Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ihe E Mere 11
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

      • Ihe Rehoboam mere mgbe ọ na-achị (1-12)

      • Ndị Livaị ndị ji obi ha niile na-efe Chineke gara biri na Juda (13-17)

      • Ezinụlọ Rehoboam (18-23)

2 Ihe E Mere 11:1

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “a họrọ ahọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 49:27; 2Ih 14:8
  • +1Ez 12:21-24

2 Ihe E Mere 11:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 12:15

2 Ihe E Mere 11:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:31; 2Ih 10:15

2 Ihe E Mere 11:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 35:19; Mt 2:1
  • +Em 1:1

2 Ihe E Mere 11:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 28:18
  • +1Sa 22:1

2 Ihe E Mere 11:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 18:1
  • +1Sa 23:14

2 Ihe E Mere 11:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 32:9
  • +Jos 10:10; Jer 34:7

2 Ihe E Mere 11:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 19:42, 48
  • +Jos 14:14, 15; 2Sa 2:1

2 Ihe E Mere 11:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 35:2, 3
  • +1Ez 12:31, 32

2 Ihe E Mere 11:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ewu dị iche iche.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 13:33
  • +Le 17:7
  • +1Ez 12:26, 28

2 Ihe E Mere 11:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:11; 1Ih 22:1; 2Ih 15:8, 9; 30:10, 11

2 Ihe E Mere 11:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Sa 16:6; 17:13

2 Ihe E Mere 11:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 13:1; 18:33
  • +1Ez 15:1; 2Ih 12:16; Mt 1:7

2 Ihe E Mere 11:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 17:17

2 Ihe E Mere 11:23

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “o gosiri na o nwere nghọta.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 11:5, 11

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Ihe 11:1Je 49:27; 2Ih 14:8
2 Ihe 11:11Ez 12:21-24
2 Ihe 11:22Ih 12:15
2 Ihe 11:41Ez 11:31; 2Ih 10:15
2 Ihe 11:6Je 35:19; Mt 2:1
2 Ihe 11:6Em 1:1
2 Ihe 11:72Ih 28:18
2 Ihe 11:71Sa 22:1
2 Ihe 11:81Ih 18:1
2 Ihe 11:81Sa 23:14
2 Ihe 11:92Ih 32:9
2 Ihe 11:9Jos 10:10; Jer 34:7
2 Ihe 11:10Jos 19:42, 48
2 Ihe 11:10Jos 14:14, 15; 2Sa 2:1
2 Ihe 11:14Ọg 35:2, 3
2 Ihe 11:141Ez 12:31, 32
2 Ihe 11:151Ez 13:33
2 Ihe 11:15Le 17:7
2 Ihe 11:151Ez 12:26, 28
2 Ihe 11:16Di 12:11; 1Ih 22:1; 2Ih 15:8, 9; 30:10, 11
2 Ihe 11:181Sa 16:6; 17:13
2 Ihe 11:202Sa 13:1; 18:33
2 Ihe 11:201Ez 15:1; 2Ih 12:16; Mt 1:7
2 Ihe 11:21Di 17:17
2 Ihe 11:232Ih 11:5, 11
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ihe E Mere 11:1-23

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

11 Ozugbo Rehoboam lọrutere Jeruselem, ọ kpọkọrọ otu narị puku na puku iri asatọ (180,000) ndị agha a zụrụ azụ,* bụ́ ndị Juda na ndị Benjamin,+ ka ha gaa lụso ndị Izrel ndị ọzọ agha, ka Rehoboam nwee ike nwetaghachi alaeze ahụ niile.+ 2 Jehova wee gwa Shemaya,+ onye nke ezi Chineke, sị: 3 “Gwa Rehoboam nwa Solomọn eze Juda na ndị Izrel niile bi na Juda nakwa na Benjamin, sị, 4 ‘Jehova kwuru, sị: “Unu agala ịlụso ụmụnne unu agha. Onye ọ bụla n’ime unu laghachi n’ụlọ ya, n’ihi na ọ bụ m mere ihe a ji na-eme.”’”+ Ha wee laghachi otú Jehova kwuru. Ha alụsoghịkwa Jeroboam agha.

5 Rehoboam bi na Jeruselem n’oge ahụ. Ọ rụrụ obodo dị iche iche na Juda, rụsiekwa ha ike. 6 Obodo ndị ọzọ ọ rụsiri ike bụ Betlehem,+ Itam, Tekoa,+ 7 Bet-zọọ, Soko,+ Adọlam,+ 8 Gat,+ Marisha, Zif,+ 9 Adoreyim, Lekish,+ Azika,+ 10 Zora, Aịjalọn,+ na Hebrọn.+ Obodo ndị a a rụsiri ike dị na Juda na Benjamin. 11 Ọ rụsikwuru ebe ndị a rụsiri ike ike, dowekwa ndị agha na ha, na-ebugakwa nri, mmanụ, na mmanya n’ebe ndị ahụ. 12 O dowekwara ọta ukwu na ube n’obodo ndị ahụ niile. Ọ rụsikwuru ha nnọọ ike. Ọ nọgidekwara na-achị ndị Juda na ndị Benjamin.

13 Ndị nchụàjà na ndị Livaị, ndị bi n’ebe niile n’Izrel, si n’ebe dị iche iche ha bi bịa na-akwado ya. 14 Ndị Livaị hapụrụ ala ha nakwa ala anụmanụ ha na-ata ahịhịa+ bịa na Juda nakwa na Jeruselem, n’ihi na Jeroboam na ụmụ ya kwụsịrị ha ịrụ ọrụ ndị nchụàjà ha na-arụrụ Jehova.+ 15 Jeroboam họpụtaziri ndị nchụàjà nke ya ka ha nọrọ n’ebe ndị dị elu+ na-efe ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu*+ na ụmụ ehi ndị ọ kpụrụ.+ 16 Ndị ji obi ha niile na-achọ Jehova bụ́ Chineke Izrel si n’ebo niile n’Izrel soro ndị nchụàjà na ndị Livaị bịa Jeruselem ịchụrụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha àjà.+ 17 Ha mere ka alaeze Juda sie ike, kwadokwa Rehoboam nwa Solomọn ruo afọ atọ, n’ihi na ha sooro ụzọ Devid na Solomọn ruo afọ atọ.

18 Rehoboam lụrụ Mehalat nwa Jerimọt nwa Devid. Nne Mehalat bụ Abihel nwa Elayab nwa Jesi.+ 19 Mehalat mụụrụ ya ụmụ nwoke. Ha bụ Jiọsh, Shemaraya, na Zeham. 20 O mechakwara lụọ Meaka nwa nwa Absalọm.+ Ka oge na-aga, ọ mụụrụ ya Abaịja,+ Ataị, Zaịza, na Shelomit. 21 Rehoboam hụrụ Meaka nwa nwa Absalọm n’anya karịa ndị nwunye ya ndị ọzọ niile na ndị iko ya.+ Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị iri na asatọ, nweekwa ndị iko iri isii. Ha mụtakwaara ya ụmụ nwoke iri abụọ na asatọ na ụmụ nwaanyị iri isii. 22 Rehoboam mekwara Abaịja nwa Meaka onyeisi na onye ndú ụmụnne ya, n’ihi na o bu n’obi ime ya eze. 23 Ma, o ji akọ* kesasịa ụfọdụ n’ime ụmụ ya ndị nwoke ná mpaghara niile n’obodo niile a rụsiri ike na Juda na Benjamin,+ nyekwa ha nnukwu ihe oriri ma lụọrọ ha ọtụtụ ụmụ nwaanyị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya