Ndị Eze nke Abụọ
2 Ịlaịja na Ịlaịsha+ si na Gilgal+ na-apụ mgbe Jehova chọrọ iji oké ifufe+ bugoo Ịlaịja+ n’eluigwe.* 2 Ịlaịja asị Ịlaịsha: “Biko, nọrọ ebe a, n’ihi na Jehova ziri m ka m gaa Betel.” Ma Ịlaịsha sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na agaghị m ahapụ gị.” Ha wee gawa Betel.+ 3 Ụmụ ndị amụma,* ndị nọ na Betel, pụtara bịakwute Ịlaịsha, sị ya: “Ị̀ makwa na taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?”+ Ya asị ha: “Ama m. Gbanụ nkịtị.”
4 Ịlaịja asị ya: “Ịlaịsha, biko, nọrọ ebe a, n’ihi na Jehova ziri m ka m gaa Jeriko.”+ Ma ọ sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na agaghị m ahapụ gị.” Ha nọkwa na-aga ruo Jeriko. 5 Ụmụ ndị amụma, ndị nọ na Jeriko, bịakwutere Ịlaịsha, sị ya: Ị̀ makwa na taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?” Ya asị ha: “Ama m. Gbanụ nkịtị.”
6 Ịlaịja asị ya: “Biko, nọrọ ebe a, n’ihi na Jehova ziri m ka m gaa n’Osimiri Jọdan.” Ma ọ sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na agaghị m ahapụ gị.” Ha abụọ wee na-aga. 7 Ụmụ nwoke iri ise n’ime ụmụ ndị amụma gara guzoro ebe dịtụ anya. Ma ha abụọ guzo n’akụkụ Osimiri Jọdan. 8 Ịlaịja wee chịrị uwe e ji mara ya,+ fụkọta ya ma pịa ya na mmiri ahụ, ya ekewaa abụọ, ha abụọ esi n’ala nkịtị gafee.+
9 Ozugbo ha gafere, Ịlaịja sịrị Ịlaịsha: “Gwa m ihe ị chọrọ ka m meere gị tupu Chineke akpọpụ m ebe ị nọ.” Ịlaịsha asị: “Biko, m chọrọ inweta mmụọ* gị+ okpukpu abụọ.”+ 10 Ịlaịja asị: “Ihe a ị rịọrọ siri ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-akpọpụ m ebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ya.”
11 Ka ha nọ na-aga, na-ekwu okwu ka ha na-aga, n’otu ntabi anya, ụgbọ agha na-acha ọkụ ọkụ nke ịnyịnya ndị na-acha ọkụ ọkụ+ dọkpụ bịara kewaa ha abụọ, oké ifufe ebugoo Ịlaịja n’eluigwe.*+ 12 Ka Ịlaịsha nọ na-ekiri ihe na-eme, o tiri mkpu, sị: “Nna m, nna m, m na-ahụ ụgbọ ịnyịnya agha Izrel na ndị Izrel na-agba ịnyịnya!”+ Mgbe ọ na-enweghịzi ike ịhụ Ịlaịja ọzọ, o tinyere aka n’uwe o yi ma dọwaa ya ụzọ abụọ.+ 13 O mechakwara chịlite uwe e ji mara Ịlaịja,+ nke si n’ahụ́ Ịlaịja dapụ, wee laghachi ma guzoro n’ụsọ Osimiri Jọdan. 14 Ọ chịịrị uwe ahụ e ji mara Ịlaịja, nke si n’ahụ́ ya dapụ, pịa ya na mmiri ahụ, sị: “Olee ebe Jehova bụ́ Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe Ịlaịsha pịara ya na mmiri ahụ, mmiri ahụ kewara abụọ, ya agafere.+
15 Mgbe ụmụ ndị amụma, ndị nọ na Jeriko, hụrụ ya n’ebe dịtụ anya, ha sịrị: “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaịsha.”+ Ha gakwara zute ya ma kpọọrọ ya isiala. 16 Ha gwara ya, sị: “E nwere mmadụ iri ise gbasiri ike, ha na ndị ohu gị nọ. Biko, ka ha gaa chọọ nna gị ukwu. O nwere ike ịbụ na mmụọ* Jehova ebuliela ya, buga ya n’otu ugwu ma ọ bụ buda ya n’otu ndagwurugwu.”+ Ma ọ sịrị: “Unu ezigala ha.” 17 Ma, ha nọ na-agwa ya ihe a ruo mgbe o mewere ya ihere, ya asịzie ha: “Ziganụ ha.” Ha wee ziga ụmụ nwoke iri ise ahụ, ha agaa na-achọ ya ruo ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya. 18 Ha lọghachikwutere ya na Jeriko+ ebe ọ nọ. Ya asị ha: “Ọ̀ kwa m gwara unu agala?”
19 Ka oge na-aga, ndị obodo ahụ sịrị Ịlaịsha: “Nna anyị ukwu, ị manụ na obodo anyị a dị ebe dị mma,+ ma mmiri anyị adịghị mma. Ala anyị anaghịkwa eme nri.”* 20 Ya asị: “Wetaranụ m obere efere ọhụrụ, wụnyekwanụ nnu n’ime ya.” Ha agaa were ya wetara ya. 21 Ya ewere ya gaa n’isi mmiri ahụ wụnye nnu ahụ na ya,+ sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Emeela m ka mmiri a dị mma. Ọ gaghị egbu mmadụ ọzọ, ọ gaghịzikwa eme ka ndị mmadụ ghara ịmụta ụmụ.’”* 22 Otú a ka mmiri ahụ si dị mma ruo taa, otú ahụ Ịlaịsha kwuru.
23 Ịlaịsha sikwa ebe ahụ gawa Betel. Ka ọ nọ n’ụzọ, ụfọdụ ụmụntakịrị ndị nwoke si n’obodo ahụ pụta, malite ịkwa ya emo,+ na-asị ya: “Si ebe a pụọ, onye isi nkwọcha! Si ebe a pụọ, onye isi nkwọcha!” 24 N’ikpeazụ, ọ tụgharịrị, hụ ha ma jiri aha Jehova bụọ ha ọnụ. Nne anụ ọhịa bea abụọ+ wee si n’oké ọhịa pụta dọrie ụmụaka iri anọ na abụọ n’ime ha.+ 25 O sikwa ebe ahụ gagide ruo Ugwu Kamel,+ sikwa ebe ahụ laghachi Sameria.