Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 4
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • A gwara ndị Izrel ka ha rubere Chineke isi (1-14)

        • Unu echefula ihe ndị Chineke mere (9)

      • Jehova chọrọ ka a na-efe naanị ya (15-31)

      • E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ Jehova (32-40)

      • Obodo mgbaba ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan (41-43)

      • Iwu Mosis nyere ndị Izrel (44-49)

Diuterọnọmi 4:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 18:5

Diuterọnọmi 4:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:32; Ilu 30:5, 6; Mkp 22:18, 19

Diuterọnọmi 4:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 25:5, 9; Ọm 106:28; Ho 9:10; 1Kọ 10:7, 8

Diuterọnọmi 4:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:46; Ọg 30:16; 36:13; Di 6:1

Diuterọnọmi 4:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 2:3
  • +Ọm 111:10
  • +Ọm 119:98, 100
  • +1Ez 4:34; 10:4-7; Da 1:19, 20

Diuterọnọmi 4:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 25:8; Le 26:12; Di 5:26; 2Sa 7:23

Diuterọnọmi 4:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 147:19, 20

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/1/2002, p. 14-15

    7/1/1992, p. 11-12

Diuterọnọmi 4:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 18:19; Di 6:6, 7

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/1/2006, p. 29-30

    Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, p. 20

Diuterọnọmi 4:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:9
  • +Ọp 20:20; Di 5:29
  • +Ilu 22:6; Efe 6:4

Diuterọnọmi 4:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:18; Hib 12:18, 19

Diuterọnọmi 4:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 9:10
  • +Aịz 40:18; Jn 1:18; 4:24
  • +Ọp 20:22

Diuterọnọmi 4:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Okwu Iri.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:5; Di 5:2; 9:9; Hib 9:19, 20
  • +Ọp 20:1; 34:28; Di 10:4
  • +Ọp 24:12; 31:18; 32:19; 34:1

Diuterọnọmi 4:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 20:4; Di 27:15; Aịz 40:18; Ọrụ 17:29; 1Kọ 10:14

Diuterọnọmi 4:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 5:8; Ro 1:22, 23

Diuterọnọmi 4:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Sa 5:4

Diuterọnọmi 4:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 17:2, 3; 2Ez 17:16; Ezi 8:16

Diuterọnọmi 4:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ndị o nwe.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:5

Diuterọnọmi 4:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 106:32
  • +Ọg 20:12; Di 31:1, 2

Diuterọnọmi 4:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 3:27

Diuterọnọmi 4:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 24:3
  • +Ọp 20:4

Diuterọnọmi 4:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 24:17; Di 9:3; Hib 12:29
  • +Ọp 20:5; 34:14; Ọg 25:11; Lu 10:27

Diuterọnọmi 4:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 18:30; 2Ez 21:1, 7
  • +2Ez 17:16, 17

Diuterọnọmi 4:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 18:24, 28; 26:27, 32

Diuterọnọmi 4:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:64; Neh 1:8
  • +Di 28:62

Diuterọnọmi 4:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:15, 36; Jer 16:13; Ezi 20:39

Diuterọnọmi 4:29

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 15:4, 15
  • +Di 30:1-3, 8-10; 1Ez 8:48, 49; Jer 29:13; Joe 2:12

Diuterọnọmi 4:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 33:13; Neh 1:9

Diuterọnọmi 4:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 34:6; Di 30:3; 2Ih 30:9; Neh 9:31; Aịz 54:7; 55:7
  • +Le 26:42

Diuterọnọmi 4:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 44:1

Diuterọnọmi 4:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 5:26

Diuterọnọmi 4:34

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 7:3
  • +Ọp 15:3
  • +Ọp 13:3
  • +Di 26:8; Ọm 78:43-51

Diuterọnọmi 4:35

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 6:7
  • +Ọp 15:11; Di 32:39; 1Sa 2:2; Aịz 45:18; Mk 12:32

Diuterọnọmi 4:36

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:18; 20:22

Diuterọnọmi 4:37

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mkpụrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 10:15; Ọm 105:6

