Zekaraya
13 “N’ụbọchị ahụ, a ga-egwuru ụlọ Devid na ndị bi na Jeruselem olulu mmiri maka ịsachapụ ha mmehie na unyi.”+
2 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ, m ga-ewepụ aha arụsị niile n’ala a,+ a gaghịkwa echeta ha ọzọ. M ga-ewepụkwa ndị amụma+ na ike ndị mmụọ ọjọọ n’ala a. 3 Ọ bụrụ na mmadụ ebuo amụma ọzọ, nne ya na nna ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-asị ya, ‘Ị gaghị adị ndụ n’ihi na i jirila aha Jehova ghaa ụgha.’ Nne ya na nna ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-ama ya mma maka amụma o buru.+
4 “N’ụbọchị ahụ, ihere ga-eme onye amụma nke ọ bụla n’ihi ọhụụ ọ na-akọ mgbe ọ na-ebu amụma ya. Ha agaghịkwa eyi uwe ha ji ebu amụma, nke e ji ajị anụ mee,+ ka ha wee ghọgbuo ndị mmadụ. 5 Onye nke ọ bụla n’ime ha ga-asị, ‘Abụghị m onye amụma. Abụ m onye ọrụ ubi n’ihi na mmadụ zụụrụ m mgbe m bụ nwata ka m gbawara ya ohu.’ 6 Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ ya, sị, ‘Gịnị bụkwanụ ọnyá ndị a dị gị n’ahụ́?’* Ọ ga-aza, sị, ‘Ọ bụ ahụ́ e merụrụ m n’ụlọ ndị enyi m.’”*
7 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Mma agha, teta, gaa gbuo onye na-azụ atụrụ m,+
Gaa gbuo nwoke bụ́ enyi m.
Gbuo onye ọzụzụ atụrụ,+ ka ìgwè atụrụ ya gbasasịa.+
M ga-eweli aka m megide ndị a na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ.”
Ma, a ga-ahapụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ ka ha fọdụ n’ime ya.
9 M ga-etinye otu ụzọ n’ime ụzọ atọ ahụ n’ọkụ.
M ga-anụcha ha otú e si anụcha ọlaọcha,
Nwaleekwa ha otú e si anwale ọlaedo.+
Ha ga-akpọku aha m,
M ga-azakwa ha.
M ga-asị, ‘Ha bụ ndị m.’+
Ha ga-asịkwa, ‘Jehova bụ Chineke anyị.’”