Aịzaya
2 N’eziokwu, ọ bụ ajọ omume unu na-ekewa unu na Chineke unu.+
Ọ bụ mmehie unu mere o ji zooro unu ihu ya.
Ọ bụkwa ya mere ka ọ ghara ige unu ntị.+
3 N’ihi na ọbụ aka unu bụ ọbara ọbara.+
Mkpịsị aka unu bụkwa mmehie mmehie.
Unu ji egbugbere ọnụ unu agha ụgha,+ jirikwa ọnụ* unu na-ekwu ihe na-adịghị mma.
4 Ọ dịghị onye na-ekwusi okwu ike ka a na-eme ezi omume.+
Ọ dịghịkwa onye na-ekwu eziokwu n’ụlọikpe.
Ha na-atụkwasị obi n’ihe na-enweghị ihe ọ bụ,+ na-ekwukwa ihe na-abaghị uru ọ bụla.
Ha atụrụla ime nsogbu, mụọkwa ihe ọjọọ.+
5 Ha na-abụ àkwá agwọ ọjọọ.
Ha na-akpakwa ọnyà ududo.+
Onye ọ bụla nke riri àkwá agwọ ọjọọ ahụ ga-anwụ.
Ajụala ga-esikwa n’àkwá ya kụwara akụwa pụta.
6 Ọnyà ududo ha agaghị abụrụ ha uwe.
Ha agaghịkwa eji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.+
Ọrụ ha bụ ọrụ ọjọọ.
E jikwa tigbuo zọgbuo mara ha.+
7 Ha* na-agba ọsọ aga ime ihe ọjọọ.
Ha na-emekwa ngwa ngwa ka ha gbuo ndị aka ha dị ọcha.+
Ihe niile ha na-eche bụ echiche ọjọọ.
Ha na-emebisị ihe ndị mmadụ ma na-echi ha ọnụ n’ala.+
8 Ha amaghị otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo.
Ha anaghị ekpe ikpe ziri ezi.+
Ha na-eme ka okporo ụzọ ha niile gbagọọ agbagọ.
Udo agaghị adịrị onye ọ bụla na-eje ije na ha.+
9 Ọ bụ ya mere ikpe ziri ezi ji dị anya n’ebe anyị nọ,
Ezi omume anaghịkwa erute n’ebe anyị nọ.
Anyị na-ele anya ìhè, ma, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.
Anyị na-ele anya ka ebe niile nwuo gbaa, ma, anyị na-ejegharị n’ọchịchịrị.+
10 Anyị na-asọgharị ìsì ná mgbidi ka ndị ìsì.
Anyị na-asọgharịkwa ìsì ka ndị na-enweghị anya.+
Anyị na-akpọ ụkwụ n’ihe n’etiti ehihie dị ka à ga-asị na chi ejiela.
Anyị na-adị ka ndị nwụrụ anwụ ma anyị nọrọ ebe ndị siri ike nọ.
11 Anyị niile na-asụ ude ka anụ ọhịa bea.
Anyị na-eru uju, na-ebe ubé ka nduru.
Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma, ọ bụ n’efu.
Anyị na-elekwa anya ka a zọpụta anyị, ma a zọpụtaghị anyị.
12 N’ihi na anyị enupụrụla gị isi ọtụtụ mgbe.+
Mmehie ọ bụla anyị mere na-agba akaebe na ikpe mara anyị.+
Anyị ma ihe anyị mejọrọ.
Anyị makwa mmehie anyị nke ọma.+
13 Anyị emebiela iwu, gọnahụkwa Jehova.
Anyị agbakụtala Chineke anyị azụ.
Anyị akpaala nkata imegbu ibe anyị na inupụ isi.+
Anyị echeela echiche ịgha ụgha, ghaakwa ya n’obi anyị.+
Eziokwu* adịghị n’ámá anyị.
Ihe dị mma anaghịkwa abatali na ya.
A na-akwakọrọkwa ihe onye ọ bụla na-esoghị na-eme ihe ọjọọ.
16 Ọ hụrụ na e nweghị onye na-enyere ha aka.
O jukwara ya anya na e nweghị onye na-agbachitere ha.
N’ihi ya, o ji aka ya zọpụta ha.*
Ezi omume ya nyekwaara ya aka.
18 Ọ ga-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ihe ha mere.+
Ọ ga-ewesa ndị na-emegide ya iwe, kwụọkwa ndị iro ya ụgwọ.+
Ọ ga-akwụ ndị bi n’agwaetiti ụgwọ kwesịịrị ha.
19 Ndị nọ n’ebe ọdịda anyanwụ ga-ebido ịtụ egwu aha Jehova.
Ndị nọkwa n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-ebido ịtụ ebube ya egwu.
N’ihi na Jehova ga-abịa ka osimiri na-asọsi ike,
Nke mmụọ ya mere ka ọ na-asọ.
20 Jehova kwuru, sị, “Onye Mgbapụta+ ga-abịa na Zayọn.+
Ọ ga-abịakwute ndị ezinụlọ Jekọb ndị na-anaghịzi emebi iwu.”+
21 Jehova kwuru, sị, “Ihe a bụ ndụ mụ na ha gbara.+ Mmụọ m nke dị n’ime gị nakwa okwu m nke m tinyere n’ọnụ gị agaghị apụ n’ọnụ gị, n’ọnụ ụmụ* gị, ma ọ bụ n’ọnụ ụmụ ụmụ gị,* malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.