Diuterọnọmi 4:38

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:28; Di 7:1; 9:1; Jos 3:10

Diuterọnọmi 4:39

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 20:6
  • +Aịz 44:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi 4

Diuterọnọmi 4:40

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 48:3, 4

Diuterọnọmi 4:41

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 35:14

Diuterọnọmi 4:42

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 35:22-24
  • +Ọg 35:11, 25; Di 19:4, 5

Diuterọnọmi 4:43

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 21:8, 36
  • +Jos 21:8, 38
  • +Jos 21:27
  • +Jos 20:8, 9

Diuterọnọmi 4:44

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 17:18; 27:2, 3; Ga 3:24

Diuterọnọmi 4:45

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:46; Di 4:1

Diuterọnọmi 4:46

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 1:5; 3:29
  • +Ọg 21:26
  • +Ọg 21:23, 24

Diuterọnọmi 4:47

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 21:33; Di 3:4

Diuterọnọmi 4:48

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 2:36; 3:12
  • +Di 3:8, 9

Diuterọnọmi 4:49

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 3:16, 17; 34:1

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 4:1Le 18:5
Diut. 4:2Di 12:32; Ilu 30:5, 6; Mkp 22:18, 19
Diut. 4:3Ọg 25:5, 9; Ọm 106:28; Ho 9:10; 1Kọ 10:7, 8
Diut. 4:5Le 26:46; Ọg 30:16; 36:13; Di 6:1
Diut. 4:61Ez 2:3
Diut. 4:6Ọm 111:10
Diut. 4:6Ọm 119:98, 100
Diut. 4:61Ez 4:34; 10:4-7; Da 1:19, 20
Diut. 4:7Ọp 25:8; Le 26:12; Di 5:26; 2Sa 7:23
Diut. 4:8Ọm 147:19, 20
Diut. 4:9Je 18:19; Di 6:6, 7
Diut. 4:10Ọp 19:9
Diut. 4:10Ọp 20:20; Di 5:29
Diut. 4:10Ilu 22:6; Efe 6:4
Diut. 4:11Ọp 19:18; Hib 12:18, 19
Diut. 4:12Di 9:10
Diut. 4:12Aịz 40:18; Jn 1:18; 4:24
Diut. 4:12Ọp 20:22
Diut. 4:13Ọp 19:5; Di 5:2; 9:9; Hib 9:19, 20
Diut. 4:13Ọp 20:1; 34:28; Di 10:4
Diut. 4:13Ọp 24:12; 31:18; 32:19; 34:1
Diut. 4:16Ọp 20:4; Di 27:15; Aịz 40:18; Ọrụ 17:29; 1Kọ 10:14
Diut. 4:17Di 5:8; Ro 1:22, 23
Diut. 4:181Sa 5:4
Diut. 4:19Di 17:2, 3; 2Ez 17:16; Ezi 8:16
Diut. 4:20Ọp 19:5
Diut. 4:21Ọm 106:32
Diut. 4:21Ọg 20:12; Di 31:1, 2
Diut. 4:22Di 3:27
Diut. 4:23Ọp 24:3
Diut. 4:23Ọp 20:4
Diut. 4:24Ọp 24:17; Di 9:3; Hib 12:29
Diut. 4:24Ọp 20:5; 34:14; Ọg 25:11; Lu 10:27
Diut. 4:25Ikp 18:30; 2Ez 21:1, 7
Diut. 4:252Ez 17:16, 17
Diut. 4:26Le 18:24, 28; 26:27, 32
Diut. 4:27Di 28:64; Neh 1:8
Diut. 4:27Di 28:62
Diut. 4:28Di 28:15, 36; Jer 16:13; Ezi 20:39
Diut. 4:292Ih 15:4, 15
Diut. 4:29Di 30:1-3, 8-10; 1Ez 8:48, 49; Jer 29:13; Joe 2:12
Diut. 4:302Ih 33:13; Neh 1:9
Diut. 4:31Ọp 34:6; Di 30:3; 2Ih 30:9; Neh 9:31; Aịz 54:7; 55:7
Diut. 4:31Le 26:42
Diut. 4:32Ọm 44:1
Diut. 4:33Di 5:26
Diut. 4:34Ọp 7:3
Diut. 4:34Ọp 15:3
Diut. 4:34Ọp 13:3
Diut. 4:34Di 26:8; Ọm 78:43-51
Diut. 4:35Ọp 6:7
Diut. 4:35Ọp 15:11; Di 32:39; 1Sa 2:2; Aịz 45:18; Mk 12:32
Diut. 4:36Ọp 19:18; 20:22
Diut. 4:37Di 10:15; Ọm 105:6
Diut. 4:38Ọp 23:28; Di 7:1; 9:1; Jos 3:10
Diut. 4:392Ih 20:6
Diut. 4:39Aịz 44:6
Diut. 4:40Je 48:3, 4
Diut. 4:41Ọg 35:14
Diut. 4:42Ọg 35:22-24
Diut. 4:42Ọg 35:11, 25; Di 19:4, 5
Diut. 4:43Jos 21:8, 36
Diut. 4:43Jos 21:8, 38
Diut. 4:43Jos 21:27
Diut. 4:43Jos 20:8, 9
Diut. 4:44Di 17:18; 27:2, 3; Ga 3:24
Diut. 4:45Le 26:46; Di 4:1
Diut. 4:46Di 1:5; 3:29
Diut. 4:46Ọg 21:26
Diut. 4:46Ọg 21:23, 24
Diut. 4:47Ọg 21:33; Di 3:4
Diut. 4:48Di 2:36; 3:12
Diut. 4:48Di 3:8, 9
Diut. 4:49Di 3:16, 17; 34:1
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
  • 36
  • 37
  • 38
  • 39
  • 40
  • 41
  • 42
  • 43
  • 44
  • 45
  • 46
  • 47
  • 48
  • 49
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 4:1-49

