Ezikiel
11 Otu mmụọ* wee buru m buga n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ Jehova nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ.+ N’ọnụ ụzọ ámá ahụ, m hụrụ ụmụ nwoke iri abụọ na ise, bụ́ ndị isi ndị Izrel. Jeazanaya nwa Azọ na Pelataya nwa Benaya nọkwa ebe ahụ.+ 2 Chineke wee sị m: “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị na-akpa nkata ọjọọ, na-enyekwa ndị bi n’obodo a ndụmọdụ ọjọọ. 3 Ha na-asị, ‘Ọ̀ bụ na oge e ji arụ ụlọ erubeghị?+ Obodo a* bụ ite e ji esi nri.*+ Anyịnwa bụ anụ dị n’ime ya.’
4 “N’ihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma ihe a ga-eme ha. Buo amụma.”+
5 Mmụọ Jehova dakwasịrị m,+ Chineke asịkwa m: “Kwuo, sị, ‘Jehova sịrị: “Ndị Izrel, unu kwuru eziokwu. Ama m ihe unu na-eche n’echiche. 6 Unu egbuola ọtụtụ ndị n’obodo a. Unu emeekwala ka ozu ndị e gburu egbu ju n’okporo ámá ya dị iche iche.”’”+ 7 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụ ozu ndị ahụ unu tọgbọgasịrị n’obodo a bụ anụ. Ọ bụkwa obodo a bụ ite e ji esi nri.+ Ma, a ga-achụpụ unu n’obodo a.’”
8 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Unu na-atụ ụjọ mma agha,+ ma m ga-eme ka e jiri mma agha gbuo unu. 9 M ga-achụpụ unu n’obodo a ma nyefee unu n’aka ndị mba ọzọ. M ga-atakwa unu ahụhụ.+ 10 A ga-eji mma agha gbuo unu.+ M ga-ekpe unu ikpe n’ókè Izrel na mba ọzọ.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.+ 11 Obodo a agaghị abụrụ unu ite e ji esi nri. Unu agaghịkwa abụ anụ dị n’ime ya. M ga-ekpe unu ikpe n’ókè Izrel na mba ọzọ. 12 Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova. Unu edebeghị iwu m, unu emeghịkwa ihe m chọrọ,+ kama unu mere ihe mba ndị gbara unu gburugburu chọrọ.’”+
13 Ozugbo m buchara amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. M gbuziri ikpere n’ala, kpọọ isiala, jiri oké olu kwuo, sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ị̀ ga-ala ndị fọrọ n’Izrel n’iyi?”+
14 Jehova gwakwara m, sị: 15 “Nwa nke mmadụ, ndị bi na Jeruselem gwara ụmụnne gị, ya bụ, ụmụnne gị ndị nwere ike ịgbara ala, gwakwa ndị Izrel niile, sị, ‘Unu abịakwala Jehova nso. Ala a bụ nke anyị. E nyela anyị ya.’ 16 N’ihi ya, kwuo, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na m mere ka ha gaa biri ná mba dị iche iche dị anya, chụgakwa ha n’ala dị iche iche,+ ma m ga-abụrụ ha ụlọ nsọ obere oge ná mba dị iche iche ha gara biri.”’+
17 “N’ihi ya, kwuo, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “M ga-esi ná mba dị iche iche kpọkọta unu, sikwa n’ala dị iche iche a chụgara unu chịkọta unu. M ga-enyekwa unu ala Izrel.+ 18 Unu ga-alọtakwa ebe ahụ wepụsịa ihe niile na-asọ oyi dị na ya, kwụsịkwa arụ niile a na-akpa na ya.+ 19 M ga-eme ka unu nwee otu obi,+ meekwa ka mmụọ m na-akpa ike n’ahụ́ unu.+ M ga-eme ka unu gharazie inwe obi nkume+ ma mee ka obi unu dị nro.*+ 20 Ọ ga-eme ka unu na-edebe iwu m, na-eme ihe m kpebiri, na-erubekwara m isi. Unu ga-abụ ndị m. Mụnwa ga-abụkwa Chineke unu.”’
21 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, “Ma, a bịa ná ndị nke obi ha ka dị n’ime ihe ndị na-asọ oyi nakwa n’ịkpa arụ dị iche iche, m ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ha metara.”’”
22 Ndị cherob ahụ weliziri nku ha. Wiil ndị ahụ dịkwa ha nso.+ Ebube Chineke Izrel dịkwa n’elu ha.+ 23 Ebube Jehova+ sikwa n’obodo ahụ gbagoo ma kwụsị n’elu ugwu dị n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.+ 24 N’ọhụụ ahụ mmụọ Chineke mere ka m hụ, otu mmụọ* buuru m buga Kaldia, bụ́ ebe ndị ahụ a dọọrọ n’agha nọ. Otú a ka ọhụụ a m hụrụ si gwụ. 25 M gwawaziri ndị ahụ a dọọrọ n’agha ihe niile Jehova gosiri m.