe unu n’ọrụ na-agba ya mmiri,* otú e si agba ubi akwụkwọ nri mmiri. 11 Kama ala unu na-abanye iweghara bụ ala ugwu na ndagwurugwu juru na ya.+ Mmiri na-esikwa n’eluigwe ede ya.+ 12 Ọ bụ ala Jehova bụ́ Chineke unu na-elekọta. Anya Jehova bụ́ Chineke unu dị na ya mgbe niile, si ná mmalite afọ ruo ná ngwụcha afọ.

13 Ọ bụrụ na unu agbasie mbọ ike na-erube isi n’iwu ndị m na-enye unu taa wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya ma jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile na-efe ya,*+ 14 m ga-emekwa ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya, ma n’ụbịa mmiri ma n’ụla mmiri. Unu ga-ekpokọta ọka* unu, bubatakwa mmanya ọhụrụ unu na mmanụ unu.+ 15 M ga-eme ka ahịhịa na-epu n’ala unu maka anụ ụlọ unu. Unu ga-erikwa ihe rijuo afọ.+ 16 Kpacharanụ anya ka unu ghara ikwe ka a rata unu* ka unu mehie, unu ewee fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala.+ 17 Ọ bụrụ na unu efee ha, Jehova ga-ewesa unu ezigbo iwe. Ọ ga-emechi eluigwe ka mmiri ghara izo,+ ala agaghịkwa emepụta ihe. Unu ga-anwụkwa ọsọ ọsọ n’ezigbo ala ahụ Jehova na-enye unu.+

18 “Meenụ ka okwu ndị a m na-agwa unu bamie n’obi unu nakwa ná mkpụrụ obi* unu. Keekwanụ ha n’aka unu ka unu wee na-echeta ha. Ha ga-adị ka ihe unu na-ekegide n’egedege ihu unu.*+ 19 Kụzierenụ ha ụmụ unu. Na-ekwunụ banyere ha mgbe unu nọ ọdụ n’ụlọ unu na mgbe unu na-aga ije n’okporo ụzọ na mgbe unu dina ala nakwa mgbe unu biliri ọtọ.+ 20 Deenụ ha n’awara ụzọ ụlọ unu nakwa n’ọnụ ụzọ ámá unu, 21 ka unu na ụmụ unu wee bitee aka+ n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà,+ n’oge niile ụwa dị n’okpuru eluigwe.

22 “Ọ bụrụ na unu elezie anya na-edebe iwu a m na-enye unu ma na-eme ya, ka unu wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-eme ihe niile o kwuru, gharakwa ịhapụ ya,*+ 23 Jehova ga-achụpụrụ unu mba ndị a niile,+ unu ga-anapụkwa mba ndị dị ukwuu ma dị ọtụtụ karịa unu ala ha.+ 24 Ebe ọ bụla unu zọrọ ụkwụ ga-abụ nke unu.+ Ókè unu ga-amalite n’ala ịkpa ruo Lebanọn, malite n’Osimiri, ya bụ, Osimiri Yufretis, ruo n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.*+ 25 E nweghị onye ga-anọchiri unu ụzọ.+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ụjọ unu na egwu unu jide ndị bi n’ala niile unu ga-aga na ha,+ otú o kwere unu ná nkwa.

26 “Taa, e nwere ihe abụọ m chọrọ ka unu họrọ otu n’ime ha. Otu bụ ka a gọzie unu, nke ọzọ abụrụ ka a bụọ unu ọnụ:+ 27 a ga-agọzi unu ma unu rube isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu nke m na-enye unu taa.+ 28 A ga-abụ unu ọnụ ma ọ bụrụ na unu erubeghị isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu,+ ghara ime ihe m na-agwa unu taa ka unu na-eme ma fewe chi ọzọ ndị unu na-amaghị.

29 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọba unu n’ala ahụ unu na-aga ibi na ya, ọ bụ n’Ugwu Gerizim ka unu ga-anọ gọzie ndị Izrel, nọrọ n’Ugwu Ịbal bụọ ndị Izrel ọnụ.+ 30 Ọ̀ bụ na ugwu ndị ahụ adịghị n’akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Jọdan, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ala ndị Kenan ndị bi n’Araba, n’ebe chere Gilgal ihu, n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na More?+ 31 N’ihi na unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu banye weghara ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.+ Mgbe unu ga-eweghara ya ma biri na ya, 32 lezienụ anya ka unu soro ntụziaka na iwu niile m na-enye unu taa.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya