Ezikiel
6 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu n’ugwu niile dị n’Izrel ma buo amụma ihe a ga-eme ha. 3 Sị ha, ‘Ugwu niile dị n’Izrel, nụrụnụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ugwu ukwu na ugwu nta na ọwa mmiri niile na ndagwurugwu niile, sị: “M ga-eji mma agha laa unu n’iyi. M ga-ebibikwa ebe ndị dị elu n’obodo unu. 4 A ga-akwada ebe ịchụàjà unu, gbajisịakwa ihe unu ji adọsa insens.+ M ga-emekwa ka ndị unu e gburu egbu daa n’ihu arụsị unu niile na-asọ oyi.*+ 5 M ga-atọgbọ ozu ununwa bụ́ ndị Izrel n’ihu arụsị unu niile na-asọ oyi. M ga-atụsasịkwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụàjà unu.+ 6 A ga-ala ma obodo niile unu bi ma ebe niile unu bi n’iyi.+ A ga-akwadakwa ebe ndị dị elu dị n’obodo unu. Ha ga-atọgbọrọkwa nkịtị.+ A ga-akwadakwa ebe ịchụàjà unu, kụrisịakwa ha. Arụsị unu niile na-asọ oyi ga-alakwa n’iyi. A ga-agbajisịkwa ihe unu ji adọsa insens, bibiekwa ihe unu ji aka unu rụọ. 7 Ndị e gburu egbu ga-adakwa n’obodo unu.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.+
8 “‘“Ma m ga-eme ka e nwee ndị ga-afọdụ n’ime unu, ndị a na-agaghị eji mma agha gbuo mgbe unu nọ ná mba dị iche iche a ga-achụsasị unu.+ 9 Ndị unu a na-egbughị ga-echeta m ná mba niile a dọọrọ ha n’agha laa.+ Ha ga-aghọta na ezigbo iwe ji m maka na ha hapụrụ m,* gbakụta m azụ,+ na-achọkwa ka ha na arụsị ha niile na-asọ oyi kwaa iko.+ Ihere onwe ha ga-eme ha n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere nakwa n’ihi arụ niile ha kpara.+ 10 Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova nakwa na ọ bụghị égbè ọnụ ka m na-agba mgbe m kwuru na m ga-eme ka ọdachi a dakwasị ha.”’+
11 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Buru aka n’isi* ma zọsie ụkwụ ike n’ala iji gosi na obi adịghị gị mma maka ihe ọjọọ niile ndị Izrel mere na arụ niile ha kpara nakwa n’ihi na a ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe gbuo ha.+ 12 Ọrịa na-efe efe ga-egbu onye nọ n’ebe dị anya. A ga-eji mma agha gbuo onye nọ nso. Ụnwụ ga-egbukwa onye ihe ndị ahụ na-egbughị. M ga-ewesa ha ezigbo iwe.+ 13 Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova,+ mgbe ndị ha e gburu egbu ga-atọgbọrọ ebe arụsị ha niile na-asọ oyi dị, gburugburu ebe ịchụàjà ha,+ n’elu ugwu nta ọ bụla, n’elu ugwu ukwu niile, n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko, nakwa n’okpuru alaka nnukwu osisi ọ bụla ha na-anọ achụrụ arụsị ha niile na-asọ oyi àjà ihe na-esi ísì ọma.+ 14 M ga-eweli aka m mee ha ihe, meekwa ka ala ha na ebe niile ha bi tọgbọrọ nkịtị karịa ala ịkpa dị nso na Dibla. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”