Diuterọnọmi

4 “Ugbu a, ndị Izrel, geenụ ntị ná ntụziaka na iwu ndị m na-akụziri unu ka unu na-edebe, ka unu wee dị ndụ+ banye n’ala Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-enye unu ma weghara ya. 2 Unu etinyela ihe n’ihe m na-enye unu n’iwu, unu ewepụkwala ihe na ya,+ ka unu wee na-eme ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu, nke m na-agwa unu.

3 “Unu ejirila anya unu hụ ihe Jehova mere n’ihi Bel nke Piọ. Jehova bụ́ Chineke unu bibiri onye ọ bụla n’ime unu nke sooro Bel nke Piọ.+ 4 Ma unu niile ndị na-ahapụghị Jehova bụ́ Chineke unu dịcha ndụ taa. 5 Lee, m kụzierela unu ntụziaka na iwu dị iche iche,+ otú Jehova bụ́ Chineke m nyere m n’iwu, ka unu wee na-eme ha n’ala ahụ unu ga-ebi na ya. 6 Lezienụ anya na-eme ha+ n’ihi na ọ ga-eme ka ndị ga-anụ banyere ntụziaka niile a mata na unu ma ihe+ nakwa na unu na-aghọta ihe.+ Ha ga-asịkwa, ‘N’eziokwu, mba ukwu a bụ mba ndị bi na ya ma ihe, na-aghọtakwa ihe.’+ 7 N’ihi na olee mba ukwu nke nwere chi nọ ya nso otú Jehova bụ́ Chineke anyị si nọrọ anyị nso mgbe ọ bụla anyị kpọrọ ya?+ 8 Oleekwa mba ukwu nke nwere ezigbo ntụziaka na ihe ndị e kpebiri ka ndị bi na ya na-eme bụ́ ndị yiri Iwu a niile m na-enye unu taa?+

9 “Lezienụ anya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ka unu ghara ichefu ihe ndị anya unu hụrụ, ka ha gharakwa ịpụ apụ n’obi unu n’oge niile unu dị ndụ. Unu ga-emekwa ka ụmụ unu na ụmụ ụmụ unu mara ha.+ 10 N’ụbọchị unu guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu na Horeb, Jehova sịrị m, ‘Kpọkọtara m ndị a niile ka m mee ka ha nụ okwu m,+ ka ha wee mụta ịtụ egwu m+ n’oge niile ha ga-adị ndụ n’ala ahụ, ka ha kụziekwara ya ụmụ ha.’+

11 “Unu wee bịa nso ma guzo n’ala ala ugwu ahụ. Ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ, anwụrụ ọkụ ya rukwara na mbara igwe. Itiri na oké ọchịchịrị gbara, ígwé ojii gbachikwara.+ 12 Jehova wee si n’ọkụ ahụ gwawa unu okwu.+ Unu nụrụ naanị okwu, ma e nweghị onye unu hụrụ.+ Naanị olu ka unu nụrụ.+ 13 O wee gwa unu banyere ọgbụgba ndụ unu na ya,+ nke o nyere unu iwu ka unu na-edebe, ya bụ, Iwu Iri ahụ.*+ Mgbe e mechara, o dere ha ná mbadamba nkume abụọ.+ 14 N’oge ahụ, Jehova nyere m iwu ka m kụziere unu ntụziaka na iwu dị iche iche, bụ́ ndị unu ga na-edebe n’ala unu ga-abanye iweghara.

15 “N’ihi ya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ebe ọ bụ na e nweghị onye unu hụrụ n’ụbọchị ahụ Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu okwu na Horeb, 16 ka unu ghara imere onwe unu arụsị a pịrị apị nke yiri ihe ọ bụla, si otú ahụ merụọ onwe unu. Unu emela ihe ọ bụla yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+ 17 ihe yiri anụmanụ ọ bụla dị n’ụwa ma ọ bụ ihe yiri nnụnụ ọ bụla na-efe na mbara igwe,+ 18 ihe yiri ihe ọ bụla na-arịgharị n’ala ma ọ bụ ihe yiri azụ̀ ọ bụla dị na mmiri ndị dị n’ụwa.+ 19 Mgbe unu lere anya n’eluigwe hụ anyanwụ na ọnwa na kpakpando, ya bụ, ihe niile dị n’eluigwe, unu ekwela ka a rafuo unu, unu ewee kpọwara ha isiala ma fewe ha.+ Jehova bụ́ Chineke unu enyela ha ndị niile nọ n’ụwa* niile. 20 Ma, ọ bụ unu ka Jehova si n’Ijipt, n’ọkụ na-agbaze ígwè, kpọpụta, ka unu bụrụ ndị nke ya,*+ otú unu bụ nke ya taa.

21 “Jehova wesara m iwe n’ihi unu,+ ọ ṅụkwara iyi na agaghị m agafe Osimiri Jọdan ma ọ bụ banye n’ezigbo ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ ihe unu ketara.+ 22 N’ihi na m ga-anwụ n’ala a. Agaghị m agafe Osimiri Jọdan.+ Ma unu ga-agafe ya weghara ezigbo ala ahụ. 23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Jehova bụ́ Chineke unu gbara.+ Unu emekwarala onwe unu arụsị a pịrị apị, nke yiri ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu iwu banyere ya.+ 24 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ ọkụ na-erechapụ ihe,+ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+

25 “Ọ bụrụ na unu amụọ ụmụ, mụtakwa ụmụ ụmụ, ọ bụrụkwa na unu ebie ogologo oge n’ala ahụ ma mee omume ọjọọ, meekwa ụdị arụsị ọ bụla a pịrị apị+ ma mee ihe dị njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu ka unu kpasuo ya iwe,+ 26 eluigwe na ụwa bụụrụ m ndị akaebe taa na a ga-ebibirịrị unu ngwa ngwa n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu weghara. Unu agaghị ebite aka na ya, kama a ga-ala unu n’iyi kpamkpam.+ 27 Jehova ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ Naanị mmadụ ole na ole n’ime unu ga-afọ+ ná mba ndị Jehova ga-achụga unu. 28 N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche ndị mmadụ ji osisi na nkume mee,+ chi ndị na-enweghị ike ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.

