Joel
1 Ihe a bụ okwu Jehova gwara Joel* nwa Petuel ka o kwuo:
Ụdị ihe a ò metụla n’oge unu
Ma ọ bụ n’oge ndị nna nna unu?+
4 Igurube ndị na-abịa n’ìgwè eriela ihe igurube ndị na-eri ihe ọsọ ọsọ rifọrọ;+
Igurube ndị na-enweghị nku eriekwala ihe igurube ndị na-abịa n’ìgwè rifọrọ;
Igurube ndị na-erichapụ ihe ọ bụla ha hụrụ eriekwala ihe igurube ndị na-enweghị nku rifọrọ.+
5 Tetanụ, unu ndị aṅụrụma,+ beenụ ákwá.
Tienụ mkpu ákwá, unu niile ndị na-aṅụ mmanya,
N’ihi na a napụla unu mmanya dị ụtọ nke dị n’ọnụ unu.+
6 N’ihi na otu mba dị ike, nke a na-enweghịkwa ike ịgụta ndị ya ọnụ, abatala n’ala m.+
Ezé ya bụ ezé ọdụm,+ agba ya bụkwa agba ọdụm.
7 O mebichaala osisi vaịn m, meekwa ka osisi fig m fọ naanị úkwù ya.
O kpechapụla azụ ha ma tụfuo ha.
Alaka ha na-achazi ọcha.
8 Beenụ ákwá arịrị otú nwa agbọghọ* nke yi ákwà iru uju si ebe ákwá arịrị
Ma nwoke chọrọ ịlụ ya* nwụọ.
9 A naghịzi eweta àjà ọka+ na àjà mmanya+ n’ụlọ Jehova.
Ndị nchụàjà, bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi, na-eru uju.
10 E bibiela ihe ndị dị n’ubi, ala na-eru uju,+
N’ihi na e bibiela ọka,* mmanya ọhụrụ ataala, mmanụ anakwaghị agbapụta.+
11 Obi adịghị ndị ọrụ ubi mma, ndị ọrụ ubi vaịn na-eti mkpu ákwá,
N’ihi ọka wit na ọka bali,
N’ihi na ihe ndị a kụrụ n’ubi emebiela.
12 Osisi vaịn akpọọla nkụ,
Osisi fig akpọnwụọla.
Osisi pomigranet, nkwụ, na osisi apụl,
Osisi niile dị n’ubi akpọnwụọla,+
N’ihi na ọṅụ alaala, ihere na-emezi ndị mmadụ.
Batanụ, yirinụ ákwà iru uju nọrọ ruo mgbe chi bọrọ, unu ndị na-ejere Chineke m ozi;
N’ihi na a naghịzi eweta àjà ọka+ na àjà mmanya+ n’ụlọ Chineke unu.
14 Kwuonụ ka e buo ọnụ. Maanụ ọkwa ka e nwee nzukọ pụrụ iche.+
Kpọkọtanụ ndị okenye, ha na ndị niile bi n’ala a,
N’ụlọ Jehova bụ́ Chineke unu.+ Rịọnụ Jehova ka o nyere unu aka.
15 Ụbọchị ahụ ga-adị egwu!
Ụbọchị Jehova dị nso,+
Ọ ga-abịakwa ka mbibi nke si n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile!
16 Ọ̀ bụ na anyị ejibeghị anya anyị hụ na e nweghịzi ihe oriri dịnụ,
Nakwa na obi ụtọ na ọṅụ adịghịzi n’ụlọ Chineke anyị?
17 Mkpụrụ* ndị dị n’okpuru shọvel ha akpọọla nkụ.
E nweghịzi ihe dị n’ụlọ dị iche iche a na-akwasa ihe.
A kwatuola ebe a na-ekposa ọka* n’ihi na ọka akpọnwụọla.
Ìgwè ehi amaghịzi ebe ha na-aga aga n’ihi na ha enweghị ebe ha ga-ata ahịhịa.
Ìgwè atụrụ na-atagbukwa onwe ha n’ahụhụ.
Ire ọkụ erepịakwala osisi niile dị n’ọhịa.
20 Anụ ọhịa na-atụ anya ka i nyere ha aka,
N’ihi na iyi niile ataala,
Ọkụ erepịakwala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa n’ala ịkpa.”