Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ihe E Mere 18
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

      • Jehoshafat na Ehab gbakọrọ aka na-eme ihe (1-11)

      • Mịkaya buru amụma na a ga-emeri ndị Izrel n’agha (12-27)

      • E gburu Ehab na Remọt-gilied (28-34)

2 Ihe E Mere 18:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 17:5
  • +1Ez 16:28, 33; 21:25

2 Ihe E Mere 18:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 22:2-4; 2Ih 19:2
  • +Di 4:41-43; 1Ih 6:77, 80

2 Ihe E Mere 18:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 2:1; 1Ez 22:5, 6

2 Ihe E Mere 18:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 3:11
  • +1Ez 22:7, 8

2 Ihe E Mere 18:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 18:4; 19:9, 10
  • +Jer 38:4

2 Ihe E Mere 18:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 22:9-12

2 Ihe E Mere 18:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Maị 3:5

2 Ihe E Mere 18:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 22:13-17
  • +Aịz 30:9, 10

2 Ihe E Mere 18:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 23:28; Ọrụ 20:27

2 Ihe E Mere 18:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:14, 17; Ọg 27:16, 17

2 Ihe E Mere 18:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 22:18

2 Ihe E Mere 18:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 6:1; Ezi 1:26; Mkp 20:11
  • +Job 1:6; Da 7:9, 10
  • +1Ez 22:19-23

2 Ihe E Mere 18:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Otu mmụọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 104:4

2 Ihe E Mere 18:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 19:14; Ezi 14:9

2 Ihe E Mere 18:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 18:10
  • +2Ih 18:7
  • +Jer 20:2; Mk 14:65
  • +1Ez 22:24-28

2 Ihe E Mere 18:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 16:10; Ọrụ 5:18

2 Ihe E Mere 18:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 16:29

2 Ihe E Mere 18:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 20:8; 1Ez 22:29-33; 2Ih 18:2

2 Ihe E Mere 18:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 14:10; 2Ih 13:14

2 Ihe E Mere 18:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 22:34, 35

2 Ihe E Mere 18:34

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 18:22

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Ihe 18:12Ih 17:5
2 Ihe 18:11Ez 16:28, 33; 21:25
2 Ihe 18:21Ez 22:2-4; 2Ih 19:2
2 Ihe 18:2Di 4:41-43; 1Ih 6:77, 80
2 Ihe 18:42Sa 2:1; 1Ez 22:5, 6
2 Ihe 18:62Ez 3:11
2 Ihe 18:61Ez 22:7, 8
2 Ihe 18:71Ez 18:4; 19:9, 10
2 Ihe 18:7Jer 38:4
2 Ihe 18:81Ez 22:9-12
2 Ihe 18:11Maị 3:5
2 Ihe 18:121Ez 22:13-17
2 Ihe 18:12Aịz 30:9, 10
2 Ihe 18:13Jer 23:28; Ọrụ 20:27
2 Ihe 18:16Le 26:14, 17; Ọg 27:16, 17
2 Ihe 18:171Ez 22:18
2 Ihe 18:18Aịz 6:1; Ezi 1:26; Mkp 20:11
2 Ihe 18:18Job 1:6; Da 7:9, 10
2 Ihe 18:181Ez 22:19-23
2 Ihe 18:20Ọm 104:4
2 Ihe 18:22Aịz 19:14; Ezi 14:9
2 Ihe 18:232Ih 18:10
2 Ihe 18:232Ih 18:7
2 Ihe 18:23Jer 20:2; Mk 14:65
2 Ihe 18:231Ez 22:24-28
2 Ihe 18:262Ih 16:10; Ọrụ 5:18
2 Ihe 18:27Ọg 16:29
2 Ihe 18:28Jos 20:8; 1Ez 22:29-33; 2Ih 18:2
2 Ihe 18:31Ọp 14:10; 2Ih 13:14
2 Ihe 18:331Ez 22:34, 35
2 Ihe 18:342Ih 18:22
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ihe E Mere 18:1-34

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

18 Jehoshafat nwere akụnụba. A na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.+ Ma, ya na Ehab gọrọ ọgọ.+ 2 Ka afọ ole na ole gachara, Jehoshafat gara Sameria+ ka ọ hụ Ehab. Mgbe o ruru, Ehab chụrụ ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi n’àjà maka ya na ndị ya na ha so. Ọ rịọsikwara ya ike ka o soro ya gaa lụso ndị Remọt-gilied agha.+ 3 Ehab eze Izrel jụkwara Jehoshafat eze Juda, sị: “Ị̀ ga-eso m gaa Remọt-gilied?” Ya asị ya: “Mụ na gị bụ otu. Ndị m na ndị gị bụkwa otu. Anyị ga-eso gị gaa agha.”

4 Ma, Jehoshafat sịrị eze Izrel: “Biko, burugodị ụzọ jụta ihe Jehova chọrọ ka e mee.”+ 5 Eze Izrel wee kpọkọọ narị ndị amụma anọ (400), jụọ ha, sị: “Ọ̀ bụ anyị gaa lụso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ anyị agala?” Ha asị ya: “Gawa, ezi Chineke ga-enyefe ya n’aka eze.”

6 Ma Jehoshafat jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ na e nweghị onye amụma Jehova ebe a?+ Ka anyị si n’aka ya jụọkwa Chineke ase.”+ 7 Eze Izrel asị Jehoshafat: “A ka nwere otu nwoke+ anyị ga-esi n’aka ya jụọ Jehova ase. Ma akpọrọ m ya asị, n’ihi na o nweghị mgbe ọ na-eburu m amụma ihe ọma, kama, ọ na-eburu m amụma ihe ọjọọ mgbe niile.+ Ọ bụ Mịkaya nwa Imla.” Ma, Jehoshafat sịrị ya: “Eze, ekwula otú ahụ.”

8 Eze Izrel wee kpọọ otu onye na-eje ozi n’obí ya, sị ya: “Gaa ọsọ ọsọ kpọta Mịkaya nwa Imla.”+ 9 N’oge ahụ, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda yicha uwe ndị eze, nọrọkwa ọdụ n’ocheeze ha. Ha nọ n’ebe a na-azọcha ọka, nke dị n’ọnụ ụzọ ámá Sameria. Ndị amụma niile ahụ nọkwa n’ihu ha na-ebu amụma. 10 Zedekaya nwa Keneana chịkwa mpi ndị o ji ígwè rụọ bịakwute Ehab ma sị ya: “Jehova kwuru, sị, ‘Ị ga-eji mpi ndị a na-egbu ndị Siria ruo mgbe i gbuchara ha.’” 11 Ndị amụma niile ahụ nọkwa na-ebu otu ihe ahụ n’amụma, na-asị: “Gawa Remọt-gilied. Ị ga-emeri.+ Jehova ga-enyefe ya n’aka eze.”

12 Onye ahụ gara ịkpọ Mịkaya gwara ya, sị: “Ndị amụma niile na-agwa eze ihe dị mma. Biko, gwa ya ihe dị mma,+ ka ihe ị ga-agwa ya na nke hanwa gwara ya bụrụ otu.”+ 13 Ma Mịkaya sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na ọ bụ ihe Chineke m kwuru ka m ga-ekwu.”+ 14 Ọ bịakwuteziri eze, eze asị ya: “Mịkaya, ọ̀ bụ anyị gaa lụso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ anyị agala?” Mịkaya asị ya ozugbo ahụ: “Gaanụ, unu ga-emeri. A ga-enyefekwa ya n’aka unu.” 15 Eze asị ya: “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi n’aha Jehova na ị gaghị agwa m ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị naanị eziokwu?” 16 Ya asịzie ya: “M na-ahụ ka a chụsasịrị ndị Izrel niile n’ugwu, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ Jehova asị: ‘O nweghị ndị nwe ndị a. Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’”

17 Eze Izrel asịzie Jehoshafat: “Ọ̀ kwa m gwara gị agwa na ọ gaghị eburu m amụma ihe ọma, kama, naanị amụma ihe ọjọọ?”+

18 Mịkaya asị: “Nụrụnụ ihe Jehova chọrọ ka m gwa unu: M hụrụ ka Jehova nọ ọdụ n’ocheeze ya+ nakwa ka ìgwè ndị mmụọ ozi niile nọ n’eluigwe+ guzo n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.+ 19 Jehova asị, ‘Ònye ga-arafu Ehab eze Izrel, ka o wee gaa nwụọ na Remọt-gilied?’ Ha ebido na-ekwu ihe dị iche iche. Otu onye kwuo otu ihe, onye ọzọ ekwuo ihe ọzọ. 20 Otu mmụọ ozi*+ mechara bịa guzo n’ihu Jehova, sị, ‘M ga-arafu ya.’ Jehova asị ya, ‘Olee otú ị ga-esi arafu ya?’ 21 Ya asị, ‘M ga-aga mee ka ndị amụma ya niile ghaara ya ụgha.’ Chineke asị ya, ‘Ị ga-arafu ya, ije gị ga-enwekwa isi. Gaa rafuo ya.’ 22 Ugbu a, Jehova emeela ka ndị amụma gị ndị a ghaara gị ụgha.+ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ekpebiela na ihe ọjọọ ga-eme gị.”

23 Zedekaya+ nwa Keneana wee bịaruo Mịkaya+ nso ma maa ya ụra,+ sị: “Olee nnọọ otú mmụọ Jehova si hapụ m gaa gwawa gị okwu?”+ 24 Mịkaya asị ya: “Ụbọchị ị ga-ama otú o si hapụ gị bụ ụbọchị ị ga-agbaba n’ime ime ụlọ gị zoo.” 25 Eze Izrel asị: “Kpọrọnụ Mịkaya kpọgara Emọn bụ́ onyeisi obodo nakwa Joash nwa eze. 26 Gwakwanụ ha, sị, ‘Eze kwuru, sị: “Tụbanụ onye a n’ụlọ mkpọrọ,+ na-enyekwanụ ya obere nri na obere mmiri ruo mgbe m lọtara n’udo.”’” 27 Ma Mịkaya sịrị: “Ị lọta n’udo, mara na Jehova agwaghị m okwu.”+ O kwukwara, sị: “Unu niile, burunụ ihe a m kwuru n’obi.”

28 Eze Izrel na Jehoshafat eze Juda wee gawa Remọt-gilied.+ 29 Eze Izrel wee sị Jehoshafat: “M ga-ejigharị ejiji banye n’ọgbọ agha, ma gịnwa ga-eyiri uwe eze nke gị.” Eze Izrel wee jigharịa ejiji, ha abanye n’ọgbọ agha. 30 Ma, eze Siria gwara ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ya, sị: “Unu alụsola onye ọ bụla ọgụ, ma onye ukwu ma onye nta, ma e wezụga eze Izrel.” 31 Ozugbo ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ahụ hụrụ Jehoshafat, ha kwuru n’obi ha, sị: “Ọ bụ eze Izrel.” Ha wee tụgharịa ka ha lụso Jehoshafat agha, ya amalite iti mkpu ka e nyere ya aka,+ Jehova Chineke enyere ya aka ozugbo, mee ka ha kwụsị ịchụ ya. 32 Ozugbo ndị isi ahụ na-agba ụgbọ ịnyịnya hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụ ya.

33 Ma, e nwere otu nwoke gbara ụta n’ebughị onye ọ bụla n’obi, ma ọ gbatara ya eze Izrel n’ebe e jikọrọ uwe agha ya. Eze asị onye na-anya ụgbọ ịnyịnya ya: “Tụgharịa, bupụ m n’ọgbọ agha a, n’ihi na e merụọla m ezigbo ahụ́.”+ 34 Agha ahụ bịara sie ezigbo ike n’ụbọchị ahụ, nke na a kwụwara eze Izrel ọtọ n’ụgbọ ịnyịnya ahụ chee ya ihu n’ebe ndị Siria nọ ruo mgbede. Ma, ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya