Ọpụpụ
38 O ji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ. O nwere akụkụ anọ há nhata. Ọ dị kubit* ise n’ogologo, kubit ise n’obosara, nakwa kubit atọ n’ịdị elu.+ 2 Ọ rụnyere mpi n’akụkụ ya anọ. Ọ rụkọtara mpi ndị ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ka ha bụrụ otu. O jizi ọla kọpa machie ya.+ 3 O wee rụọ arịa niile bụ́ maka ebe ịchụàjà ahụ, bọket ya, shọvel ya, efere ya, ndụdụ ya, na ihe ndị e ji agụnye ọkụ. O ji ọla kọpa rụọ arịa ya niile. 4 O jikwa ọla kọpa kpaa ihe a ga-etinye n’ime ebe ịchụàjà ahụ, n’okpuru ọnụ ebe ịchụàjà ahụ, n’ebe etiti ya. 5 Ọ kpụrụ ihe anọ dị okirikiri n’elu ihe ahụ e ji ọla kọpa kpaa, n’akụkụ ya anọ, ka ọ bụrụ ebe a ga-etinye okporo osisi ya. 6 O jizi osisi akeshịa rụọ okporo osisi ma jiri ọla kọpa machie ha. 7 O tinyere okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri dị n’akụkụ ebe ịchụàjà ahụ, ka e jiri ha na-ebu ya. Ọ rụrụ ebe ịchụàjà ahụ ka ọ dị ka igbe osisi nke nwere oghere.
8 O wee jiri ọla kọpa kpụọ nnukwu ite+ na ihe e ji adọkwasị ya. Ihe o ji kpụọ ha bụ enyo* a natara ụmụ nwaanyị ndị a haziri ka ha na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.
9 O wee rụọ ihe a ga-eji gbaa ụlọikwuu ahụ ogige.+ O ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ chere ihu n’ebe ndịda. Ha dị otu narị (100) kubit.+ 10 E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ ndị nwere oghere, jirikwa ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 11 Ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ugwu ya dị otu narị (100) kubit. E ji ọla kọpa rụọ ogidi iri abụọ ha na ntọala iri abụọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 12 Ma ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ebe ọdịda anyanwụ ya dị kubit iri ise. Ogidi ha dị iri. Ntọala ha ndị nwere oghere dịkwa iri. E jikwa ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 13 Ma akụkụ ga-eche ebe ọwụwa anyanwụ ihu dị kubit iri ise. 14 Ákwà mgbochi ndị dị n’otu akụkụ ya dị kubit iri na ise. O nwere ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere. 15 Ákwà mgbochi ndị dị n’akụkụ ya nke ọzọ, n’ebe a ga-enwe ọnụ ụzọ e si abata n’ogige ahụ, dị kubit iri na ise. O nwere ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere. 16 E ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi niile ga-adị gburugburu ogige ahụ. 17 E ji ọla kọpa rụọ ntọala ndị nwere oghere a ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ha. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ejikọ ihe* n’ogidi ndị ahụ na ihe ndị e ji ekonye ihe na ha, jirikwa ọlaọcha machie elu ya. Ogidi niile a ga-eji rụọ ogige ahụ nwere ihe ndị e ji ọlaọcha rụọ e ji ejikọ ihe na ha.+
18 E ji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ọ dị kubit iri abụọ n’ogologo, kubit ise n’ịdị elu, ya na ákwà mgbochi ndị ga-adị n’ogige ahụ hà.+ 19 E ji ọla kọpa rụọ ogidi anọ ha na ntọala anọ ha ndị nwere oghere. E ji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha, jirikwa ọlaọcha machie elu ogidi ndị ahụ. 20 E ji ọla kọpa rụọ mkpọ́ niile e ji ejide ụlọikwuu ahụ nakwa ndị nke e ji ejide ogige ya gbaa gburugburu.+
21 Ihe ndị a bụ ihe ndị e ji rụọ ụlọikwuu ahụ, bụ́ ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.*+ Mosis nyere iwu ka e depụta ihe ndị a n’akwụkwọ. Ọ bụ ndị Livaị ka e nyere ọrụ idepụta ha.+ Ọ bụkwa Ịtama+ nwa Erọn onye nchụàjà duziri ha. 22 Bezalel+ onye ebo Juda, nwa Yuraị, nwa nwa Họọ, mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu. 23 Oholiab+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan, so ya rụọ ihe ndị ahụ. Ọ bụ aka ochie n’iji nkà arụ ọrụ na ịkpa ihe n’ákwà nakwa n’ọrụ iji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo ákwà linin akpa ihe.
24 Ọlaedo niile e ji rụọ ọrụ niile a rụrụ n’ebe nsọ ahụ bụ ọlaedo ndị e wetara ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị.+ Ha dị talent* iri abụọ na itoolu na narị shekel* asaa na iri atọ (730), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. 25 Ọlaọcha ụmụ nwoke ndị e debara aha ha n’akwụkwọ wetara dị otu narị (100) talent nakwa otu puku shekel, narị asaa na iri asaa na ise (1,775), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. 26 Nwoke ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, nyere ọkara shekel, nke bụ́ ọkara shekel ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya.+ Ụmụ nwoke ndị ahụ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+
27 E ji otu narị (100) talent ọlaọcha kpụọ ntọala ndị nwere oghere maka ebe nsọ ahụ nakwa ntọala ndị nwere oghere maka ákwà mgbochi ya. E ji otu narị (100) talent kpụọ otu narị (100) ntọala ndị nwere oghere, otu talent maka otu ntọala nwere oghere.+ 28 O si na shekel ọlaọcha ahụ dị otu puku na narị asaa na iri asaa na ise (1,775) rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ, machie elu ha ma jikọta ha ọnụ.
29 Ọla kọpa ndị e wetara ka ha bụrụ àjà* dị talent iri asaa nakwa puku shekel abụọ na narị anọ (2,400). 30 O ji ha rụọ ntọala ndị nwere oghere maka ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ na ihe e ji ọla kọpa kpaa a ga-etinye n’ime ya, arịa niile nke ebe ịchụàjà ahụ, 31 ntọala ndị nwere oghere ga-adị gburugburu ogige ụlọikwuu ahụ, ntọala ndị nwere oghere ga-adị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ, na mkpọ́ niile e ji ejide ụlọikwuu ahụ nakwa mkpọ́ niile e ji ejide ogige ụlọikwuu ahụ+ gbaa gburugburu.