Ndị Eze nke Abụọ
8 Ịlaịsha gwara nwaanyị ahụ ọ kpọlitere nwa ya n’ọnwụ,+ sị: “Gị na ezinụlọ gị kwapụ, kwaganụ obodo ọ bụla ọzọ dị unu mma, n’ihi na Jehova ekwuola na ụnwụ ga-ada+ n’ala a afọ asaa.” 2 Nwaanyị ahụ wee kwapụ otú onye nke ezi Chineke gwara ya. Ya na ezinụlọ ya kwapụrụ gaa biri n’ala ndị Filistia+ ruo afọ asaa.
3 Mgbe afọ asaa gara, nwaanyị ahụ si n’ala ndị Filistia lọta ma gaa ka ọ rịọ eze ka e nyeghachi ya ụlọ ya na ubi ya. 4 Eze nọkwa na-agwa Gehezaị bụ́ onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi, sị: “Biko, kọọrọ m oké ihe niile Ịlaịsha mere.”+ 5 Mgbe ọ nọ na-akọrọ eze otú Ịlaịsha si kpọlite mmadụ n’ọnwụ,+ nwaanyị ahụ Ịlaịsha kpọlitere nwa ya n’ọnwụ bịakwutere eze, na-arịọ ya ka e nyeghachi ya ụlọ ya na ubi ya.+ Gehezaị sịrị ozugbo ahụ: “Onyenwe m eze, onye a bụ nwaanyị ahụ. Onye a bụkwa nwa ya ahụ Ịlaịsha kpọlitere n’ọnwụ.” 6 Eze wee jụọ nwaanyị ahụ otú ihe ahụ si mee, ya akọọrọ ya. Eze akpọọ otu onye na-eje ozi n’obí ya, sị ya: “Nyeghachi nwaanyị a ihe niile bụ́ nke ya, kwụọkwa ya ụgwọ ihe niile ọ gaara enweta n’ubi ya malite n’ụbọchị ọ hapụrụ ala a ruo taa.”
7 Ịlaịsha gara Damaskọs+ mgbe Ben-hedad+ eze Siria na-arịa ọrịa, a gaa gwa Ben-hedad, sị: “Onye nke ezi Chineke+ bịara ebe a.” 8 Eze asị Hazel:+ “Were onyinye gakwuru onye nke ezi Chineke.+ Gwa ya ka ọ jụọrọ m Jehova ma m̀ ga-agbake n’ọrịa a.” 9 Hazel weere ụdị ihe ọma niile dị na Damaskọs, ihe kamel iri anọ ga-ebu, gawa ịhụ ya. Mgbe o ruru, ọ gara guzoro n’ihu ya, sị: “Ben-hedad nwa gị nwoke, bụ́ eze Siria, ziri m ka m jụọ gị ma ọ̀ ga-agbake n’ọrịa ọ na-arịa.” 10 Ịlaịsha asị ya: “Gaa gwa ya na ọ ga-agbake, ma Jehova egosila m na ọ ga-anwụrịrị.”+ 11 O legidekwara Hazel anya ruo mgbe ihere mewere ya. Onye nke ezi Chineke bewekwara ákwá. 12 Hazel ajụọ ya, sị: “Gịnị mere onyenwe m ji na-ebe ákwá?” Ya asị: “N’ihi na ama m ihe ị ga-eme ndị Izrel.+ Ị ga-agba ebe ndị ha rụsiri ike ọkụ. Ị ga-eji mma agha gbuo ụmụ nwoke ha bụ́ ndị dike. Ị ga-eji iwe gbuo ụmụaka ha. Ị ga-abọwakwa ụmụ nwaanyị ha dị ime afọ.”+ 13 Hazel asị: “Olee otú ohu gị bụ́ nkịta efu ga-esi enwe ike ime ihe a?” Ma Ịlaịsha sịrị: “Jehova egosila m na ị ga-abụ eze Siria.”+
14 Mgbe Ịlaịsha kwuchara ihe a, Hazel lawara gakwuru onyenwe ya, ya ajụọ ya, sị: “Gịnị ka Ịlaịsha gwara gị?” Ya asị: “Ọ gwara m na ị ga-agbake.”+ 15 Ma n’echi ya, Hazel chịịrị ákwà e ji afụchi àkwà,* sụnye ya na mmiri, were ya bịagide n’ihu onyenwe ya ruo mgbe ọ nwụrụ.+ Ọ nọchiziri ya, malite ịchị.+
16 Mgbe Jehoshafat ka bụ eze Juda, Jehoram+ nwa ya malitere ịchị Juda n’afọ nke ise n’ọchịchị Jehoram+ nwa Ehab eze Izrel. 17 Ọ dị afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ asatọ na Jeruselem. 18 Ọ nọ na-akpa àgwà ka ndị eze Izrel,+ otú ndị ezinụlọ Ehab kpara,+ n’ihi na ọ lụrụ nwa Ehab.+ Ọ nọkwa na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova.+ 19 Ma Jehova achọghị ịla Juda n’iyi n’ihi Devid ohu ya,+ maka na o kwere ya nkwa na a ga-enwe onye si n’ezinụlọ ya ga na-achị.*+
20 Ọ bụ n’oge Jehoram na-achị ka ndị Ịdọm nupụụrụ Juda isi,+ nwee eze nke ha.+ 21 Jehoram na ndị agha ya wee jiri ụgbọ ịnyịnya ya niile gaa Zea. O bilikwara n’abalị lụso ndị Ịdọm gbara ya na ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ya gburugburu agha, meriekwa ha. Ndị agha ahụ gbalakwara n’ụlọikwuu ha. 22 Ma Ịdọm ka na-enupụrụ ndị Juda isi ruo taa. N’oge ahụ, ndị Libna+ nupụkwaara ha isi.
23 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jehoram na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 24 Jehoram mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e liekwa ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid.+ Ehazaya+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.
25 N’afọ nke iri na abụọ n’ọchịchị Jehoram nwa Ehab eze Izrel, Ehazaya nwa Eze Jehoram malitere ịchị Juda.+ 26 Ehazaya dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara otu afọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Atalaya+ nwa nwa* Ọmraị+ eze Izrel. 27 Ọ nọkwa na-akpa àgwà ka ndị ezinụlọ Ehab+ ma na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova, otú ndị ezinụlọ Ehab mere, n’ihi na nna ya lụrụ nwaanyị n’ezinụlọ Ehab.+ 28 O sooro Jehoram nwa Ehab gaa lụso Hazel eze Siria agha na Remọt-gilied.+ Ma ndị Siria merụrụ Jehoram ahụ́.+ 29 Eze Jehoram lawaziri Jezril+ ka ọ nọrọ ebe ahụ ka ahụ́ ahụ ndị Siria merụrụ ya laa. E merụrụ ya ahụ́ ahụ na Rema mgbe ọ gara lụso Hazel eze Siria agha.+ Ehazaya nwa Jehoram eze Juda gakwara Jezril ka ọ hụ Jehoram nwa Ehab n’ihi ahụ́ ahụ e merụrụ ya.*