Emọs
5 “Ndị Izrel, nụrụnụ ihe a m ji abụ iru uju na-agwa unu:
Ọ gaghị ebiliteli ọzọ.
A gbahapụla ya n’ala ya.
O nweghị onye ga-ekulite ya.’
3 “N’ihi na ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru:
‘Otu narị ndị agha ga-afọdụrụ obodo chị otu puku ndị agha gaa agha.
Ọ bụkwa ndị agha iri ga-afọdụrụ obodo chị otu narị ndị agha gaa agha. Ihe a ga-eme ndị Izrel.’+
4 “N’ihi na Jehova gwara ndị Izrel, sị:
‘Chọọnụ m ka unu wee dịrị ndụ.+
Unu agakwala Gilgal+ ma ọ bụ banye Bia-shiba,+
N’ihi na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ịdọrọ Gilgal n’agha.+
Betel agaghịzikwa adị.*
6 Chọọnụ Jehova, ka unu wee dịrị ndụ,+
Ka ọ ghara irepịa ndị si n’ezinụlọ Josef otú ọkụ si erepịa ihe,
Repịakwa Betel n’enweghị onye ga-emenyụ ya.
7 Unu na-eme ka ikpe ziri ezi ghọọ ahịhịa na-elu ilu.
O nweghịkwa ihe unu ji ezi omume kpọrọ.+
8 Jehova bụ aha Onye kere ìgwè kpakpando Kaịma*
Onye na-agbanwe oké ọchịchịrị ka ọ ghọọ ụtụtụ,+
Onye mere ehihie ka ọ gbaa ọchịchịrị dị ka abalị,
Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta
Ka ọ wụsa ya n’elu ala.+
9 Ọ ga-eme ka e bibie onye siri ike n’otu ntabi anya,
Bibiekwa ebe ndị a rụsiri ike.
10 Ha kpọrọ ndị na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị n’ọnụ ụzọ ámá obodo asị.
Ha kpọkwara ndị na-ekwu eziokwu asị.+
11 N’ihi na unu na-achọ ka ogbenye nye unu ego maka ubi.*
Unu na-anarakwa ya ọka* ka ọ bụrụ ụtụ ọ tụrụ.+
Unu agaghị anọgide na-ebi n’ụlọ unu ji nkume a wara awa rụọ.+
Unu agaghịkwa aṅụ mmanya si n’ubi vaịn unu ndị mara mma.+
12 N’ihi na ama m ugboro ole unu nupụrụ isi*
Nakwa otú mmehie unu jọruru ná njọ.
Unu na-enye ndị ezi omume nsogbu.
Unu na-anara aka azụ.*
Unu anaghịkwa ekwe ka ndị ogbenye nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo nweta ihe ruuru ha.+
Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha ga-anọnyekwara unu,
Otú unu kwuru na ọ na-eme.+
15 Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya.+
Kpeekwanụ ikpe ziri ezi n’ọnụ ụzọ ámá obodo.+
Ikekwe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha
Ga-emere ndị fọdụrụ n’ụlọ Josef amara.’+
16 “N’ihi ya, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Jehova, kwuru, sị:
‘A ga na-eti mkpu arịrị n’ámá niile.
Ha ga na-etikwa n’okporo ámá niile, sị: “Ewoo, ewoo!”
Ha ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha ruo uju,
Gookwa ndị ọrụ ha bụ ibe ákwá ka ha bee ákwá arịrị.’
17 Jehova kwukwara, sị, ‘A ga na-eti mkpu arịrị n’ubi vaịn ọ bụla,+
N’ihi na m ga-esi n’etiti unu gafee.’
18 ‘Ndị agụụ ụbọchị Jehova na-agụsi ike ga-ata ahụhụ.+
Gịnị ka unu na-atụ anya ga-eme n’ụbọchị Jehova?+
Ọ ga-abụ ụbọchị ọchịchịrị, ọ bụghị ụbọchị ìhè.+
19 Ọ ga-adị ka mgbe ọdụm na-achụ mmadụ ọsọ, onye ahụ ana-agba zute anụ ọhịa bea.
Mgbe ọ gbabakwara n’ụlọ ya tụkwasị aka n’ahụ́ ụlọ, agwọ ataa ya.
20 Ọ̀ bụ na ụbọchị Jehova agaghị abụ ọchịchịrị, kama ịbụ ìhè?
Ọ̀ bụkwa na itiri agaghị agba na ya, kama ìhè ịdị?
21 Akpọrọ m ememme niile unu asị. Ha na-asọ m oyi.+
Ísì anụ unu na-achụ n’àjà ná nzukọ ukwu unu anaghị amasị m.
22 Ọ bụrụgodị na unu achụọrọ m àjà a na-esucha ọkụ, nyekwa m onyinye,
Ha agaghị atọ m ụtọ,+
M gaghịkwa anabata àjà udo unu ji anụ gbara agba na-achụ.+
23 Kwụsịnụ ịbụ abụ unu ji na-eme mkpọtụ.
Ka m gharakwa ịnụ ụda egwú dị ụtọ unu ji ụbọ akwara unu na-akpọ.+
25 Ndị Izrel, ò nwere mgbe unu chụụrụ m àjà
Ma ọ bụ nye m onyinye n’afọ iri anọ unu nọrọ n’ala ịkpa?+
26 Ugbu a, unu ga-eburu Sakọt bụ́ eze unu pụọ, burukwa Kaịwan.*
Ihe ndị a bụ arụsị ndị unu mere, bụrụkwa chi kpakpando, ndị unu meere onwe unu.
27 M ga-emekwa ka a dọrọ unu n’agha gaa n’ebe dị anya karịa Damaskọs.’+ Onye aha ya bụ Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha,+ kwuru ihe a.”