Ilu
2 Ọ bụrụ na mmadụ adị mpako, a ga-emechu ya ihu.+
Ma ndị dị umeala n’obi ma ihe.+
4 E nweghị uru akụnụba ga-aba n’ụbọchị oké iwe.*+
Ma, ọ bụ ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+
5 Ezi omume onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta na-eme ga-eme ka ihe gaziere ya,*
Ma ihe agaghị agaziri onye ajọ omume* n’ihi ihe ọjọọ ọ na-eme.+
6 Ihe ga-anapụta ndị ezi omume bụ ezi omume ha na-eme,+
Ma ihe na-agụ ndị aghụghọ agụụ ga-eme ka ha ma n’ọnyà.+
7 Ihe onye ajọ omume na-ele anya ya na-ala n’iyi ma ọ nwụọ.
Ihe ọ na-atụ anya na ọ ga-eji ike ya mee anaghịzi enwe isi.+
9 Onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ* na-eji ọnụ ya ala onye agbata obi ya n’iyi,
Ma ihe ndị ezi omume ma na-anapụta ha.+
10 Àgwà ọma ndị ezi omume na-akpa na-eme ka ndị bi n’obodo na-enwe obi ụtọ,
A na-etikwa mkpu ọṅụ ma e bibie ndị ajọ omume.+
11 Ngọzi a na-agọzi ndị ezi omume na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’obodo,+
Ma ihe ndị ajọ omume na-ekwu na-emebi obodo.+
12 Onye na-enweghị uche na-akpọ onye agbata obi ya asị,
Ma onye na-aghọta ihe nke ọma na-agbachi nkịtị.+
13 Onye na-ekwutọ mmadụ na-agagharị na-akọsa ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara,+
Ma onye a tụkwasịrị obi anaghị ekwu ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara.
14 Ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ezigbo ntụziaka,
15 Onye ọ bụla nke kwere nkwa na ya ga-akwụ ego onye ọ na-amaghị bitere ma onye ahụ akwụghị ya,* ihe agaghị agaziri ya.+
Ma onye ọ bụla ọ na-anaghị adị ngwa ngwa ka ya na mmadụ kwekọrịta ihe ha ga-eme* anaghị aba ná nsogbu.
20 Jehova kpọrọ ndị obi ha jọrọ njọ* asị,+
Ma ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta na-eme ya obi ụtọ.+
22 Nwaanyị mara mma nke na-achọghị inwe ezi uche
Dị ka ọlaedo a gbanyere ézì n’imi.
23 Ihe na-agụ ndị ezi omume na-eme ka ha nweta ihe ọma,+
Ma ihe ndị ajọ omume na-atụ anya ya na-eme ka e wesa ha nnukwu iwe.
24 E nwere onye na-eji obi ya niile enye ndị ọzọ ihe, ma ya ana-enwetakwu ihe.+
E nwekwara onye na-anaghị enye ndị ọzọ ihe o kwesịrị inye ha, ma ya adaa ogbenye.+
25 Ihe ga-agaziri onye na-emesapụ aka,+
Onye na-enyejukwa ndị ọzọ mmiri afọ ka a ga-enyeju mmiri afọ.+
27 A ga-emere onye na-agbasi mbọ ike ka o mee ihe dị mma amara,+
Ma ihe ọjọọ ga-abịara onye na-agba mbọ ka o mee ihe ọjọọ.+