Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ihe E Mere 17
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

      • Jehoshafat malitere ịchị Juda (1-6)

      • A gara kụziere ndị nọ n’obodo ndị dị na Juda ihe (7-9)

      • Ndị agha Jehoshafat (10-19)

2 Ihe E Mere 17:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:24; 22:41

2 Ihe E Mere 17:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 15:8

2 Ihe E Mere 17:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 8:15

2 Ihe E Mere 17:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:29; 2Ih 26:1, 5
  • +1Ez 12:28-30; 13:33

2 Ihe E Mere 17:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 9:4, 5; Ọm 132:12
  • +2Ih 18:1

2 Ihe E Mere 17:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 22:42, 43
  • +Di 7:5

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/15/2009, p. 12

2 Ihe E Mere 17:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 33:8, 10; Mal 2:7

2 Ihe E Mere 17:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 31:11; Jos 1:7, 8; Neh 8:7

2 Ihe E Mere 17:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 18:1
  • +2Ih 14:2, 6
  • +1Ez 9:19; 2Ih 8:3, 4

2 Ihe E Mere 17:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 13:3; 26:11-13

2 Ihe E Mere 17:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 49:27
  • +2Ih 14:8

2 Ihe E Mere 17:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 11:5, 23

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Ihe 17:11Ez 15:24; 22:41
2 Ihe 17:22Ih 15:8
2 Ihe 17:32Sa 8:15
2 Ihe 17:4Di 4:29; 2Ih 26:1, 5
2 Ihe 17:41Ez 12:28-30; 13:33
2 Ihe 17:51Ez 9:4, 5; Ọm 132:12
2 Ihe 17:52Ih 18:1
2 Ihe 17:61Ez 22:42, 43
2 Ihe 17:6Di 7:5
2 Ihe 17:8Di 33:8, 10; Mal 2:7
2 Ihe 17:9Di 31:11; Jos 1:7, 8; Neh 8:7
2 Ihe 17:122Ih 18:1
2 Ihe 17:122Ih 14:2, 6
2 Ihe 17:121Ez 9:19; 2Ih 8:3, 4
2 Ihe 17:142Ih 13:3; 26:11-13
2 Ihe 17:17Je 49:27
2 Ihe 17:172Ih 14:8
2 Ihe 17:192Ih 11:5, 23
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ihe E Mere 17:1-19

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

17 Jehoshafat nwa Esa+ nọchiri ya, malite ịchị. O mekwara ka ọchịchị ya sie ike n’Izrel. 2 O dowekwara ndị agha n’obodo niile a rụsiri ike na Juda, meekwa ka e nwee ebe ndị agha na-anọ eche nche n’ala Juda nakwa n’obodo ndị dị n’Ifrem, ndị Esa nna ya weghaara.+ 3 Jehova nọnyeere Jehoshafat n’ihi na ọ kpara àgwà ka Devid nna nna ya,+ ọ chọghịkwa Bel. 4 Kama, ọ bụ Chineke nke nna ya ka ọ chọrọ.+ O mekwara ihe iwu ya kwuru. Ọ kpaghị àgwà ka ndị Izrel.+ 5 Jehova mere ka alaeze ya sie ezigbo ike.+ Ndị Juda niile nọkwa na-enye Jehoshafat onyinye, ya enwee akụnụba, a na-akwanyere ya ezigbo ùgwù.+ 6 Obi bịakwara sie ya ike ịna-eso ụzọ Jehova. O wepụdịrị ebe ndị dị elu+ na ogwe osisi arụsị*+ na Juda.

7 N’afọ nke atọ n’ọchịchị ya, ọ kpọkọrọ ndị o mere ndị isi. Ha bụ Ben-hel, Obedaya, Zekaraya, Netanel, na Mịkaya. O ziri ha ka ha gaa kụziere ndị nọ n’obodo ndị dị na Juda ihe. 8 Ndị Livaị sokwa ha. Ha bụ Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramọt, Jehonatan, Adọnaịja, Tobaịja, na Tob-adonaịja. Elishama na Jehoram, bụ́ ndị nchụàjà, sokwa ha.+ 9 Ha jikwa akwụkwọ e dere Iwu Jehova+ malite ịkụziri ndị mmadụ ihe na Juda. Ha gazuru ebe niile na Juda na-akụziri ndị mmadụ ihe.

10 Ụjọ Jehova nọkwa na-atụ alaeze niile gbara Juda gburugburu. Ha alụsoghịkwa Jehoshafat agha. 11 Ndị Filistia na-ewetara Jehoshafat onyinye, na-atụrụ ya ụtụ. Ndị Arab kpụtakwaara ya puku ebule asaa na narị asaa (7,700) nakwa puku mkpi asaa na narị asaa (7,700).

12 Jehoshafat nọ na-esikwu ike n’ọchịchị,+ na-arụkwa obodo ndị siri ike+ na obodo ndị a na-akwasa ihe+ na Juda. 13 Ọ rụrụ ọtụtụ ihe n’obodo ndị dị na Juda. O nwekwara ndị agha, ndị bụ́ dike n’agha, na Jeruselem. 14 E kere ha n’ìgwè n’ìgwè, ka ndị si n’otu ọnụmara nọrọ n’otu ìgwè. A bịa ná ndị si na Juda, Adna bụ onyeisi ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha. O nwere narị puku mmadụ atọ (300,000) bụ́ ndị dike n’agha.+ 15 Jehohenan nọ n’okpuru ya. Ọ bụkwa onyeisi narị puku mmadụ abụọ na puku iri asatọ (280,000). 16 Amasaya nwa Zikraị nọkwa n’okpuru ya. O wepụtara onwe ya ịna-arụ ọrụ Jehova. Ọ bụkwa onyeisi narị puku mmadụ abụọ (200,000) bụ́ ndị dike n’agha. 17 N’ebo Benjamin,+ e nwere Elayada bụ́ dike n’agha. Ọ bụkwa onyeisi narị puku mmadụ abụọ (200,000) ndị na-eji ụta na ọta.+ 18 Jehozabad nọ n’okpuru ya, bụrụkwa onyeisi otu narị puku ndị agha na puku iri asatọ (180,000). 19 Ọ bụ ndị a bụ ndị na-ejere eze ozi ma e wezụga ndị eze dowere n’obodo niile a rụsiri ike na Juda.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya