Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ndị Eze 21
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

      • Ehab chọrọ ịnara Nebọt ubi vaịn ya (1-4)

      • Jezibel kpara nkata, e gbuo Nebọt (5-16)

      • Ịlaịja kwuru ihe ga-eme Ehab (17-26)

      • Ehab wedara onwe ya ala (27-29)

1 Ndị Eze 21:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 19:17, 18

1 Ndị Eze 21:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 25:23; Ọg 36:7

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    4/2017, p. 24

    Ụlọ Nche,

    2/1/2014, p. 13

    8/1/1997, p. 13

1 Ndị Eze 21:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

1 Ndị Eze 21:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:31; 18:4; 19:2; 21:25

1 Ndị Eze 21:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Maị 2:1; 7:3

1 Ndị Eze 21:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 9:38; Es 8:8
  • +Di 16:18

1 Ndị Eze 21:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 20:16; Di 17:6
  • +Ọp 22:28
  • +Le 24:16; Jn 10:33

1 Ndị Eze 21:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Em 5:12; Hab 1:4
  • +2Ez 9:25, 26; Ek 4:1

1 Ndị Eze 21:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ek 5:8; 8:14; Hab 1:13

1 Ndị Eze 21:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 21:7

1 Ndị Eze 21:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 17:1

1 Ndị Eze 21:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:29

1 Ndị Eze 21:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 4:8, 10
  • +Di 5:21; Hab 2:9
  • +1Ez 22:37, 38; 2Ez 9:25, 26

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/2014, p. 15

1 Ndị Eze 21:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “i reela onwe gị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 18:17; Em 5:10
  • +1Ez 16:30

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/2014, p. 14-15

1 Ndị Eze 21:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:7, 17
  • +2Ez 9:7-9

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/2014, p. 15

1 Ndị Eze 21:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:25-29
  • +1Ez 16:3, 11

1 Ndị Eze 21:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 9:10, 35

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Jeremaya, p. 120-121

1 Ndị Eze 21:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 14:11; 16:4

1 Ndị Eze 21:25

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ya eree onwe ya.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:30
  • +1Ez 16:31; 2Ih 22:2, 3; Mkp 2:20

1 Ndị Eze 21:26

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:28; Di 9:5

1 Ndị Eze 21:27

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/2014, p. 15

1 Ndị Eze 21:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 78:34
  • +2Ez 9:25, 26; 10:7, 11

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    10/2021, p. 3

    Ụlọ Nche,

    2/1/2014, p. 15

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

1 Eze 21:1Jos 19:17, 18
1 Eze 21:3Le 25:23; Ọg 36:7
1 Eze 21:51Ez 16:31; 18:4; 19:2; 21:25
1 Eze 21:7Maị 2:1; 7:3
1 Eze 21:8Neh 9:38; Es 8:8
1 Eze 21:8Di 16:18
1 Eze 21:10Ọp 20:16; Di 17:6
1 Eze 21:10Ọp 22:28
1 Eze 21:10Le 24:16; Jn 10:33
1 Eze 21:13Em 5:12; Hab 1:4
1 Eze 21:132Ez 9:25, 26; Ek 4:1
1 Eze 21:14Ek 5:8; 8:14; Hab 1:13
1 Eze 21:151Ez 21:7
1 Eze 21:171Ez 17:1
1 Eze 21:181Ez 16:29
1 Eze 21:19Je 4:8, 10
1 Eze 21:19Di 5:21; Hab 2:9
1 Eze 21:191Ez 22:37, 38; 2Ez 9:25, 26
1 Eze 21:201Ez 18:17; Em 5:10
1 Eze 21:201Ez 16:30
1 Eze 21:212Ez 10:7, 17
1 Eze 21:212Ez 9:7-9
1 Eze 21:221Ez 15:25-29
1 Eze 21:221Ez 16:3, 11
1 Eze 21:232Ez 9:10, 35
1 Eze 21:241Ez 14:11; 16:4
1 Eze 21:251Ez 16:30
1 Eze 21:251Ez 16:31; 2Ih 22:2, 3; Mkp 2:20
1 Eze 21:26Ọp 23:28; Di 9:5
1 Eze 21:29Ọm 78:34
1 Eze 21:292Ez 9:25, 26; 10:7, 11
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ndị Eze 21:1-29

Ndị Eze nke Mbụ

21 Mgbe ihe ndị a mechara, e nwere ihe merenụ gbasara otu ubi vaịn bụ́ nke Nebọt onye Jezril. Ubi vaịn a dị na Jezril,+ n’akụkụ obí Ehab eze Sameria. 2 Ehab gwara Nebọt, sị: “Nye m ubi vaịn gị ka m jiri ya mere ubi akwụkwọ nri, n’ihi na ọ dị nso n’ụlọ m. M ga-enye gị ubi vaịn ka ya mma ka i jiri dochie ya. Ma ọ bụkwanụ, ị chọọ, mụ enye gị ego ole o ruru.” 3 Ma Nebọt sịrị Ehab: “Tụfịakwa! Agaghị m enye gị ihe m ketara n’aka nna nna m hà, maka na Jehova sị anyị anwakwala ya anwa.”+ 4 Ehab baziri n’ụlọ ya. Ma obi adịghị ya mma, ihu ya gbarụkwara agbarụ n’ihi ihe Nebọt onye Jezril gwara ya. Ọ gwara ya, sị: “Agaghị m enye gị ihe m ketara n’aka nna nna m hà.” Ehab wee dinara n’àkwà* ya, chee ihu n’ahụ́ ụlọ, jụkwa iri nri.

5 Jezibel nwunye ya+ bịakwutekwara ya ma jụọ ya, sị: “Gịnị mere obi ji na-ajọ gị njọ nke na i kweghị eri nri?” 6 Ya asị ya: “M gwara Nebọt onye Jezril, sị, ‘Resị m ubi vaịn gị. Ma ọ bụkwanụ, ị chọọ, mụ enye gị ubi vaịn ọzọ ka i jiri dochie ya.’ Ma ọ sịrị, ‘Agaghị m enye gị ubi vaịn m.’” 7 Jezibel nwunye ya asị ya: “Ọ́ bụghị gịnwa na-achị Izrel? Bilie rie nri, ka obi bụrụkwa gị sọ aṅụrị. M ga-enye gị ubi vaịn Nebọt onye Jezril.”+ 8 O deziri akwụkwọ ozi n’aha Ehab, jirikwa ihe eze ji aka ihe akara kaa ha akara,+ ma zigara ha ndị okenye+ na ndị a ma ama bi n’obodo Nebọt hà. 9 Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ: “Wepụtanụ otu ụbọchị unu ga-ebu ọnụ, kọsaakwanụ ya, gwakwanụ Nebọt ka ọ nọrọ n’isi oche. 10 Gwakwanụ ụmụ nwoke abụọ na-abaghị uru ka ha nọrọ n’ihu ya bo ya ebubo+ na ọ bụrụ Chineke na eze ọnụ.+ Kpọpụtazienụ ya n’azụ obodo ma jiri nkume tụgbuo ya.”+

11 Ndị okenye na ndị a ma ama n’obodo ya mere nnọọ ihe Jezibel dere n’akwụkwọ ozi ahụ o ziteere ha. 12 Ha kpọsara ụbọchị a ga-ebu ọnụ, gwakwa Nebọt ka ọ nọrọ n’isi oche n’ụbọchị ahụ. 13 N’ụbọchị ahụ, ụmụ nwoke abụọ ndị na-abaghị uru batara ma nọrọ ọdụ n’ihu ya. Ha malitekwara ibo ya ebubo n’ihu ndị nọ ebe ahụ. Ha sịrị: “Nebọt bụrụ Chineke na eze ọnụ!”+ Mgbe ha kwuchara ihe a, a kpọpụtara Nebọt n’azụ obodo ahụ ma jiri nkume tụgbuo ya.+ 14 Ha zigakwaara Jezibel ozi, sị: “A tụgbuola Nebọt na nkume.”+

15 Ozugbo Jezibel nụrụ na a tụgbuola Nebọt na nkume, ọ gwara Ehab, sị: “Gaa weghara ubi vaịn ahụ Nebọt onye Jezril+ jụrụ iresị gị, n’ihi na ọ nwụọla, ọ dịghịzi ndụ.” 16 Ozugbo Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, ọ gawara ka o weghara ubi vaịn Nebọt onye Jezril.

17 Ma Jehova gwara Ịlaịja+ onye Tishbe, sị: 18 “Bilie, gaa Sameria ka ị hụ Ehab eze Izrel.+ Ọ nọ n’ubi vaịn Nebọt. Ọ gara ebe ahụ ka o weghara ya. 19 Gwa ya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ kwa i gbuola mmadụ,+ wegharakwa ala ya?”’+ Gwakwa ya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “N’ebe ahụ nkịta rachara ọbara Nebọt ka nkịta ga-aracha ọbara nke gị.”’”+

20 Ehab wee sị Ịlaịja: “Onye iro m,+ ị̀ chọrọkwala m bịa?” Ya asị ya: “Achọrọla m gị bịa. Chineke kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na i siri ọnwụ* na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova,+ 21 m ga-eme ka ọdachi dakwasị gị. M ga-ebibi gị. M ga-egbu ma nwa nwoke ọ bụla si n’ezinụlọ gị+ ma onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ma onye na-enweghị ume n’Izrel.+ 22 M ga-emekwa ka ezinụlọ gị dịrị ka ezinụlọ Jeroboam+ nwa Nibat na ezinụlọ Beasha+ nwa Ahaịja, n’ihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka ndị Izrel mehie.’ 23 Jehova kwukwara gbasara Jezibel, sị: ‘Nkịta ga-eri Jezibel n’ala dị na Jezril.+ 24 Onye ezinụlọ Ehab ọ bụla nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ozu ya. Onye nke nwụrụ n’ọhịa, nnụnụ ga-eri ozu ya.+ 25 N’eziokwu, e nwetụbeghị onye dị ka Ehab.+ Jezibel nwunye ya duhiere ya, ya esie ọnwụ* na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova.+ 26 Ọ kpara arụ na-enweghị atụ, gaa fewe arụsị dị iche iche na-asọ oyi,* otú ndị Amọraịt niile mere, ndị Jehova chụpụrụ n’ala ha, nye ya ndị Izrel.’”+

27 Ozugbo Ehab nụrụ ihe ndị a, ọ dọwara uwe ya, yiri ákwà iru uju, na-ebukwa ọnụ. Ọ na-eyi ákwà iru uju ahụ alakpu, ọ na-ejegharịkwa ka onye ike ụwa gwụrụ. 28 Jehova gwaziri Ịlaịja onye Tishbe, sị: 29 “Ọ̀ kwa ị hụrụ otú Ehab si weda onwe ya ala n’ihi m?+ Ebe ọ bụ na o wedara onwe ya ala n’ihi m, agaghị m eme ka ọdachi ahụ dakwasị ezinụlọ ya n’oge ọ nọ ndụ. M ga-eme ka ọdachi ahụ dakwasị ezinụlọ ya ma nwa ya chịwa.”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya