Ndị Eze nke Mbụ
2 Mgbe oge ọnwụ Devid ruwere, ọ gwara Solomọn nwa ya, sị: 2 “Oge ọnwụ m eruwela. N’ihi ya, dị ike,+ gosikwa na ị bụ dimkpa.+ 3 Na-erubere Jehova bụ́ Chineke gị isi. Na-eso ụzọ ya. Na-eme ihe o kwuru. Na-edebe iwu ya. Na-eme ihe o kpebiri, na-esokwa ntụziaka ya, otú e dere ha n’Iwu Mosis.+ I mee ihe a niile, ihe ga na-agaziri gị* n’ihe ọ bụla ị na-eme nakwa n’ebe ọ bụla ị na-aga. 4 Ọ ga-emekwa ka Jehova mezuo nkwa o kwere m. Ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị ejisie ike jiri obi ha niile na mkpụrụ obi* ha niile+ na-edebe iwu m, ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ gị ga-anọ n’ocheeze Izrel.’+
5 “Ị makwa nke ọma ihe Joab nwa Zeruya mere m, ya bụ, ihe o mere Abna+ nwa Nee na Amesa+ nwa Jita, mmadụ abụọ bụ́ ndị isi ndị agha Izrel. O gburu* ha+ n’oge udo dị, dị ka à ga-asị na a na-alụ agha. O tekwara ọbara agha n’ájị̀ o kere gburugburu úkwù ya nakwa n’akpụkpọ ụkwụ o yi n’ụkwụ. 6 Mee ihe gosiri na ị ma ihe. Ekwekwala ka ọ nwụọrọ onwe ya.*+
7 “Gosi ụmụ Bazilaị+ onye Gilied na ị hụrụ ha n’anya, ka ha sorokwa ná ndị na-eri ihe na tebụl gị, n’ihi na ha nyeere m aka+ mgbe m gbara ọsọ n’ihi Absalọm nwanne gị.+
8 “Shimiaị nwa Gira, onye ebo Benjamin nke si Bahurim, bi gị nso. Ọ bụ ya kpọrọ m iyi ma kparịa m ezigbo mkparị+ n’ụbọchị m na-aga Mahaneyim.+ Ma mgbe ọ bịara zute m n’Osimiri Jọdan, m ji aha Jehova ṅụọrọ ya iyi na m gaghị egbu ya.+ 9 Ma ugbu a, ahapụla ịkwụ ya ụgwọ ihe o mere,+ n’ihi na ị bụ nwoke ma ihe. Ị makwa ihe i kwesịrị ime ya. N’agbanyeghị na o meela agadi, ekwekwala ka ọ nwụọrọ onwe ya.”*+
10 Devid mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e liekwa ya n’Obodo Devid.+ 11 Devid chịrị Izrel afọ iri anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn,+ chịakwa afọ iri atọ na atọ na Jeruselem.+
12 Solomọn ghọziri eze, nọchie n’ocheeze Devid nna ya. Ọchịchị ya jikwa nwayọọ nwayọọ sie ezigbo ike.+
13 Ka oge na-aga, Adọnaịja nwa Hagit gara na nke Bat-shiba, nne Solomọn, ya asị ya: “Nke a ị bịara, udo ọ̀ dịkwa?” Ya asị ya: “Udo dị.” 14 Adọnaịja sịkwara ya: “O nwere ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ya asị ya: “Kwuwe.” 15 Adọnaịja asị: “O doro gị anya na ọ bụ m gaara abụ eze. Ndị Izrel niile nọkwa na-atụ anya na ọ bụ m ga-abụ eze.+ Ma, ọ dabara na ọ bụghị mụnwa mechara bụrụ eze, kama, ọ bụ nwanne m nwoke, n’ihi na ọ bụ ya ka Jehova chọrọ ka ọ bụrụ eze.+ 16 Ma ugbu a, e nwere otu ihe m chọrọ ịrịọ gị. Biko, meere m ya.” Bat-shiba asị ya: “Kwuwe.” 17 Ya asị ya: “Biko, gwa Eze Solomọn ka ọ kpọnye m Abishag+ nwaanyị Shunem ka m lụwa. Ama m na ọ gaghị ajụ ma ị gwa ya.” 18 Bat-shiba asị ya: “Nsogbu adịghị. M ga-agwa eze ihe i kwuru.”
19 Bat-shiba wee gakwuru Eze Solomọn ka ọ gwa ya ihe Adọnaịja kwuru. Ozugbo eze hụrụ ya, ọ gara nabata ya, kpọọrọ ya isiala, mechaakwa gaa nọrọ ọdụ n’ocheeze ya. O kwukwara ka e butere nne eze ocheeze, ka ọ nọrọ ọdụ n’aka nri ya. 20 Bat-shiba asị ya: “O nwere otu obere ihe m chọrọ ịrịọ gị. Biko, meere m ya.” Eze asị ya: “Nne m rịọwa. M ga-emere gị ya.” 21 Ya asị ya: “Biko, kpọrọ Abishag nwaanyị Shunem kpọnye Adọnaịja nwanne gị nwoke ka ọ lụwa.” 22 Eze Solomọn asị nne ya: “Gịnị mere i ji na-arịọ m ka m kpọrọ Abishag nwaanyị Shunem kpọnye Adọnaịja? Rịọkwuonụ m ka m hapụrụ ya ọchịchị+ maka na ọ bụ ya tọrọ m,+ nakwa maka na Abayata onye nchụàjà na Joab+ nwa Zeruya+ na-akwado ya.”
23 Eze Solomọn jizi aha Jehova ṅụọ iyi, sị: “Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike, ma ọ bụrụ na ihe a Adọnaịja rịọrọ ataghị isi ya. 24 Ugbu a, ọ bụ Jehova Chineke dị ndụ mere ka ọchịchị m sie ezigbo ike,+ mee ka m nọrọ n’ocheeze Devid nna m, rụọkwara m ụlọ*+ otú o kwere ná nkwa. Eji m Chineke a na-aṅụ iyi na Adọnaịja ga-anwụrịrị+ taa.” 25 Eze Solomọn ziri Benaya+ nwa Jehoyada ozi ozugbo, ya achọrọ Adọnaịja gawa ma gbuo ya.
26 Eze gwakwara Abayata+ onye nchụàjà, sị: “Lawa n’ala gị dị n’Anatọt.+ I kwesịrị ịnwụ. Ma agaghị m egbu gị taa, n’ihi na ị na-ebu Igbe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova mgbe gị na Devid nna m nọ,+ i sokwa nna m taa ahụhụ niile ọ tara.”+ 27 Otú a ka Solomọn si kwụsị Abayata ịbụ onye nchụàjà Jehova, iji mezuo ihe Jehova kwuru na Shaịlo+ gbasara ezinụlọ Ịlaị.+
28 Mgbe Joab nụrụ ihe a, ọ gbagara n’ụlọikwuu Jehova+ ma jidesie mpi dị n’ebe ịchụàjà aka ike. Ọ nọ na-akwado Adọnaịja,+ ma ọ kwadoghị Absalọm.+ 29 A gwara Eze Solomọn, sị: “Joab agbagala n’ụlọikwuu Jehova. Ọ nọkwa ebe ahụ n’akụkụ ebe ịchụàjà.” N’ihi ya, Solomọn gwara Benaya nwa Jehoyada, sị: “Gaa gbuo ya!” 30 Benaya gaziri n’ụlọikwuu Jehova sị Joab: “Eze sị gị si ebe a pụta.” Ma ọ sịrị: “Mba! M ga-anwụ ebe a.” Benaya wee gaa kọọrọ eze, sị: “Lekwa lekwa ihe Joab kwuru na ihe ọ zara m.” 31 Eze gwaziri ya, sị: “Mee otú ahụ o kwuru. Gaa gbuo ya, liekwa ya, ka ọbara ndị aka ha dị ọcha o gburu* ghara ịdị n’isi mụ na ezinụlọ nna m.+ 32 Jehova ga-emekwa ka ọbara ya dịrị ya n’isi, n’ihi na ọ gara jiri mma agha gbuo mmadụ abụọ ka ya mma, ndị na-emekwa ezi omume karịa ya. Ọ gwaghịkwa Devid nna m na ọ ga-egbu ha. O gburu Abna+ nwa Nee, onyeisi ndị agha Izrel,+ nakwa Amesa+ nwa Jita, onyeisi ndị agha Juda.+ 33 Ọbara ha ga-adị n’isi Joab nakwa n’isi ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.+ Ma, Jehova ga-eme ka udo dịrị Devid, ụmụ ya, ezinụlọ ya, na alaeze* ya ruo mgbe ebighị ebi.” 34 Benaya nwa Jehoyada gaziri gbuo ya, e liekwa ya n’ụlọ ya dị n’ala ịkpa. 35 Eze mekwara Benaya+ nwa Jehoyada onyeisi ndị agha, ya anọchie Joab. O mekwara Zedọk+ onye nchụàjà, ya anọchie Abayata.
36 Eze kpọkwara Shimiaị,+ sị ya: “Rụọ ụlọ na Jeruselem ebe a, birikwa na ya. Esikwala na Jeruselem gaa ebe ọ bụla ọzọ. 37 Ụbọchị ọ bụla ị pụrụ, gafee Ndagwurugwu Kidrọn,+ mara na a ga-egbu gị. Ọbara gị ga-adịkwa gị n’isi.” 38 Shimiaị asị eze: “Ihe i kwuru dị mma. Ohu gị ga-eme nnọọ ihe onyenwe m eze kwuru.” Shimiaị wee biri na Jeruselem, bitee ya aka.
39 Ma mgbe afọ atọ gara, mmadụ abụọ bụ́ ndị ohu Shimiaị gbara ọsọ gbakwuru Ekish+ nwa Meaka bụ́ eze Gat. Mgbe ndị mmadụ bịara kọọrọ Shimiaị, sị: “Ndị ohu gị nọzi na Gat,” 40 ọ gara ozugbo dokwasị ihe o ji anọkwasị na jakị, gbara ya gaa Gat ka ọ hụ Ekish jụọ ya ase ndị ohu ya. Mgbe Shimiaị si Gat kpọlata ndị ohu ya, 41 a kọọrọ Solomọn, sị: “Shimiaị si Jeruselem pụọ gaa Gat. Ọ lọtakwala.” 42 Eze kpọziri Shimiaị ma sị ya: “Ọ̀ kwa m gwara gị ka i jiri aha Jehova ṅụọrọ m iyi, gị aṅụọkwara m iyi, mụ adọọkwa gị aka ná ntị, sị: ‘Ụbọchị ọ bụla i si ebe a pụọ gaa ebe ọzọ, mara na a ga-egbu gị’? Ọ̀ kwa ị sịrị m na ihe m kwuru dị gị mma nakwa na ị ga-eme ya?+ 43 Gịnịzi mere i ji ghara ime ihe i ji aha Jehova ṅụọ iyi na ị ga-eme, ma mee ihe m nyere gị iwu ka ị ghara ime?” 44 Eze gwaziri Shimiaị, sị: “Ị ma nnọọ ihe ọjọọ niile i mere Devid nna m.+ Jehova ga-emekwa ka i jiri isi gị buru ihe ọjọọ i mere.+ 45 Ma Jehova ga-agọzi Eze Solomọn,+ meekwa ka ocheeze Devid sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.” 46 Eze gwaziri Benaya nwa Jehoyada ka ọ gaa gbuo Shimiaị, ya agaa gbuo ya.+
Otú a ka alaeze Solomọn si sie ezigbo ike.+