Ndị Eze nke Mbụ
12 Rehoboam gawara Shikem, n’ihi na ndị Izrel niile gara Shikem+ ka ha chie ya eze.+ 2 Ozugbo Jeroboam nwa Nibat nụrụ ya (ọ ka nọ n’Ijipt n’oge ahụ n’ihi na ọ gbagara ebe ahụ maka Eze Solomọn, o bikwa n’Ijipt),+ 3 ndị Izrel ziri ya ozi ka ọ bịa. Mgbe ọ bịara, ya na ndị Izrel niile bịara gwa Rehoboam, sị: 4 “Nna gị boro anyị ibu arọ.+ Ma, ọ bụrụ na i mee ka ihe dịtụrụ anyị mfe n’ọrụ siri ike nna gị nyere anyị, meekwa ka ibu* o boro anyị dị mfe, anyị ga na-ejere gị ozi.”
5 Ya asị ha: “Laanụ, bịaghachinụ n’abalị atọ taa.” Ha wee lawa.+ 6 Eze Rehoboam wee kpọọ ndị okenye, ndị jeere Solomọn nna ya ozi mgbe ọ dị ndụ, ka ha tụọrọ ya aro ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị ha: “Gịnị ka m ga-aza ndị a?” 7 Ha asị ya: “Ọ bụrụ na i bido taa na-eme ka ị̀ bụ ohu ndị a, na-emere ha ihe ha rịọrọ gị, zaakwa ha ihe dị mma, ha ga na-ejere gị ozi mgbe niile.”
8 Ma, ọ nabataghị aro a ndị okenye ahụ tụụrụ ya. Ọ kpọrọ ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, ndị ya na ha tokọrọ, ka ha tụọrọ ya aro.+ 9 Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka anyị ga-aza ndị a bịara gwa m, sị, ‘Mee ka ibu* nna gị boro anyị dị mfe’?” 10 Ụmụ okorobịa ahụ ya na ha tokọrọ asị ya: “Ebe ọ bụ na ha sịrị gị, ‘Nna gị mere ka ibu anyị dị arọ, gịnwa mee ka ọ dịrị anyị mfe,’ ihe a ka ị ga-agwa ha, ‘Mkpịsị aka m nke ntakịrị ga-adị okpotokpo karịa úkwù nna m. 11 Nna m boro unu ibu arọ, ma m ga-atụkwasị ihe n’ibu unu. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma m ga-apịa unu ụtarị na-emerụsị mmadụ ahụ́.’”
12 Jeroboam na ndị Izrel niile bịakwutere Rehoboam n’ụbọchị nke atọ, otú ahụ eze gwara ha ka ha bịaghachi n’ụbọchị nke atọ.+ 13 Ma eze ji olu ike gwa ha okwu. Otú a ka o si hapụ aro ndị okenye tụụrụ ya. 14 Ọ gwara ha ihe ụmụ okorobịa ahụ tụụrụ ya aro ka ọ gwa ha. Ọ gwara ha, sị: “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, ma m ga-atụkwasị ihe n’ibu unu. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma m ga-apịa unu ụtarị na-emerụsị mmadụ ahụ́.” 15 Otú a ka eze si hapụ ime ihe ndị Izrel rịọrọ ya. Ọ bụ Jehova mere ka ihe ndị a mee,+ ka Jehova wee mezuo ihe o si n’ọnụ Ahaịja+ onye Shaịlo gwa Jeroboam nwa Nibat.
16 Mgbe ndị Izrel niile hụrụ na eze emeghị ihe ha rịọrọ ya, ha sịrị ya: “Gịnị jikọrọ anyị na Devid? E nweghị ihe nwa Jesi anyị ga-eketa. Ndị Izrel, onye ọ bụla gaa fewe chi ya. Devid, lekọtawa ụlọ gị.” Ndị Izrel wee laa n’ụlọ* ha.+ 17 Ma Rehoboam nọ na-achị ndị Izrel bi n’obodo ndị dị n’ebo Juda.+
18 Eze Rehoboam ziri Adoram,+ onye na-elekọta ndị eze manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ, ka ọ gaa hụ ndị Izrel, ma ha ji nkume tụgbuo ya. Eze Rehoboam jisiri ike rịgoro n’ụgbọ ịnyịnya ya gbalaa Jeruselem.+ 19 Ndị Izrel nọkwa na-enupụrụ ndị ezinụlọ Devid isi+ ruo taa.
20 Ozugbo ndị Izrel niile nụrụ na Jeroboam alọghachila, ha kpọrọ ya ka ọ bịa nzukọ ha, ya abịa, ha emee ya eze ndị Izrel niile.+ Naanị ebo Juda kwadosiri ọchịchị ndị ezinụlọ Devid ike.+
21 Ozugbo Rehoboam lọrutere Jeruselem, ọ kpọkọrọ otu narị puku na puku iri asatọ (180,000) ndị agha a zụrụ azụ,* bụ́ ndị Juda na ndị Benjamin, ka ha gaa lụso ndị Izrel ndị ọzọ agha, ka Rehoboam nwa Solomọn nwee ike nwetaghachi alaeze ahụ niile.+ 22 Ezi Chineke wee gwa Shemaya,+ onye nke ezi Chineke, sị: 23 “Gwa Rehoboam nwa Solomọn eze Juda na ndị Juda na ndị Benjamin niile nakwa ndị fọdụrụ, sị, 24 ‘Jehova kwuru, sị: “Unu agala ịlụso ndị Izrel, bụ́ ụmụnne unu, agha. Onye ọ bụla n’ime unu laghachi n’ụlọ ya, n’ihi na ọ bụ m mere ihe a ji na-eme.”’”+ Ha wee mee ihe Jehova kwuru, laghachi n’ụlọ ha otú Jehova kwuru.
25 Jeroboam gara rụsie Shikem ike+ ma biri na ya. Ebe ahụ dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu. O sikwa ebe ahụ pụta gaa rụsie Penuel ike.+ 26 Jeroboam sịkwara n’obi ya: “Alaeze a nwekwanụrụ ike imecha laghachi n’aka ezinụlọ Devid.+ 27 Ọ bụrụ na ndị a ana-aga achụ àjà n’ụlọ Jehova dị na Jeruselem,+ obi ha ga-adị ọzọ n’ebe Rehoboam eze Juda, bụ́ onyenwe ha, nọ. Ha ga-egbuzi m ma laghachikwuru ya.” 28 Mgbe eze na ndị na-adụ ya ọdụ kparịtachara, ọ kpụrụ nwa ehi ọlaedo abụọ+ ma gwa ndị Izrel, sị: “Ịna-aga Jeruselem ga na-enye unu ezigbo nsogbu. Lekwanụ Chineke unu, onye si n’Ijipt kpọpụta unu.”+ 29 O dowere otu nwa ehi ọlaedo ahụ na Betel,+ dowe nke ọzọ na Dan.+ 30 Ihe a mere ka ndị Izrel mehie.+ Ha na-agaruchakwa Dan efe nke dị ebe ahụ.
31 Jeroboam rụgasịrị ụlọ n’ebe ndị dị elu ka a nọrọ na ha na-efe chi dị iche iche. Ọ họpụtakwara ndị nkịtị na-abụghị ndị Livaị ka ha bụrụ ndị nchụàjà.+ 32 Jeroboam mekwara ka a malite ime otu ememme n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asatọ. A na-eme ụdị ememme a na Juda.+ Ọ nọkwa n’elu ebe ịchụàjà ọ rụrụ na Betel+ chụọrọ ụmụ ehi ndị ọ kpụrụ àjà. Ọ họpụtakwara ndị nchụàjà ga na-eje ozi n’ebe ndị dị elu ọ rụrụ na Betel. 33 Ọ malitere ịnọ n’elu ebe ịchụ àjà ahụ ọ rụrụ na Betel achụ àjà n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asatọ. O chepụtara ọnwa a n’onwe ya. O hiweere ndị Izrel ememme ha ga na-eme, gaakwa nọrọ n’elu ebe ịchụàjà na-esu àjà ọkụ.