Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Tesalonaịka
2 Ụmụnna anyị, banyere ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ nakwa mkpọkọta a ga-akpọkọta anyị n’ebe ọ nọ,+ anyị na-arịọ unu 2 ka unu ghara ikwe ka e jiri okwu yiri ka ò si n’aka Chineke*+ ma ọ bụ ozi e ji ọnụ zie ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ozi yiri ka ò si n’aka anyị megharịa unu anya ma ọ bụ mee ka unu chewe na ụbọchị Jehova*+ abịala.
3 Unu ekwela ka onye ọ bụla duhie* unu n’ihi na tupu ụbọchị ahụ abịa, a ga-enwe ndị ga-akwụsị ife Chineke fewe chi ọzọ,+ e kpugheekwa onye mmebi iwu ahụ,+ bụ́ nwa mbibi.+ 4 Ọ bụ onye mmegide, ọ na-ebulikwa onwe ya elu karịa ihe ọ bụla a na-akpọ chi ma ọ bụ ihe ọ bụla a na-efe ofufe.* Ọ bụ ya mere o ji nọrọ ọdụ n’ụlọ nsọ Chineke na-egosi onwe ya n’ihu ọha na ya bụ chi. 5 Ọ̀ bụ na unu echetaghị na m na-agwa unu ihe ndị a mgbe mụ na unu ka nọ?
6 Ugbu a, unu ma ihe na-egbochi onye mmebi iwu ahụ, ka e wee kpughee onye ahụ mgbe oge ya ruru. 7 N’eziokwu, ihe ọjọọ ọ na-eme, nke bụ́ ihe zoro ezo, akpawala ike,+ ma ọ ka ga-abụ ihe zoro ezo ruo mgbe onye ahụ na-egbochi ya na-anọghịzi. 8 Mgbe ahụ, a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ, onye Onyenwe anyị Jizọs ga-eji ume* si ya n’ọnụ+ bibie ma laa ya n’iyi n’oge a ga-eme ka ọnụnọ Onyenwe anyị pụta ìhè.+ 9 Ma, ọ bụ ike Setan na-akpa+ mere onye mmebi iwu ahụ ji nọrọ ma na-arụ ọrụ ebube ọ bụla, na-eme ihe àmà ụgha na ihe ịtụnanya dị iche iche,+ 10 na-emekwa ụdị ajọ omume ọ bụla ka o duhie+ ndị na-ala n’iyi, ka o wee bụrụ ụgwọ ọrụ ha maka na ha anabataghị eziokwu, ha ejighịkwa ya kpọrọ ihe ka e wee zọpụta ha. 11 Ọ bụ ya mere Chineke ji kwe ka e jiri ozizi ụgha na-eduhie ha, ka ha wee na-ekwere okwu ụgha,+ 12 ka e wee maa ha niile ikpe n’ihi na ha ekwereghị eziokwu, kama ọ bụ ajọ omume na-atọ ha ụtọ.
13 Ma, ụmụnna anyị Jehova* hụrụ n’anya, anyị agaghị akwụsị ịna-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu maka na Chineke si ná mmalite họrọ unu+ ka a zọpụta unu. Otú o si mee ya bụ na o ji mmụọ nsọ ya na okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ mee ka unu dị nsọ.+ 14 O si n’ozi ọma anyị na-ezisa kpọọ unu ka a zọpụta unu, ka unu wee nweta ebube Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 15 N’ihi ya, ụmụnna anyị, kwụsienụ ike,+ na-emekwanụ ihe niile a kụziiri unu,+ ma ùnu nụrụ ya n’ozi anyị ji ọnụ zie unu ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi anyị detaara unu. 16 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị n’anya,+ onye si n’amara ya kasie anyị obi ruo mgbe ebighị ebi ma mee ka anyị nwee ezigbo olileanya,+ 17 kasie unu obi ma mee ka unu kwụsie ike* ka unu wee na-eme ihe ọma ma na-ekwu okwu ọma mgbe niile.