29 “Ọ bụrụ na unu anọrọ n’ebe ahụ chọọ Jehova bụ́ Chineke unu, unu ga-achọta ya+ ma unu jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile jụọ ase ya.+ 30 Mgbe unu na-ahụsi anya, ihe a niile emechaakwa mee unu, unu ga-alọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu ma gee ntị n’olu ya.+ 31 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere.+ Ọ gaghị ahapụ unu ma ọ bụ bibie unu ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara.+

32 “Cheenụ echiche banyere oge gara aga tupu oge unu, malite n’ụbọchị Chineke kere mmadụ n’ụwa. Sikwanụ n’otu nsọtụ eluigwe chọwa ruo na nsọtụ ọzọ nke eluigwe. Ụdị nnukwu ihe a ò metụla? È nwere onye nụtụrụla ihe dị ka ya?+ 33 È nwere ndị ọzọ nụtụrụla olu Chineke ka o si n’ọkụ na-ekwu okwu otú unu nụrụ ya ma ka dịrị ndụ?+ 34 Ka è nwetụla mgbe Chineke ji ikpe ya, ihe àmà, ọrụ ebube,+ agha,+ aka ya siri ike,+ ike ya, na ihe ndị na-atụ egwu o mere+ gbalịa ka o si ná mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, otú Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu? 35 E gosila unu ihe ndị a ka unu wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ ya.+ 36 O mere ka unu nụ olu ya mgbe o si n’eluigwe na-agwa unu okwu ka ọ dọọ unu aka ná ntị. O mekwara ka unu hụ oké ọkụ ya n’ụwa, unu sikwa n’ọkụ nụ olu ya.+

37 “Ebe ọ bụ na ọ hụrụ nna nna unu hà n’anya ma họrọ ụmụ* ha ndị nọchiri ha,+ ọ nọnyeere unu ma jiri ike ya dị ukwuu kpọpụta unu n’Ijipt. 38 Ọ chụpụụrụ unu mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa unu, ka ọ kpọbata unu n’ala ha ma nye ya unu ka ọ bụrụ nke unu, otú ọ bụ nke unu taa.+ 39 N’ihi ya, maranụ taa, burukwanụ n’obi na Jehova bụ ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.+ E nweghị Chineke ọzọ.+ 40 Unu ga na-edebe iwu ya na ntụziaka ya ndị m na-agwa unu taa, ka ihe wee gaziere unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu, ka unu wee bitee aka n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.”+

41 N’oge ahụ, Mosis wepụtara obodo atọ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+ 42 Ọ bụrụ na mmadụ egbuo mmadụ ibe ya n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na ọ kpọbughị ya asị,+ ọ ga-agbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ.+ 43 Obodo nke mbụ bụ Biza+ nke dị n’ala ịkpa, n’ala dị larịị. Ọ bụ maka ụmụ Ruben. Nke abụọ bụ Remọt+ nke dị na Gilied. Ọ bụ maka ụmụ Gad. Nke atọ bụ Golan+ nke dị na Beshan. Ọ bụ maka ụmụ Manase.+

44 Ihe a bụ Iwu+ Mosis nyere ndị Izrel. 45 Ihe ndị a bụ ihe Mosis chetaara ndị Izrel, na ntụziaka na iwu ndị o nyere ha. Mosis gwara ha ihe ndị a mgbe ha pụtachara n’Ijipt,+ 46 ná mpaghara Osimiri Jọdan, na ndagwurugwu chere Bet-piọ ihu,+ n’ala Eze Saịhọn onye chịrị ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn,+ onye Mosis na ndị Izrel meriri mgbe ha pụtachara n’Ijipt.+ 47 Ha wee weghara ala ya nakwa ala Eze Ọg+ onye chịrị Beshan, ya bụ, ndị eze abụọ chịrị ndị Amọraịt bụ́ ndị bi n’ógbè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, 48 malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, ruo n’Ugwu Sayọn, ya bụ, Hemọn,+ 49 nakwa Araba niile nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, ruo n’Oké Osimiri Araba,* n’ala ala mkpọda Pisga.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya