Ọrụ Ndịozi
27 Ebe e kpebiri na ọ bụ ụgbọ mmiri ka a ga-eji ebuga anyị Ịtali,+ ha nyefere ma Pọl ma ụfọdụ ndị mkpọrọ ọzọ n’aka otu onyeisi ndị agha aha ya bụ Juliọs, onye so n’ìgwè ndị agha a na-akpọ Ọgọstọs. 2 Anyị banyere n’otu ụgbọ mmiri nke si Adramitiọm, nke chọrọ ịga n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị n’ụsọ osimiri ná mpaghara Eshia, ụgbọ mmiri ahụ eburu anyị gawa. Arịstakọs,+ onye Tesalonaịka nke dị na Masedonia, sokwa anyị. 3 N’echi ya, anyị kwụsịrị na Saịdọn. Juliọs mesoro Pọl otú dị mma. O kwekwara ka ọ gakwuru ndị enyi ya ka ha nyere ya aka.
4 Ụgbọ mmiri sizi ebe ahụ buru anyị gaa Saịprọs, bụ́ ebe anyị ruru ifufe akwụsị inye anyị nsogbu. 5 Anyị sikwa n’oké osimiri dị n’akụkụ Silishia na Pamfilia gaa kwụsị n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Maịra nke dị na Lishia. 6 N’ebe ahụ, onyeisi ndị agha ahụ hụrụ otu ụgbọ mmiri si Alegzandria na-aga Ịtali, ya asị anyị banye na ya, anyị abanye. 7 Ụgbọ mmiri ahụ bu anyị nọ na-aga nwayọọ nwayọọ, ma, anyị mechara ruo Kinaịdọs ka ọtụtụ ụbọchị gachara. Ebe ọ bụkwa na ifufe ekweghị anyị na-aga ebe anyị chọrọ ịga, ndị kwọ ụgbọ ahụ kwọọrọ ya gaa n’akụkụ Krit, nke dị nso na Salmoni, bụ́ ebe anyị ruru ifufe akwụsị inye anyị nsogbu. 8 Ka anyị jisikwara ike kwọrọ ụgbọ na-aga, anyị bịaruru ebe a na-akpọ Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma, ebe dị nso na Lesia.
9 Ọtụtụ ụbọchị agaala. Iji ụgbọ mmiri aga ebe ọ bụla ugbu a nwekwara ike ịta isi mmadụ n’ihi na Ụbọchị Ikpuchi Mmehie+ ndị mmadụ na-ebu ọnụ agafeedịla.* N’ihi ya, Pọl tụụrụ ha aro, 10 sị: “Ka anyị cheretụnụ. Anyị gawa ije a ugbu a, ụgbọ anyị ga-ekpu. Ihe niile anyị ji ga-ala n’iyi. Anyị nwekwara ike ịnwụ.” 11 Ma, onyeisi ndị agha ahụ gere onye na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ na onye nwe ụgbọ mmiri ahụ ntị kama ige Pọl ntị. 12 Ma ebe ọ bụ na n’oge oyi, ọ dịghị mma ịnọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ụgbọ ahụ tụrụ aro ka a kwọrọ ụgbọ ahụ gawa, ka ha lee ma è nwere otú ha ga-esi ruo ọdụ ụgbọ mmiri Finiks nke dị na Krit ma nọrọ ebe ahụ ka oge oyi gafee. Ọdụ ụgbọ mmiri a chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ.
13 Mgbe ifufe nke si n’ebe ndịda na-efe nwayọọ nwayọọ, ha chere na ha ga-eru Finiks. Ha dọlitekwara nko e ji ejide ụgbọ mmiri* ma kwọrọ ụgbọ ahụ na-aga Krit. Ha nọ na-aga mmiri ahụ akụkụ akụkụ. 14 Ma obere oge, oké ifufe a na-akpọ Yuroakwilo* malitere ife. 15 Ifufe ahụ busiwere ụgbọ mmiri ahụ ike, nke mere na o nweghịzi ike ịga ebe a chọrọ ka ọ gaa. Anyị enweghịkwa ike ime ihe ọ bụla gbasara ya. N’ihi ya, anyị hapụrụ ka ifufe ahụ buru anyị na-aga. 16 Ma, anyị ruru n’otu obere agwaetiti a na-akpọ Kọda, ebe ifufe ahụ kwụsịtụrụ inye anyị nsogbu. Ma, ibubata ụgbọ epeepe* na-adị n’azụ ụgbọ anyị siiri anyị ike. 17 Ma, mgbe anyị bubatachara ya n’ime ụgbọ mmiri ahụ, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ ji ụdọ kesie okpuru ụgbọ ahụ ike. Ebe ha na-atụkwa ụjọ na ụgbọ mmiri ha ga-akpụ n’ala na Sietis,* ha tọturu ihe e ji eduzi ụgbọ mmiri, ifufe eburu ụgbọ anyị na-aga. 18 Ma n’echi ya, ha tụpụsịrị ihe ụfọdụ dị n’ụgbọ mmiri ahụ, n’ihi na oké ifufe ahụ nọ na-aṅagharịsi ụgbọ anyị ike. 19 N’ụbọchị nke atọ, ha tụpụsịrị ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ.
20 Mgbe anyanwụ ma ọ bụ kpakpando na-apụtaghị ruo ọtụtụ ụbọchị, oké ifufe mmiri ana-efekwa anyị, anyị kwụsịrị inwe olileanya na a ga-azọpụta anyị. 21 Mgbe anyị nọchara oge a niile n’erighị nri, Pọl biliri, sị: “A sị na unu gere m ntị, anyị agaraghị esi na Krit pụọ, anyị agaraghịkwa ata ahụhụ niile a anyị na-ata ma ọ bụ tụpụsịa ihe ndị ahụ anyị tụpụsịrị.+ 22 Otú o sina dị, obi sie unu ike, n’ihi na o nweghị onye* ọ bụla n’ime unu ga-ala n’iyi, naanị ụgbọ a ga-ala n’iyi. 23 N’abalị ụnyaahụ, Chineke, onye m bụ nke ya na onye m na-efe, zitere otu mmụọ ozi,+ ya abịa guzoro m nso, 24 sị: ‘Pọl, ụjọ atụla gị. Gị na Siza ga-ahụ.+ Chineke ga-azọpụta gị na ndị niile gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri a.’ 25 N’ihi ya, obi sie unu ike maka na ekwere m na Chineke ga-eme ihe a mmụọ ozi gwara m. 26 Ma, ụgbọ anyị ga-akpọkasị, anyịnwa apụta n’ikpere mmiri n’otu agwaetiti.”+
27 Mgbe ifufe nọ na-aṅagharị ụgbọ mmiri anyị n’elu oké osimiri Edria ruo abalị iri na anọ, n’etiti abalị, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ malitere iche na ha eruwela elu ala nso. 28 Ha wee tụọ otú ebe anyị nọ n’osimiri ahụ dịruru n’omimi ma hụ na ọ dị otu narị amaụkwụ na iri abụọ (120).* Ha agatụkwuokwa n’ihu, tụọ ya ọzọ, hụ na ọ dị amaụkwụ iri itoolu.* 29 Ma, ụjọ nọ na-atụ ndị na-akwọ ụgbọ ahụ na o nwere ike ịkụ n’elu nkume kpuo. N’ihi ya, ha si n’azụ ya tụpụ nko anọ e ji ejide ụgbọ mmiri,* obi ha niile abụrụ ka chi bọwa ngwa ngwa. 30 Ma ndị ahụ na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ chọwara isi n’ụgbọ ahụ pụọ. Ọ bụ ya mere ha ji bido iwetu ụgbọ epeepe na mmiri ahụ. Ma, ha nọ na-eme ka à ga-asị na ha chọrọ isi n’ihu ụgbọ ahụ wedasịa nko ndị ahụ e ji ejide ụgbọ mmiri.* 31 Mgbe Pọl matara ihe a, ọ gwara onyeisi ndị agha ahụ na ndị agha ya, sị: “Ọ bụrụ na ndị a esi n’ụgbọ a pụọ, a gaghị azọpụta unu.”+ 32 Ndị agha ahụ wee gbubie ụdọ ji ụgbọ epeepe ahụ ma hapụ ya ka ọ dapụ.
33 Ma ka chi na-achọ ịbọ, Pọl gbara ha niile ume ka ha rie nri. Ọ sịrị: “Taa mere ya abalị iri na anọ unu nọ na-atụ anya ịpụta ná nsogbu a, o nwebeghịkwa ihe unu riri. 34 N’ihi ya, gbalịanụ rie nri maka ọdịmma unu. O nweghị onye n’ime unu otu ntutu isi ya ga-ala n’iyi.” 35 Mgbe o kwuchara ihe a, o weere otu ogbe achịcha, kelee Chineke n’ihu ha niile, nyawaa ya ma bido ịta ya. 36 Ihe a o mere mesiri ha obi ike, ha amalitekwa iri ihe. 37 Anyị niile nọ n’ụgbọ ahụ dị narị mmadụ* abụọ na iri asaa na isii (276). 38 Mgbe ha rijuru afọ, ha bidoro na-atụba ọka wit na mmiri ahụ ka ụgbọ ahụ dị fere fere.+
39 Mgbe chi bọrọ, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ enweghị ike ịmata ebe anyị nọ.+ Ma ha hụrụ mbara ala nwere ọnụ mmiri, chọọkwa ịkwụsị ụgbọ ahụ ebe ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ha omume. 40 N’ihi ya, ha gbubiri nko ndị ahụ e ji ejide ụgbọ mmiri,* hapụkwa ha ha adaba na mmiri ahụ. Ha tọpụkwara ụdọ e ji kedo ụmara ụgbọ ahụ ozugbo. Mgbe ha dọlitechara ákwà na-adị n’ihu ụgbọ mmiri ka ifufe na-ebu ya, ha gawara n’ikpere osimiri ahụ. 41 Mgbe ha kwọọrọ ụgbọ ahụ na-aga ka ha banye na mbara ala ahụ, ụgbọ ahụ kụrụ n’elu otu mkputamkpu ájá, nke mmiri na-asọ n’akụkụ ya abụọ. Ihu ya wee tọ ebe ahụ, ebili mmiri amalitekwa ịkụrisị azụ ya.+ 42 Ndị agha ahụ wee kpebie na ha ga-egbu ndị mkpọrọ ahụ, ka onye ọ bụla ghara ịwụba na mmiri ahụ, gwuru mmiri gbalaga. 43 Ma onyeisi ndị agha ahụ achọghị ka ihe ọ bụla mee Pọl. N’ihi ya, o kweghị ka ndị agha ya mee ihe ahụ ha chọrọ ime. Ọ gwara ndị ma egwu mmiri ka ha maba na mmiri buru ụzọ gwuru mmiri pụta n’elu ala. 44 Ọ gwakwara ndị ọzọ ka ha soro ha n’azụ, ka ụfọdụ jide ibé osisi aka, ndị ọzọ ejide ihe ụfọdụ si n’ụgbọ mmiri ahụ aka. Otú a ka mmadụ niile si pụta n’elu ala n’enweghị ihe mere ha.+