Habakọk
3 Ekpere Habakọk onye amụma kpere, nke o kpere ka abụ iru uju:
2 Jehova, anụla m akụkọ gbasara gị.
Jehova, ihe i mere emenyela m ụjọ.
Meekwa ya ọzọ n’oge anyị.*
Mee ka a mara ya n’oge anyị.*
N’oge ị ga-eme ka ọgba aghara dị, cheta mee ebere.+
3 Chineke si na Timan bịa.
Onye Nsọ si n’Ugwu Peran bịa.+ (Sila)*
Ebube ya kpuchiri eluigwe.+
Ndị na-eto ya juru ebe niile n’ụwa.
4 Ìhè ya gbukepụrụ dị ka anyanwụ.+
Ìhè si ebe abụọ na-apụta n’aka ya,
Ebe ike ya zoro.
5 Ọrịa na-efe efe nọ na-aga n’ihu ya.+
Oké ahụ́ ọkụ sokwa ya n’azụ.
6 O guzo otu ebe mee ka ụwa maa jijiji.+
Anya o lere mere ka mba niile jiri ụjọ malie elu.+
E tidara ugwu ukwu niile dịwara kemgbe ụwa.
Ugwu nta niile dịwara kemgbe oge ochie dakwara.+
Otú a ka o si eme kemgbe ụwa.
7 Ahụrụ m nsogbu dị n’ụlọikwuu Kushan.
Ákwà ụlọikwuu Midian mara jijiji.+
8 Jehova, ọ̀ bụ osimiri ka ị na-ewesa iwe?
Ọ̀ bụ iyi ka ị na-ewesa iwe?
Ụgbọ ịnyịnya gị mere ka ndị gị merie.*+
9 I wepụtala ụta gị, jikerekwa ịgbapụ ya.
Mkpara* gị ejikerela ịrụ ọrụ ha otú ị ṅụrụ n’iyi. (Sila)
I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
10 Ugwu dị iche iche hụrụ gị maa jijiji n’ihi ihe mgbu.+
Oké mmiri ozuzo gafere.
Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda.+
Ọ tụliri mmiri ya elu.
11 Anyanwụ na ọnwa guzooro otu ebe n’ụlọ ha dị elu.+
Akụ́ gị nke na-egbuke egbuke gbapụrụ.+
Ube gị gburu ka àmụ̀mà.
12 I ji ezigbo iwe zọrọ ije gafere n’ụwa.
I ji iwe zọgbuo mba niile.*
13 Ị pụtara ka ị zọpụta ndị gị, ka ị zọpụta onye i tere mmanụ.
Ị kụriri onyeisi ụlọ onye ajọ omume.
Ị kụturu ụlọ ahụ si na ntọala ya ruo n’elu ya.* (Sila)
Ha si n’ebe ha zoro ṅụrụ ezigbo ọṅụ bịa ka ha bibie onye nọ n’ahụhụ.
15 I ji ịnyịnya gị gafee oké osimiri,
Ya bụ, nnukwu mmiri na-asọ asọ.
16 Amara m jijiji* mgbe m nụrụ ihe ndị a.
Egbugbere ọnụ m mara jijiji mgbe m nụrụ ụda ya.
Ọkpụkpụ m wee rewe ure.+
Ụkwụ m abụọ nọ na-ama jijiji.
Ma m ga-anọrọ nwayọọ chere ụbọchị ahụhụ,+
N’ihi na ọ bụ ụbọchị a ga-emesi ndị iro anyị ike.
17 Ọ bụ eziokwu na osisi fig nwere ike ghara ịma ifuru,
Osisi vaịn nwekwara ike ghara ịmị mkpụrụ,
Ọ bụ eziokwu na osisi oliv nwere ike ghara ịmị mkpụrụ,
Ala nwekwara ike ghara imepụta nri ọ bụla,
Ọ bụ eziokwu na ìgwè ewu na atụrụ ndị nọ n’ogige ha nwere ike nwụchaa,
E nwekwara ike a gaghị enwe ìgwè ehi n’ogige ha,
18 Ma mụnwa ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.
M ga-enwe aṅụrị n’ihi Chineke, onye nzọpụta m.+
19 Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ ike m.+
Ọ ga-eme ka ụkwụ m na-awụ ọsọ ka ụkwụ mgbada,
Meekwa ka m jee ije n’ebe ndị dị elu.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara m kpọọ ya.